Ijummiri: Ọnụọgụgụ Ndị Nwụrụ Na China Agafeela Narị Atọ

Aug 6, 2021 - 21:59
 0
Ijummiri: Ọnụọgụgụ Ndị Nwụrụ Na China Agafeela Narị Atọ

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ka ọ gachaara ihe dịka izuụka olenaole ijummiri kpachara mkpamkpa dị égwù na mba China, ọnụọgụgụ ndị nwụrụ n'ihi ijummiri ahụ eruola mmadụ narị atọ na abụọ (302).

Ọ bụ onye Mayor nke mpaghara Zhengzhou, bụ Hou Hong kwupụtara nke a na nsonso a, bụkwa nke o sitere na ya wee mee ka a mara na mmadụ iri atọ na iteghete n'ime ndị ahụ bụ ndị a hụrụ ozu ha n'ime ụlọ dị n'okpuru ala ebe a na-adọba ụgbọala.

Ijummiri ahụ bụ nke gbara oge nnukwu mmiriozuzo zochara na mpaghara Henan etiti mba China, bụkwa nke metụtara mpaghara ebe dị iche iche, bibie ọtụtụ ụlọ na ngwongwo ndị mmadụ, bucharasịkwa ụgbọala na-agbara onwe ha n'ụzọ, ma takwa isi ọtụtụ ndị mmadụ.

Akụkọ kọrọ na ya bụ mmiriozuzo na ijummiri ọ gbara mètụtàrà mmadụ ruru nde iri na atọ ma bibìkwa ụlọ ruru puku iteghete n'ọnụọgụgụ, ebe ọtụtụ ndị mmadụ ka na-efukwa efu ruo taa.

Dịka ọnụọgụgụ e nwetere siri kọwaa, ọ bụ na Zhengzhou bụ isi obodo mpaghara Henan ka ndị mmadụ kachara wee nwụọ, bụ ebe ijummriri ahụ tochiri okporoụzọ ma buchakọrọ ọtụtụ ụgbọala na-agba n'ụzọ ebe ahụ nà ndị niile nọgasị n'ime ha. 

Mkpokọta ọnụọgụgụ ndị nwụrụ n'obodo ahụ ka e kwuru na ọ dị narị abụọ na iri iteghete na abụọ (292), ebe mmadụ ruru narị anọ na asaa ka na-efukwa efu n'obodo ahụ, n'ime mkpokọta ọnụọgụgụ mmadụ iri ise na-efu èfù na mpaghara Henan.

Nchọpụta e mere na-egosikwa na ijummiri ahụ mètụtàrà ọnọdụ akụnụba mpaghara ahụ, nke na a tụfuola ego ruru ijeri dọla iri na asatọ ($18 billion), ebe ya bụ ijummiri metụtakwazịrị ebe a kọrọ ọrụ ugbo ruru obosara ala hektas narị puku ise na iri asatọ (580,000 hectares).

Isi ọchịchị mba China mere ka a mara na o guzobela òtù ọrụ pụrụ ichè maka ime nnyocha banyere ijummiri ahụ na ihe dị iche iche so ya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484