Ihiala Eriela Ji Ọhụụ

Sep 15, 2021 - 20:43
Sep 15, 2021 - 20:44
 1
Ihiala Eriela Ji Ọhụụ

Izunna Okafor dere akụkọ a


Oke ọñụ̀ dara na nsonso a n'obodo Ihiala dị n'okpuru ọchịchị steeti Anambra, dịka ndị obodo ahụ merùbèrè mmemme iri ji ọhụụ ha nke ahọ 2021.

Mmemme Ịwa Ji ahụ e mere n'ama egwuregwu ụlọakwụkwọ 'Odoata Central School', ma bụrụkwa nke e jiri mmemme ịka ụka weere ọnọdụ n'ụlọụka 'Saint Martin of Tours Parish, Ihiala' wee malite.

Ya bụ óké mmemme dọtàrà ụmụafọ obodo ahụ nọgasị n'ebe dị icheiche, ndị ikwu na ibe, ndị nwadiala, ndị enyi, ndị agbatobi na ndị ọzọ na-echèré obodo ahụ ezi echichè.

Mmemme ahụ màlitezịkwàrà n'uju oge e jiri egwu ọdịnala we dubàta eze ọdịnala obodo ahụ na ndị Ichie ya, Ndị Ogbuehi na ndị òtù Oluoha na mmemme ahụ; emume wee kpòghara ọkụ.

N'okwu ya oge ọ na-agọ ọjị na mmemme ịwa ji ahụ, eze ọdịnala Ihiala, bụ Igwe Thomas Obidiegwu kelere Chineke maka ọrụ ọma ya n'isi ụmụafọ obodo ahụ, ọkachasị n'ihi ndụ, ngọzị, udo na ọganihu nke o jiri chọọ ha mma, ya na amara o nyere ha, ha wee kọọ ihe n'ubi ma dịkwa ndụ weta ihe ha kọnyèrè n'ubì.

O kelekwara aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ, maka ụzọ dị icheiche o sigoro nwògharịa ngalaba niile nke steeti ahụ, ọkachasị ngalaba ọrụ ugbo; etu o siri kwàlite ọnọdụ obibindụ ụmụafọ steeti ahụ, ma wetekwa ọnọdụ mmepe tọrọ atọ n'ime-ime obodo dị icheiche na steeti ahụ.

O kwezịrị nkwà na Ndị Ihiala ga-aga n'ihu ịkwadò ọchịchị nọ ugbua na steeti ahụ, ọbụladị dịka ọ kpọkukwàrà ụmụafọ obodo ahụ ka ha sonyesie ike na nnwògharị ahụ na-aga n'ihu ugbua na ngalaba ọrụ ugbo n'ime steeti ahụ, ọkachasị dịka o siri metụta Ugbo Azụ Ụnọ, n'ihi na úrù dị icheiche dị n'ọrụ ugbo.

N'okwu nke ya, otu onye n'ime ndị bịara mmemme ahụ, ma bụrụkwa Kọmishọna na-ahụ maka mgbasaozi na ịkụziri ọhaneze ihe ha kwesiri ịma, bụ Maazị C-Don Adinuba kọwara mmemme iri ji ọhụụ dịka oge e ji enye Chineke ekele maka owuwe ihe ubì, ya na oge e ji akwanyere ji ùgwù dịka eze ihe a kọrọ n'ubì, ma kpakwa maka ọdịmma obodo. 

O nyere ndị obodo ahụ ndụmọdụ ka ha gaa n'ihu inye ọchịchị Gọvanọ Obianọ nkwàdo ka o wee rụzuo ọrụ ọma ahụ ọ malitegoro na steeti ahụ n'ozuzuokè; ọbụnadị dịka ọ kpere ka Chineke were aka ya họpụta onye ga-anọchi anya Gọvanọ Obianọ site na nhọpụta ọkwa gọvanọ a ga-eme n'abalị isii nke ọnwa Nọvemba ahọ a.

Na ntụnye nke ya, onyeisioche òtù ọrụ pụrụ iche haziri mmemme ahụ, bụ Maazị Ody Chukwube kèlèrè eze ọdịnala obodo ahụ, bụ Igwe Obidịegwu maka ọmarịcha ọchịchị ya n'obodo ahụ, rụtụsịa aka n'ụfọdụ ụzọ dị icheiche ọchịchị ya sigoro kwàlite mmepe obodo ahụ, ma kpọkuo ya ka o jisie ike n'ọrụ; ọbụladị dịka o kpere ka Chineke gaa n'ihu inye ya amamihe na ogologo ndụ.

Ọtụtụ ndị ọzọ so n'isi ọchịchị steeti Anambra, ndị selitere isi n'ọrụ gọọmenti, ndị na-egwu okwe ndọrọndọrọ ọchịchị, na ọtụtụ ndị ọzọ e ji okwu ha agba ìzù na ngalaba dị icheiche sonyèrè na mmemme ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484