Oriakụ Obianọ Agwala Ndị Anambra Bi na Mba Ka Ha Bịa Tụọ Akwụkwọ

Oct 7, 2017 - 08:27
Jan 23, 2021 - 22:58
 0
Oriakụ Obianọ Agwala Ndị Anambra Bi na Mba Ka Ha Bịa Tụọ Akwụkwọ

Izunna Okafor, Awka, Nigeria

Nwunye aka na-achị steeti Anambra bụ Oriakụ Ebelechukwu Obianọ akpọkuola ndị Anambra bi na mba ofesi na ebe dị iche iche na mpụga steeti ahụ ka ha laghachite n'oge a ga-aga eme nhọpụta ọchịchị na steeti ahụ bụ abalị iri na asatọ nke ọnwa Nọvemba ahọ a, iji wee sonye na ya bụ ntụli aka.

Oriakụ Obianọ kpọrọ oku a n'ama egwuregwu ala anyị dị na Surulere nke steeti Legọọsị na mmemme ahọ a nke otu jikọtara ụmụ nwaanyị steeti Anambra chịkọbara banyere ịkwalite ṅọmụmụ ọrụ aka na ọnọdụ akụnụba.

Ka ọ na akpọpụtasị ihe dị iche iche ọchịchị gọvanọ Obianọ meputara, tinyere nke atụmatụ ya abụghị otu gọọmenti bụ ''Caring Family Enhancement Initiative'' (CAFE) meputagoro na steeti ahụ, o kwuputara mkpa ọ dị na ndị Anambra ahụ bigasị na mba dị iche iche batara ma sonye n'ịtụ akwụkwọ ahụ, iji gosipụta nkwado ha nye gọvanọ Obianọ.

Ọ kọwara mkpa ọ dị na ụmụ nwaanyị mụkwara ma nwee ọrụ dịgasị iche iche, bụ nke ga-enyere ha aka ịkwụrụ onwe ha na ịtụnye ụtụ nke ha n'ihe a na-emegasị na ezinaụlọ ha.

N'okwu nke ya, onye ndu ụmụnwaanyị nke otu pati APGA n'ala anyị bụ Oriakụ Ada Ọrjị-Nwanyanwụ, kwuru na ọchịchị Obianọ ewetela ezi nchekwa tọrọ atọ na steeti Anambra, ịkwụ ndị ọrụ ụgwọ ọnwa oge kwesiri ekwesi, mnwogha pụrụ iche na ngalaba ọrụ ugbo nke mezịrị ka steeti ahụ nwee ike ịdị na-ebupu ihe a kọtara n'ugbo na mba ofesi, ma kpọkuo ụmụ afọ Igbo ka ha makụọ otu pati APGA.

Na mbụ n'okwu ya, onyeisi otu ụmụ nwaanyị a bụ Dọkịnta Nkiru Ifekwem toro ya bụ nwunye aka na-achị steeti maka ịbịa mmemme ahụ, kọwaa gọvanọ Obianọ na nwunye ya dịka ndị ọnọdụ ụmụ mmadụ na-emetụ n'obi ma kwakazie ya nkwa na ụmụ nwaanyị kwụ ya n'azụ n'ịzọ ọkwa ya nke ugbo abụọ O dụrụ ndị nne ka ha bụrụ ihe nlere anya wee nye ụmụ ha, ọ kachasị ndị nwaanyị.

N'akụkụ nke ya, onye isi oche na onye nguzobe nke otu ahụ bụ Oriakụ Nkem Okolo kelere Oriakụ Obianọ maka nkwado ya nye ndị otu ahụ na ụmụ afọ steeti Anambra steeti ahụ, ma kpọkuokwa ụmụ nwaanyị ndị ọzọ ka ha ñomiri ya.

Abụ ịdị n'otu a bụkuuru Oriakụ Obianọ site n'ọnụ ụmụ nwaanyị ahụ so n'ihe pụtakarịchara ihe na mmemme ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.