Ndị FABDA Etòóla Obianọ Maka Ọrụ Ịkwàlite Mmepụta Azụ n'Anambra

Jun 4, 2021 - 13:12
 0
Ndị FABDA Etòóla Obianọ Maka Ọrụ Ịkwàlite Mmepụta Azụ n'Anambra

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ndị òtù na-ahụ maka azụ na anụ ndị ọzọ a na-azụ na mmiri, a maara dịka 'Fishery and Aquaculture Business Development Agency (FABDA), ngalaba steeti Anambra etoola aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Willie Obianọ, maka ọrụ ya ịkwàlite mmepụta azụ na steeti ahụ.

Ndịisi nlekọta òtù FABDA kwupụtara nke a oge ha gara njem nleta n'ebe ahụ Gọvanọ Obianọ na-arụ ogige ebe a na-azụpụta azụ na mpaghara ọgbọ nta nkwado sineetị atọ dị na steeti ahụ, iji mara etu ọnọdụ ọrụ siri gbata kwụrụ n'ebe ahụ.

N'okwu ọ gwara ndị ntaakụkọ oge ha bagidere na njem nleta ọrụ ahụ, otu onye n'ime ndị òtù nlekọta FADBA ahụ, ma bụrụkwa Kọmishọna na-ahụ maka njem okporoụzọ na steeti Anambra, bụ Maazị Afam Mbanefo, mèrè ka a mara na ogige mmepụta azụ ahụ ga-abụ nnọọ otu n'ime ọtụtụ nnukwu ihe dara ụda ọchịchị Gọvanọ Obianọ mepụtara ma ọ bụrụ na a rụchaa ha, ma bụrụkwa otu n'ime ihe a ga-eji na-echeta ọchịchị ya ma ọ rịtuchagodi n'ọkwa.

O kwuru na ọ bụ ọrụ dịịrị ha dịka ndị nlekọta òtù ahụ, ịhụ na a rụchapụrụ ọrụ ahụ n'oge kwesiri ekwesi, ma rụkwa ya n'ogoogo gọọmentị steeti ahụ kpebiri iji rụọ ya.

Na mbụ n'okwu ya, onyeisioche òtù nlekọta FADBA, bụ Ike Chioba kwupụtara obi añụrị ha banyere etu ọrụ si aga n'ebe ahụ, mee ka a mara na ebumnobi ha jiri bagide na njem nleta ahụ bụ iji hụ na a na-arụ ọrụ ahụ n'ogoogo gọọmentị steeti ahụ wepụtara. Ọ kọwara na n'ilekwasà anya n'etu ọrụ ahụ si aga, na olileanya dị na a ga-arụchapụ ya bụ ọrụ n'oge a tụrụ anya ma gbapekwa ya.

Na ntụnye nke ya, onyeisi òtù FABDA, bụ Maazị Emeka Iloghalu kpọpụtasịrị ọtụtụ úrù dị iche iche ogige ahụ ga-ewèta na steeti ahụ, ọkachasị dịka o siri metụta imepụta azụ na erimeri, ịkwàlite ọnọdụ mmepe akụnụba steeti ahụ, ikewàpụtara ụmụafọ steeti ahụ òhèrè ọrụ, ma mekwa ka Ndị Anambra mara nke ọma banyere etu e si emepụta azụ.

N'okwu nke ya oge ọ na-edugharị ndị òtù ahụ n'ihu ọrụ ya, onye ji ọrụ ngo ahụ na mpaghara ọgbọ nta nkwàdo 'Anambra Central' bụ Maazị Edmond Chukwuemeka, nke ụlọọrụ 'Editrust International Limited', kọwààrà ha ka ọnọdụ ọrụ siri gbata kwụrụ n'ebe ahụ, ma kwe nkwà na ọ ga-arụchapụ ya bụ ọrụ n'oge a kara aka.

Ebe a na-arụ ogige ahụ na mpaghara ọgbọ nta nkwàdo atọ dị na steeti ahụ bụ 'Agụleri' dị n'okpuru ọchịchị 'Anambra East' (maka mpaghara ọgbọ nta nkwàdo Anambra North); Adazi Nnukwu, dị n'okpuru ọchịchị 'Anaocha Council' (maka mpaghara ọgbọ nta nkwado Anambra Central); na Ọkịja dị n'okpuru ọchịchị Ihiala (maka mpaghara ọgbọ nta nkwàdo Anambra South).

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484