Obianọ Akpọkuola Ndị Ọrụ Nsọnyụ Ọkụ Ka Ha Dịwanye Uchu n'Ọrụ

Jan 27, 2021 - 21:39
 0
Obianọ Akpọkuola Ndị Ọrụ Nsọnyụ Ọkụ Ka Ha Dịwanye Uchu n'Ọrụ

Izunna Okafor


Aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ akpọkuola ụlọọrụ nsọnyụ ọkụ steeti ahụ ka ha jisie ike n'ọrụ ma welitekwuo aka n'usoro inye ọhaneze nkuzi ihe ha kwesiri ịma banyere igbòchi ọkụ ọgbụgba kpamkpam na steeti ahụ.

Gọvanọ Obianọ nyere ndụmọdụ a n'okwu ya na mmemme nchịkọta ọzụzụ na agụmakwụkwọ mmadụ otu narị na iri abụọ (120) e were n'ọrụ ọhụrụ n'ụlọọrụ nsọnyụ ọkụ steeti ahụ, ma bụrụkwa nke weere ọnọdụ n'ama egwuregwu Alex Ekwueme dị n'Ọka (Awka) bụ isi obodo steeti ahụ.

Gọvanọ Obianọ, nke onye nọchitere anya ya bụ osote ya bụ Dọkịta Nkem Okeke mere ka a mara na ọnụọgụgụ ọkụ ọgbụgba n'ime steeti ahụ dịzị ala ugbua karịa ka ọ dị na mbụ, ma kelee ndị ọrụ nsọnyụ ọkụ steeti ahụ maka nke ahụ, ọbụladị dịka o cheteere ha na ha ka nwekwara ọtụtụ ọrụ chere ha n'ihu, ọkachasị dịka o siri metụta ịkọwara ọhaneze ihe ha kwesiri ịma banyere ọkụ ọgbụgba, na ime ka ihe banyere ọkụ ọgbụgba bụrụ akụkọ mgbeochie n'ime steeti ahụ.

Ọ kpọpụtasịrị ihe dị iche iche ọchịchị ya megoro iji kwàdo ma kwalite arụmọrụ ụlọọrụ ahụ na ọdịmma ndị ọrụ nsọnyụ ọkụ, nke gụnyere itute ọtụtụ akụrụngwa na ụgbọala ha ji arụ ọrụ, na ịzụtakwa ọtụtụ ndị ọhụrụ, itute ọtụtụ ụlọọrụ nsọnyụ ọkụ na mpaghara ebe dị iche iche na steeti ahụ, inye ntụziaka ka e tinyekwuo ego n'ụgwọ ọnwa na ego mmachi akpa a na-akwụ ndị ọrụ nsọnyụ ọkụ steeti ahụ, na inye ntụziaka ka e wèé mmadụ 120 ọhụrụ n'ọrụ nsọnyụ ọkụ steeti ahụ, bụ ndị ahụ a na-eme mmemme ịchịkọta agụmakwụkwọ ha ụbọchị ahụ, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ ọchịchị ya megoro.

O mere ka a mara na ọ bụ ọrịa korona mere iwè n'ọrụ na inye ọzụzụ ahụ jiri gbuo ogè, ma kelee Chineke na ya bụ nkwà na ntụziaka abịala na mmezù.

O kwere nkwà na ọchịchị ya ga-aga n'ihu ịkwàdo ụlọọrụ nsọnyụ ọkụ steeti ahụ, n'ihi ezi mkpa ọ dị nà ezi ọrụ ya n'ichekwa ndụ na akụnụba ụmụafọ steeti ahụ, ọbụladị dịka ọ kpọkuru ndị ahụ e were n'ọrụ ọhụrụ ka ha were ezi ihe dị iche iche ha mụtara site ọzụzụ ahụ e nyere ha wee rụọ ọrụ ha nke ọma dịka ndị nsọnyụ ọkụ na steeti ahụ.

N'okwu nke ya, onyeisi ụlọọrụ nsọnyụ ọkụ steeti ahụ, bụ 'Air Vice Marshall' Ben Chiobi kèlèrè Gọvanọ Obianọ maka nkwàdo dị iche iche ọ na-enye ụlọọrụ ahụ; ma kelekwa ya maka etu o si akwàlite ọdịmma, ọnọdụ obibindụ na arụmọrụ ndị ọrụ nsọnyụ ọkụ steeti ahụ, bụ nke pụtara ihè n'ihe dị iche iche o megooro ha kemgbe ọ batara n'ọkwa ọchịchị.

O mere ka a mara na owuwe ahụ e wèrè ndị ọrụ nsọnyụ ọkụ ọhụrụ ahụ ga-enye aka n'ụzọ pụrụ ichè ime ka e nwee ọnụọgụgụ ndị ọrụ zuruokè na ngalaba ụlọọrụ nsọnyụ ọkụ dị iche iche na steeti ahụ, nye aka kwàlite atụmatụ ịkụziri ndị mmadụ ihe ha kwesiri ịma banyere ọkụ ọgbụgba, ma nyekwa aka kwalite arụmọrụ nke ụlọọrụ ahụ, dịka o siri metụta ịsọnyụ ọkụ na igbòchì ọkụ ọgbụgba na steeti ahụ.

N'akụkụ nke ya, onyeisi nsọnyụ ọkụ na steeti ahụ, bụ Injinia Martin Agbili mèrè ka a mara na ndị ahụ e were n'ọrụ ọhụrụ ga-aga n'ihu ịmụtàkwu ọtụtụ ihe dịka ha na-agawanye n'ihu n'ọrụ ahụ. Ọ dụrụ ha ọdụ ka ha were ọnụnụ ọkụ n'obi wee, ịdị ngwangwa, na ịdị uchu wee rụọ ọrụ ha, iji kwalite nchekwa ndụ na akụnụba ụmụafọ steeti ahụ. Ọ gwakwazịrị ha ka ha na-adị njikere oge niile, n'ihi na a pụrụ ịkpọtụrụ ha maka ọrụ nsọnyụọkụ oge ọbụla ya bụ ọdachi dapụtara.

N'okwu ọ gwara ndị nta akụkọ, Ọkaokwu ụlọ omeiwu steeti Anambra, bụ 'Rt. Hon.' Uchenna Okafor chètèèrè Ndị Anambra na ọkọchị ka dịkwà, ma chetakwara ha mkpà ọ dị na ha kere nkwụchà ma na-akpachapụ anya n'ihe bụla ha na-eme. Ọ dụrụ ha ọdụ ka ha nyere ndị ọrụ nchekwa aka n'ọrụ igbochi ọkụ ọgbụgba, site n'irube isi n'ozuzuoke nye ntụziaka niile ndị ọrụ nsọnyụ ọkụ na-enye na mgbe na mgbe site n'usoro nzikọrịta ozi dị iche iche, banyere igbochi ọkụ ọgbụgba.

Ndị dị iche iche sonyere na mmemme ahụ gụnyere onyeisi ọrụ oyibo na steeti ahụ, bụ Ọkaiwu Harry Uduh; Kọmishọna na-ahụ maka ahịa na azụmahị, bụ Maazị Uchenna Okafor; onyeisioche ọhụrụ Ọhaneze Ndị Igbo n'Anambra, bụ Maazị Emeka Udodeme; onyeisi ụlọ mgbasaozi 'Anambra Broadcasting Service', Maazị Uche Nworah, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ e ji okwu ha agba ìzù na ndị nnọchianya ụlọọrụ nchekwa dị iche iche na steeti ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.