Obianọ Agaala Njem Nleta n'Ogige Ụlọ Ezumeezu Mba Ụwa A Na-Arụ n'Anambra

Aug 7, 2021 - 21:16
 0
Obianọ Agaala Njem Nleta n'Ogige Ụlọ Ezumeezu Mba Ụwa A Na-Arụ n'Anambra

Izunna Okafor dere akụkọ a

Aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ ekwupụtala ma gosipụta obi ụtọ ya banyere etu ọrụ si aga n'ebe ahụ a na-arụ agadaga ụlọ ezumeezu mba ụwa na steeti ahụ, bụ nke dị na mpaghara Agụ Awka, n'isi obodo steeti Anambra.

Gọvanọ Obianọ kwupụtàrà nke a oge ya na ụfọdụ ndịisi ọchịchị gọọmenti steeti ahụ na ndị ọzọ ọnụ na-eru n'okwu gara njem nleta n'ebe ahụ a na-arụ ya bụ nnukwu ụlọ ezumeezu, bụkwa ebe ha nọrọ wee gagharịa n'ime gburugburu ogige ahụ, iji hụ ka ọnọdụ siri gbata kwụrụ n'ebe ahụ nà etu ya bụ ọrụ si aga.

Ya bụ Gọvanọ mere ka a mara na afọ juru ya banyere etu ọrụ si agawanye n'ihu n'ebe ahụ, ma kpọpụtasịkwa uru dị iche iche ya bụ ogige ga-ewebàta na steeti ahụ ma a rụchaa ya, nke gụnyere na ọ ga-enye aka ịkwàlite ọnọdụ mmepe na steeti ahụ, kewàpụtara ụmụafọ steeti ahụ ọtụtụ ohere ọrụ, tinyere ọtụtụ uru ndị ọzọ ọ ga-eweta.
 
Ọ kọwara na ya bụ ogige ga-eme ka Anambra soro n'ọnụọgụgụ steeti olenaole nwere ụdị ụlọ ezumeezu mba ụwa dị etu ahụ n'ala Nigeria, ma mekwa ka e nwee ike ịdị na-achịkọbazị ụdị nnukwu ọgbakọ mba ụwa dị iche iche n'ime steeti ahụ.

O kelekwazịrị ngalaba ụlọọrụ na-ahụ maka ewumewu ụlọ na steeti ahụ, ma kelekwazie ụlọọrụ ji ọrụ ngo ahụ maka ogoogo ha ji arụ ya bụ ọrụ na etu ha sikwa arụ ọrụ ebe ahụ ma n'ụbọchị ma na-abalị, iji wee hụ na a rụchàpụrụ ya bụ ọrụ n'oge a kara àkà.

Dịka ọrụ siri gbata kwụrụ n'ogige ahụ ugbua, a kụchaala ụlọ ahụ gbamgbam, tinyechaa akụrụngwa eskaletọ (escalator) na akụrụngwa 'lift' na ya, ma na-etinyekwazị silin (ceiling) nà igwè e ji ekwu okwu na ya ugbua.

Gọvanọ Obianọ nyekwara onye ji ọrụ ngo ahụ ndụmọdụ ka o tinyekwuo ọtụtụ ndị ọrụ n'ọrụ n'ebe ahụ, iji nye aka n'ịrụchàpụ ya n'oge.

N'okwu nke ya banyere ụlọ ezumeezu ahụ, Komishọna na-ahụ maka ewumewu ụlọ na steeti ahụ, bụ Maazị Michael Okonkwo nyèrè nkọwa banyere ụlọ ahụ nà etu ọrụ siri gbata kwụrụ n'ebe ahụ, ma mee ka a mara na ya bụ ọrụ na-abịazị n'isi njedobe ugbua.

O mere ka a mara na ya bụ ogige ga na-abatanwu, opekata mpe, mmadụ puku iri n'otu oge, nwee ebe a na-atụ ndụ mmadụ, nwee ebe a na-emesàpụ ahụ, ụlọ akụ, ebe a na-ere ihe, nà ebe a na-eme ụfọdụ ihe ndị ọzọ dị iche iche, ma n'ime ụlọ ezumeezu ahụ, ma na mpụta ya, bụ nke ga na-eme ka ebe ahụ na-agawanye n'ihu oge niile.

Dịka ọ na-akọwa na ụlọ ezumeezu ahụ ga-enyekwa aka n'ịkwàlite ọnọdụ mmepe n'ụzọ dị iche iche ma mpaghara ahụ, na n'ịkwàlite ọnụego na-abata na steeti ahụ; Kọmishọna Okonkwọ mere ka a mara na Gọvanọ Obianọ nyere mgbe a ga-arụcha ọrụ ahụ, ma kwuo na ha na-agbasi mbọ ike ịrụchapụ ya tupu oge ahụ.

Kọmishọna Okonkwọ kpọpụtasịkwara uru ndị ọzọ dị iche iche ogige ahụ ga-ewètara steeti ahụ na ụmụafọ ya, kọwaa ihe ndị ọzọ dị mkpa banyere ogoogo e ji arụ ya bụ ụlọ, ma kwupụtazie olileanya o nwere na ha ga-arụchapụ ya bụ ọrụ tupuu oge a kara aka eruo.

Gọvanọ Obianọ nọkwàrà n'otu ụbọchị ahụ wee gaa njem nleta n'ebe ahụ a na-arụ ogige ama egwuregwu n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ a maara dịka 'Awka City Stadium', iji marakwa ka ọrụ si aga n'ebe nke ahụ, ma bụrụkwazie ebe onyeisioche 'Anambra State Sports Development Commission', bụ Maazị Tony Oli nọrọ wee nabata ma dugharịa ya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484