N'Anambra, Ndị Uweojii Ejidela Nwa Afọ Iri Na Isii Buru Egbe Ga Akwụkwọ

Sep 24, 2020 - 22:03
Jan 24, 2021 - 22:04
 0
N'Anambra, Ndị Uweojii Ejidela Nwa Afọ Iri Na Isii Buru Egbe Ga Akwụkwọ

Jide Mmadụ 80 Maka Òtu Nzuzo
Si n'aka Izunna Okafor

Ndị uweojii steeti Anambra nọrọ na nsonso a wee nwetakwa nturuugo ọzọ, dịka ha jidèrè mmadụ ruru iri asatọ n'ọnụọgụgụ maka otu nzuzo na arụrụala ndị ọzọ dị iche iche na steeti ahụ.

Onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti Anambra, bụ SP Haruna Mohammed mere ka ụwa mara nke a site n'ozi ọ kụpụụrụ ndị nta akụkọ ụbọchị Mọnde.

Ọ sị na ótù onye n'ime ndị ahụ e jidere bụ otu nwata nwoke gbara ahọ iri na isi, bụ Echezona Metu, ma bụrụkwa onye e jidèrè maka iji egbe ọnụ abụọ (bụ double-barrel) wee gaa akwụkwọ n'ụlọakwụkwọ ya dị n'Igboukwu, n'okpuru ọchịchị Agụata.

Ya bụ nwata nwoke ka e kwuru na ọ nọ n'ógó SS1 nke sekọndịrị ya, ma bụrụkwa onye a nwụchiri n'ogigè ụlọakwụkwọ ya ebe o bu egbe ahụ.

Oge a gbara nwata nwoke ahụ ajụjụ ọnụ, ọ sị na ọ bụ nna ya (kagoro nka) nwe egbe ahụ, ma bụrụkwa nke o jiri wee lụọ agha n'oge gara dịka onye òtù agha Biafra. Ọ sị na ya bùrù egbe ahụ wee bịa akwụkwọ ka o wee gosi ụmụakwụkwọ ibe ya n'ezi na nna ya nwèrè égbè ma bụrụkwa onye agha Biafra soro wee lụọ agha n'oge mbụ, n'ihi na o tèéla o siri gwaba ha bụ ụmụakwụkwọ ibe ya, mana ha ekweteghị; o wee sịzie ka o buru egbè nna ya bịa akwụkwọ bịa gosi ha, ka ha wee kwụsị ịgba ịtà.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ SP Mohammed gara n'ihu mee ka a mara na ngalaba ọrụ uweojii pụrụ ichè na-ébú agha megide otu nzuzo, bụ 'Special Anti-Cult Unit(SPACS)' nọrọ n'abalị mbụ nke ọnwa septemba a wee jide mmadụ iri na isii a na-enyo ènyò na ha bụ ndị otu nzuzo na mpaghara Ogidi/Nkpor.

N'otu aka ahụ, ọ sịkwa na e jidere mmadụ isii na mpaghara ụzọ Amansea n'abalị abụọ nke ọnwa a; jide mmadụ ise na mpaghara ụzọ Onitsha/Nkpor n'abalị atọ nke ọnwa a; jide mmadụ asaa na mpaghara ụzọ Oba/Nnewi n'abalị anọ nke ọnwa a; jide mmadụ isii na mpaghara ụzọ Nsugbe/Nkwelle-Ezunaka n'abalị ise nke ọnwa a; ma jide mmadụ asatọ na mpaghara ụzọ Ogbunike/Abagana, n'abalị isii.

Ọ gara n'ihu kwuo na ha jidekwara mmadụ anọ na Nawfịa n'abalị asaa nke ọnwa a; jide mmadụ anọ na mpaghara ụzọ Nimo/Abagana n'abalị asatọ; jide mmadụ iri na abụọ na mpaghara ụzọ Ifitedunu/Awkuzu n'abalị iteghete nke ọnwa a; jide mmadụ anọ n'Amikwo n'abalị iri nke ọnwa a; jide mmadụ ise n'abalị iri na anọ nke ọnwa a na mpaghara ụzọ Nsugbe/3-3; ma jidezie mmadụ anọ n'abalị iri na ise nke ọnwa a na mpaghara ụzọ Ebenebe /Ugbenu.

Ọ kọwara na ihe e nwekọtasịrị n'aka ndị ahụ gụnyèrè égbè dị ise n'ọnụọgụgụ, mmà iri, dágà abụọ, anyike ise, òkpu atọ, tinyere mgbọ égbè na ụfọdụ ihe ndị ọzọ ha ji 'arụ ọrụ' ala adịghị mma ha. Ọ sịkwa na a ka na-eme nnyòcya banyere ndị ahụ na arụrụala ha, ma sịkwa na a ga-akpụpụ ha ụlọikpe ma ọ bụrụ na e mechaa ya bụ nnyocha.

N'okwu nke ya, onyeisi ndị uweojii na steeti ahụ, bụ CP John Abang kèlèrè Ndị Anambra maka ezi agbambọ, njikọaka na enyemaka ha na-enyere ndị uweojii n'ọrụ ibuso ohi, mpụ na arụrụala agha na steeti ahụ, ọkachasị site n'inye ha ozi na-enyere ha aka ịnwụchi ndị omekéòmè. 

Ọ dụrụ ha ọdụ ka ha jisie ike n'ime nke ahụ, ọbụladị dịka ọ kpọkùrù ha ka onye ọbụla hie asaa naabọ n'anya banyere etu o si eme ihe, ọkachasị ugbua a batagoro n'ime ọnwa mba, bụ mgbe mpụ na arụrụala ji abawanyekarị ụba.

O kwuru na ụlọọrụ uweojii steeti ahụ agaghị ada mbà maọbụ zùo ike n'agha ahụ ọ na-ebu megide mpụ na arụrụala. Ọ gwakwara onye ọbụla hụtara ọnọdụ dị añaa na gburugburu ya ka ọ kpọọ akara ekwentị 07039194332 maka ịgbatara ya ọsọ enyemaka.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.