Na Dayọsiisi Agụata, Bishọọpụ Ezeofor Agbapee Isi Ụlọọrụ Na Ụlọakụ Ọhụrụ

Apr 8, 2021 - 10:19
 0
Na Dayọsiisi Agụata, Bishọọpụ Ezeofor Agbapee Isi Ụlọọrụ Na Ụlọakụ Ọhụrụ

Izunna Okafor dere akụkọ a

Oke ọñụ dara na nsonso a na Dayọsiisi ụka Angịlịkan Agụata dị na steeti Anambra, dịka Bishọọpụ Samuel Ezeofor gbapere agadaga ọmarịcha isi ụlọọrụ dayọsiisi ahụ a rụrụ ọhụrụ, nakwa ụlọakụ dayọsiisi ahụ, a maara dịka 'Gosife Microfinance Bank'.

Mmemme ịgbape nnukwu ụlọ abụọ ahụ na iche ha n'ihu Chineke bụ nke e jiri ofufe nrò pụrụ iche wee malite, ma bụrkwa nke dọtara ọtụtụ ndị bishọọpụ dayọsiisi dị iche iche, ndịisi ụka, ndị ọrụ gọọmentị, ụmụafọ dayọsiisi Agụata, nakwa ọtụtụ ndị ọzọ siri ebe dị iche iche wee bịa.

N'okwu ya n'ebe ahụ, Bishọọpụ Ezeofor (onye e guzobere dịka Bishọọpụ Dayọsiisi ahụ n'ahọ 2018 oge 'Most Reverend' Christian Efobi nọbụ ebe ahụ lachara ezumike nka) mèrè ka a mara na ọ bụ ụlọ ezumeezu dị n'ụlọụka Katidraal nke St. John Ekwulọbịa ka ndị ọrụ dayọsiisi ahụ jibụ wee mere ebe ha ga-anọgodi wee na-arụ ọrụ, kemgbe ahọ 2005 e jiri kewàpụta ya bụ dayọsiisi, bụzị nke mere o jiri dị nnukwu mkpa ịrụ ya bụ usi ụlọọrụ.

O kwuru na isi ụlọọrụ ọhụrụ ahụ a rụrụ ugbua, (nke nwere ime ụlọọrụ iri atọ n'ime ya, nwee ụlọekpere, nwee ọba akwụkwọ, nwee ụlọ ezumeezu, ma nwekwa ebe a na-eti egwu na ebe e ji igwe kọmputa arụ ọrụ dị iche iche), emeela ka e nwekwuo ọtụtụ ụlọọrụ ọkpụtọrọkpụ maka ndị na-arụ ọrụ na dayọsiisi ahụ. 

O mekwazịrị ka a mara na ụlọakụ 'Gosife Microfinance Bank' ahụ a rụrụ ọhụrụ ga-enyekwa aka ịkwalitekwu ọnọdụ àkpà ego steeti ahụ, kewàpụta ohere ọrụ nye ọtụtụ mmadụ, nye aka kwàlite azụmahịa ndị mmadụ site na mgbazinyé ego, tinyere ọtụtụ úrù ndị ọzọ dị iche iche nke ahụ ga-eweta. O kpekwazịrị ka Chineke gọzie ma mee ka e were ihe ndị ahụ niile jeere ya ozi nke ọma n'ụzọ ọ ga-enye aha nsọ Ya otuto, kwàlite mgbasa oziọma Ya, ma wetakwara dayọsiisi ahụ mbulielu n'ọtụtụ ụzọ dị iche iche.

Na mbụ n'okwuchukwu ya n'ebe ahụ, Bishọọpụ ụka Angịlịkan na Dayọsiisi Amichi, bụ Rt. Rev'd. Ephraim Ikeakor dàbèèrè n'isiokwu nke na-elekwasị anya n'ọnwụ Ọkpara Chineke nwụrụ nakwa etu o siri gbaghara ndị kpọgburu Ya n'obe, wee gwa ụmụ mmadụ na Chineke chọrọ ezi nchegharị n'aka ha, bụ nke akpọmasị, aghụghọ, iwe, ọnụma, obi ọjọọ maọbụ ịbọ ọbọ adịghị na ya.

Ọ kpọkuwara ndị anabatabeghị Ọkpara Chineke ka ha mee nke ahụ ngwangwa n'ihi na ọgwụgwụ oge dị nso ugbua, tinyekwuoro na ọ dịịrị mmadụ ịnwụ naanị otu ugboro ọnwụ, nke mgbe ọ gachaara, ikpe eso ya ozigbo.

N'okwu nke ya, onye na-ahụ maka mgbasaozi na Dayọsiisi Agụata, bụ Maazị Abụchi Nwozor kọwara mgbakwụnye ahụ a gbakwụnyèrè ọba akwụkwụọ n'isi ụlọọrụ ọhụrụ ahụ dịka nke magburu onwe ya, n'ihi na nke ahụ ga-enye aka ịkwalite agụmakwụkwọ na mmụta na mpaghara ahụ n'ụzọ pụrụ iche.

Ndị sonyere na mmemme ahụ gụnyere Oriakụ Chinyere Ezeofor, bụ nwunye Bishọọpụ Ezeofor ma bụrụkwa onyeisi òtù ụmụnwaanyị na ụmụgbọghọ na dayọsiisi Agụata; Bishọọpụ Godwin Okpala nke Dayọsiisi Nnewi n'oge mbụ, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484