Gọọmentị Anambra Ejirila N288.5m Kwàdo Ụlọọgwụ Ndị Ụka

Apr 15, 2021 - 16:09
 0
Gọọmentị Anambra Ejirila N288.5m Kwàdo Ụlọọgwụ Ndị Ụka

Izunna Okafor dere akụkọ a

N'ịga n'ihu n'ọrụ iwulite ngalaba ahụike steeti Anambra, ọchịchị steeti ahụ enyela ụlọọgwụ ndị ụka dịgasị na steeti ahụ mgbàkọta ego ruru nde narị naịra abụọ na iri asatọ na asatọ na ọkara (N288.5m) iji kwàdo ma sị ha jisie ike n'ọrụ ịkwalite ọnọdụ ahụike na steeti ahụ.

Mmemme inyefè ego a bụ nke weere ọnọdụ n'ogige "Dora Akunyili Women Development Centre' dị n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra, ma bụrụ nke dọtara ma ndịisi ụka, ndị ọrụ gọọmenti, ndị ndu obodo, ndị ọrụ ahụike, tinyere ndị ọzọ e ji okwu ha agba ìzù na ngalaba dị iche iche.

Dịka o siri metụta nkesà ego ahụ, ụka Katọliiki nwèrè ụlọọgwụ dị iri abụọ na anọ n'ọnụọgụgụ n'ime steeti ahụ, ma nweta akwụkwọ ndọrọ ego dị otu narị nde naịra na iri iteghete na asaa, na ụma narị puku naịra asaa na iri ise. 

N'aka nke ọzọ, ụka Angịlịkan nwèrè ụlọọgwụ iri abụọ na isii, ma nwete akwụkwọ ndọrọ ego dị nde naịra iri isii na otu na puku naịra ise; ebe ndị ụka ọgbara ọhụrụ (a maara dịka pentikostaal) nwere otu ụlọọgwụ, ma nwete akwụkwọ ndọrọ ego ruru nde naịra iri atọ.

N'okwu ya oge ọ na-enye ha akwụkwọ ndọrọ ego ahụ, Gọvanọ Willie Obianọ mere ka a mara na ọchịchị ya nwere ezi mmasị n'ịkwàlitè ezi ọnọdụ ahụike na steeti ahụ, nke mezịrị o ji etinye ọkpụrụkpụ ego ma na-enyekwa nkwàdo na mgbe na mgbe nyegara ụlọ ahụike dị iche iche na steeti ahụ, ma ndị abụghị nke gọọmentị.

Ọ gara n'ihu kwupụta na kemgbe o siri bata n'ọkwa, na ọchịchị ya na-enye ụlọọgwụ ndị ụka nkwàdo dị ukwu, nke na o tinyela ego karịrị ijeri naịra abụọ na ngalaba ụlọ ahụike ndị ụka dịgasị n'ime steeti ahụ. O kwezịrị nkwà na gọọmentị ya agaghị ala azụ n'ịkwàdò ha na ụlọọgwụ ndị ọzọ dị na steeti ahụ, ya na ịkwalitekwu ogoogo ọnọdụ mmepe na ngalaba niile nke steeti ahụ.

Dịka ọ na-enye ndị ụka ndụmọdụ ka ha gaa n'ihu iji ego ahụ mepụta ihe dị ukwu n'ụlọọgwụ ha dị iche iche, Gọvanọ Obianọ kpọpụtasịrị ụfọdụ ihe ndị ọchịchị ya mepụtagoro na ngalaba ahụike steeti ahụ kemgbe ọ batara n'ọkwa ọchịchị n'ahọ 2014, ma kpọkuzie Ndị Anambra ka ha gaa n'ihu inye ọchịchị ya nkwàdo, iji gaa n'ihu n'ọrụ ọma ahụ o ji n'aka na steeti ahụ.

Na mbụ n'okwu ya, Kọmishọna na-ahụ maka ahụike na steeti Anambra, bụ Dọkịta Vincent Okpala gbàrà akaebe na Gọvanọ Obianọ emepụtela ọtụtụ ihe dara ụda na ngalaba ahụike steeti ahụ, ọkachasị site n'atụmatụ ahụike 'Anambra State Health Insurance Scheme(ASHIA)', bụ nke megoro ka inweta ọgwụgwọ dịrị ụmụ mmadụ mfe ma dịka ọnụ ala nle ukwuu na steeti ahụ.

O mere ka a mara na ASHIA sò n'otu n'ime atụmatụ ahụike atọ kacha arụ ọrụ na steeti ahụ, ma kwuo na n'okpuru atụmatụ ahụike ASHIA ahụ, na mmadụ pụrụ iji naanị puku naịra iri na abụọ wee nara ọgwụgwọ n'efu ruo otu ahọ zuru ezu n'ụlọọgwụ ọ chọrọ.

Na ntụnye nke ya, onyeisi ụlọọrụ ''Anambra State Health Insurance Scheme(ASHIA)', bụ Dọkịta Simeon Onyemaechi kèlèrè Gọvanọ Obianọ maka ọrụ ọma ọ rụgoro na ngalaba ahụike steeti ahụ, ma kpọkuo Ndị Anambra ka ha debànye aha ma sonye n'atụmatụ ahụike ASHIA iji rite ọtụtụ uru dị iche iche dị na nke ahụ.

N'ozi ekele ha n'otu n'otu, ụfọdụ ndịisi ụka sonyere na mmemme ahụ, nke gụnyere Fada Vincent Okala Abanogu, nke ụlọọgwụ "Immaculate Heart Multi Specialty Hospital, Aguleri" kèlere Gọvanọ Obianọ na ọchịchị steeti Anambra maka ezi nkwàdo ahụ, ma kwe nkwa ịga n'ihu na-akwado ọchịchị steeti ahụ nà ọmarịcha ebumnobi ya n'ebe ngalaba ahụike dị, site n'itinye ego ndị ahụ n'ọrụ na ịkwàlite arụmọrụ ahụike ha na steeti ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484