Ọba Akwụkwọ Anambra Emeela Emume Asụsụ Igbo Gà-adịgide Nke 2021

Nov 24, 2021 - 21:03
 0
Ọba Akwụkwọ Anambra Emeela Emume Asụsụ Igbo Gà-adịgide Nke 2021

Izunna Okafor dere akụkọ a

Mmemme Asụsụ Igbo Gà-adịgide nke ahọ 2021 abịala na njedobe n'Awka, bụ isi obodo steeti Anambra, dịka ndị ọnụ na-eru n'okwu kpọkùrù Ndị Igbo ka ha na-akwàdo ma na-akwalite asụsụ na omenala Igbo.

Mmemme omenahọ ahụ, nke ọ bụ Ọba Akwụkwọ Anambra na-achịkọba, dọtàrà imirikiti ndị ihe gbasaara asụsụ na omenala Igbo na-amasị, ndị nkụzi, ndị nọ na ngalaba mmụta, ndị ọrụ gọọmenti, ndị e ji okwu ha agba izu 'n ala Igbo, tinyere ụmụakwụkwọ sitere mpaghara ebe dị icheiche na steeti Anambra.

Na nkụzi o nyere na mmemme ahụ, Ọkammụta Nkechinyere Nwokoye nke mahadum Nnamdị Azikiwe dị n'Ọka (Awka) kpọpụtasịrị ihe dị icheiche o mepụtàgòrò, ogoogo o rugoro na ebe dị icheiche o jegoro n'ihi asụsụ Igbo, ma kpọkuo ndị na-echè na o nweghị uru asụsụ Igbo bara maọbụ ebe e ji ya eje, ka ha kwụsị ichè n'ụdị echiche dị etu ahụ, n'ihi na uru dị n'asụsụ Igbo bụ 'agụkata agba awaa'.

Ka ọ na-akatọ amụmá ahụ ndị òtù mba ụwa UNESCO buru sị na asụsụ Igbo ga-anwụ maọbụ fuo n'oge adịghị anya, Ọkammụta Nwokoye kwupụtara ezi olileanya na nkwenyesiike o nwere na asụsụ Igbo agaghị anwụ. Ọ dụrụ ndị Igbo ọdụ ka onye ọbụla tinye aka n'ọrụ ma tụnye ụtụ nke ya iji chekwaba ma kwàlite asụsụ ahụ

Na mbụ n'okwu mmalite ya, onyeisioche na mmemme ahụ ma bụrụkwa osote onyeisi Ohaneze Ndị Igbo, bụ Ichie Damian Okeke-Ogene kèlèrè ndị chịkọbàrà mmemme ahụ, kọwaa ụdị mmemme dị etu dịka ihe dị oke mkpà ugbua asụsụ Igbo kpọdoro isi n'ala; ọbụladị dịka ọ kpọkuru Ndị Igbo ka ha jigidesie asụsụ ha ike. Ọ katọrọ etu ndị mmadụ sizị añụ ọgwụike aghara aghara ugbua, ọkachasị Mkpụrụmmiri, ma dọọ ndị nne na nna aka na ntị ka ha na-elekọta ma na-eleru ụmụ ha anya oge niile ma bidokwa n'oge kụzibere ha asụsụ Igbo, omenala Igbo na ezi omume ndị ọzọ ha kwesiri ịmụtà.

Na ntụnye nke ya, Kọmishọna na-ahụ maka Mgbasaozi na steeti Anambra, bụ Maazị C-Don Adịnụba, nke ọ bụ Maazị Tony Nwaeke nọchiri anya ya, kpọpụtasịrị ihe dị icheiche ọchịchị nọ ụgbua na steeti ahụ mepụtàgòrò iji kwalite asụsụ na omenala Igbo, nke gụnyere ime ka ụbọchị Wenezdee ọbụla bụrụ ụbọchị a ga na-asụ naanị asụsụ Igbo ma na-ejikwa naanị ejiji ndị Igbo n'ụlọakwụkwọ na n'ụlọọrụ dị icheiche dị na steeti Anambra, tinyere ọtụtụ ụzọ ndị ọzọ o sigoro gbaa mbọ. Kaosiladị, ọ kpọkùkwazịrị ndị ọ dị n'aka ka mee ka akwụkwọ mmụta dị icheiche e ji akụzi ihe n'ala Igbo bụrụ nke e jiri asụsụ Igbo, dịka ọ dị na mba China nà mba ndị ọzọ, bụ ebe ọ bụ asụsụ obodo ha ka e jiri dee akwụkwọ dị icheiche e ji akụziri ha ihe, karịa ịbụ asụsụ mba ọzọ.

Na mbụ n'okwu nke ya, onye nna nke ụbọchị ahụ, bụ Ichie M.C. Ngene, Ezeike Nibo nyere ụmụakwụkwọ, ndị nkụzi na ndị nne na nna sonyere na mmemme ahụ ndụmọdụ ka ha tinye ihe niile ha mụtara na mmemme ahụ n'ọrụ, ọbụladị dịka ọ katọrọ inye nwata ọbụla bụ onye Igbo ntaramahụhụ maka na ọ sụrụ asụsụ Igbo, maọbụ n'ụlọakwụkwọ maọbụ n'ụlọ.

N'akụkụ nke ya otu onye ihe gbasaara ịkwalite omenala Igbo na-amasị, bụ Ụkọchukwu Oseburuụwa Dkt. Fidelis Onwudufor kọwara ụfọdụ ụzọ dị icheiche e si eji mmegharịahụ were ezipụta ihe n'ala Igbo, ma kọwakwa na ịgwakọrịta asụsụ Igbo na asụsụ bekee maọbụ asụsụ ọzọ so n'otu ihe kacha egbu asụsụ Igbo. Ọ gwara ndị Igbo ka ha mụtakwa asụsụ mbọ ọzọ dị icheiche mana ha tinye uchu na mmasị ha karịa n'asụsụ Igbo dịka nke kacha mkpà. Ọ gwakwara ha ka ha mụọ ka e si asụ, ede, aghọta, agụ na eme Igbo.

N'okwu ha dị n'ótù n'ótù, Maazị John Ifejika kèlèrè ndị chịkọbara mmemme ahụ ma rịọ ka a gbatịwanyekwuo ọnụọgụgụ ndị na-esonye na mmemme ahụ n'ọdịnihu; ebe nnukwu onye enyemaka pụrụ iche nye Gọvanọ Obianọ n'ihe gbasaara agụmakwụkwọ n'ogoogo sekọndịrị, bụ Dọkịta Paul Ifeanyị rịọrọ ka a rụchapụ ògìgè Ọgbalụ (Ọgbalụ Centre) bụ nke a gbahàpụrụ kemgbe, ma tinyesikwa ihe kwesiri ekwesi na ya. Ọ rịọkwara ka a na-enwe ihe ndepụta banyere nkwekọrịta na ihe ndị ọzọ e metere na mmemme ahụ kwà ahọ ọbụla, ma na-emekwa ya eme, iji nwee ike ịmịta mkpụrụ a tụrụ anya ngwangwa.

N'okwu ọ gwara ndị ntaakụkọ, nnukwu onye enyemaka pụrụ iche nye Gọvanọ Obianọ na Malụ Mebe (SSA on Social Reorientation), Oriakụ Mitchell Onugbulu kelere ọchịchị steeti Anambra maka mbọ pụtara ìhè ọ gbagoro n'ịkwàlite asụsụ na omenala Igbo, ma kpọkuo ndị Igbo ka ha nyere gọọmenti aka n'ọrụ ahụ site n'isonye na ya bụ oziọma nkwalite asụsụ na omenala Igbo.

N'oziekele ya, onyeisi ọba akwụkwọ steeti Anambra, bụ Dọkịta Nkechi Udeze kọwara na ịkwalite asụsụ na omenala Igbo so n'ọrụ dịịrị ha dịka ọba akwụkwọ ọhaneze, ma kọwaa na ebumnobi mmemme ahụ bụ iji mee ka ndị mmadụ mụta ka e si asụ, asụpe, ede, ma na-agụkwa asụsụ Igbo, ọkachasị ụmụ na-eto eto. O kelekwazịrị ndị dị icheiche sonyere na mmemme ahụ, ma dụọ ha ọdụ ka ha tinye ihe niile ha mụtàrà n'ebe ahụ n'ọrụ.

A nọrọ na mmemme ahụ nye nkụzi, mee ihe ngosi dị icheiche, gbaa egwu ọdịnala, nwee asọmpi edemede na nsụpe, bụ nke e megbàdòrò n'asụsụ Igbo, ebe ụlọakwụkwọ na ụmụakwụkwọ sonyere na ya jikwazịrị ọñụ na ihe nrita dị icheiche wee laa.

Dọkịta Nkọlị Nnyịgide, Dọkịta Dike Ndụlue na Oriakụ Irene Ifejika sonyekwàrà na ya bụ oke mmemme.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484