Na Taraba, E Jidela Ndị Ntọ̀ 11 Na-Ewu Èwù

Dec 26, 2021 - 15:18
 0
Na Taraba, E Jidela Ndị Ntọ̀ 11 Na-Ewu Èwù

.

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ndị uweojii na steeti Taraba anwụchiela mmadụ iri na otu, bụ ndị ntọ ahụ tọọrọ ndị ji ego achụ ego, ndị ọrụ gọọmentị, ndị nwere ụdị ụgbọala dị icheiche galara nnukwu ọnụ na nsonso a n'ime steeti ahụ.

Ndị na-arụ ọrụ na ngalaba 'Intelligence Response Team (IRT) bụ ndị wakpòrò ndị omekome ahụ a mà ama na-eyikwa ndị mmadụ égwù na steeti Taraba, ma nwụchie mmadụ iri na otu ndị otu ahụ.

Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'ala Nigeria, bụ CP Frank Mba, bụ onye kwupụtara nke a n'ozi ọ kụpụụrụ ndị nta akụkọ na nsonso a, ma bụrụkwa nke o sitere na ya kwuo na enwetara egbe AK-47 asaa, mgbọ egbe agbabèghị agba ruru otu narị na iri abụọ na otu (121) n'ọnụọgụgụ, tinyere ngwa ọgụ ndị ọzọ n'aka ndị ahụ a na-enyo enyo.

CP Mba kwuru na e jidere ndị a maka aka àlà ha na-akpa na steeti ahụ na nsonye ha na-esonye n'ibute ala adịghị mma n'ime steeti ahụ na gburugburu ya, tinyere isonye n'ịtọrọ ọtụtụ mmadụ a tọọrọ na nsonso a na steeti ahụ, nke gụnyere ịtọrọ ndị ọrụ kọstọm Naịjirịa, ịtọrọ nwanne onye Emir nke Jalingo, nakwà ogbugbu e gburu otu onye uweojii na Jalingo, bụ isi obodo steeti ahụ.

Ọ gakwara n'ihu kwuo na o teela ndị uweojii jiri chọgharịba ndị ahụ maka na aha ha dị n'akwụkwọ ndị na-ebute ala adịghị mma, nke mezịrị e ji achọgharị ha kemgbe maka arụrụala dị icheiche ha rụgoro na ihe ọjọọ ha tinyegoro aka na ya, wee ruo n'ikpeazụ nkịtà kpùdòrò onye aghụghọ. Ọ gbakwụnyere na ndị a na-enyo enyo bụkwa ndị na-achụpụ ndị mmadụ n'ụlọ ha, nke gụnyere ndị na-azụ ahịa, ndị ọrụ gọọmentị, ndị ọkwọ ụgbọala nwere ụgbọala na-egbuke egbuke na ndị na-eriputa ego n'ahụ.

Ọ sị “Ndị ngalaba 'Nigeria Intelligence Response Team' nke uweojii ala Nigeria na na-arụkọ ọrụ ọnụ, ha na ndị uweojii steeti Taraba; wee jide mkpokọta ọnụọgụgụ mmadụ ruru iri na otu (11) ndị a na-enyo enyo na ha na-akwàdo ma na-etinye aka n'ụdị mpụ na arụrụala dị icheiche na steeti ahụ, ọkachasị ịtọrọ mmadụ."

Ọ kpọpụtasịrị ụfọdụ ebe dị icheiche ndị ahụ tọgòrò mmadụ ma rụkwa ọrụ ọjọọ ndị ọzọ dị icheiche, dịka ha siri sàá asịsà site n'ajụjụọnụ a gbara ha. Ọ kọwakwara na nnwụchi ahụ a nwụchiri ndị ahụ bụ n'ịgbaso ntụziaka onyeisi uweojii n'ala Nigeria, bụ IGP Usman Alkali Baba, psc (+), NPM, fdc oge e nwetakarịara mkpesa banyere arụrụala dị icheiche ha na-abàgide na ya, ya na etu ha si eyi ọtụtụ ndị mmadụ egwù.

Ọ kpọpụtasịrị aha ndị ahụ dịka Luka Adam, Shuaibu Nuhu, Moses Amos, Peters Mashi, Ahmadu Mallam, Adamu Mohammed, Dahiru Mallam Dalha, Gambo Isah, Sanusi Ahmadu, Mallam Mohammed Mauludu, Ibrahim Idi, kwuo na ha niile bụcha ụmụafọ steeti Taraba, ma bụrụkwa ndị a nwụchiri oge ndị uweojii wakpòrò ebe nzuzo ha.

Nnyocha e mere gosikwara ka mmadụ abụọ (2) n'ime ndị ahụ a  na-enyo enyo, nke gụnyere Gambo Isah na Sanusi Ahmadu siri kpara ogbugbu ahụ e gburu Sajentị ndị uweojii ma jiri égbè gbarụsịa ma merụsịa onye uweojii nke ọzọ bụ Inspektọ ahụ na nsonso a tupu hapụ ya, ka e wee ghara ịnwụchikọ ha oge ha gachara tọrọ ụfọdụ ndị mmadụ na nsonso a.

O mekwazịrị ka a mara na a ka ga-akpụpụ ndị ahụ ụlọikpe ngwangwa e mechara nnyocha banyere arụrụala ha.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484