Barack Obama ekwuputego usoro ohuru a ga-esi na-enwe egbe n'Amerika
![Barack Obama ekwuputego usoro ohuru a ga-esi na-enwe egbe n'Amerika](/uploads/joom-images/obama3.jpg)
Onye isi ala mba Amerịka, Barack Obama, ekwuputego usoro ọhụru a ga-esi na-ahụ maka ibu egbe na mba ahụ. O teela aka ụfọdụ ndị mba ahụ na-akpọ oku ka gọọmenti ha mee ihe gbasa usoro inwe na ibu egbe.
Mana ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị Rịpọblikan na-adụ azụ mgbe ọ bụna e welitere okwu a. Nke a bụ maka na ha achọghị imegide ndị otu a kpọrọ NRA, ndị na-adị enye otu Rịpọblikan ezigbote ego mgbe ọ bụna a na-azụ okwe ndọrọndọrọ ọchịchị.
N’atụmatụ usoro ọchịchị ahụ Obama gụpụtara taa, ọ chọrọ ka ndị Amerịka mee ihe ndị a na-esote:
- Ka iwu mee ka a na-enyocha ndị mmadụ ọfụma tupu e reshi ha egbe.
- Ka iwu mee ka ndị mmadụ ghara ina-enwezi ụdị egbe ndị ahụ a rụrụ maka ịlụ agha.
- Ka iwu Amerịka mee ka ndị mmadụ ghara ina-enwezi egbe nwere ike ịgbakarị mkpụrụ mgbọ 10 tupu a sụgharịa ya.
- Ka iwu mee ka a na-ata ndị mmadụ afụfụ ma ọ bụrụ n’aka kpata onye na-atụ mgbere ahịa egbe n’uzo na-ezighị ezi.
Ihe ndị Obama gụpụtara taa ọ chọrọ ka e mee buru ibu. Ọtụtụ ndị otu Demokrat kwenyere n’ihe Obama chọrọ ka e mee. Mana ndị Rịpọblikan na ndị otu NRA amalitegori iti mkpu megide Obama na atụmatụ ya.
Ọtụtụ ndị Amerịka malitere kwenyewe na e kwesiri ime ihe gbara ọkpụrụkpụ kemgbe otu nwoke buru egbe jee gbagbuo mmadụ 25 gụnyere ma ndị nkụzi ma ụmụ akwụkwọ n’otu ụlọ-akwụkwọ na Newtown. Tupu o mee nke a, o buru ụzọ gbagbuo mama ya n’ụlọ ebe ha bi.
What's Your Reaction?
![like](https://igboradio.com/assets/img/reactions/like.png)
![dislike](https://igboradio.com/assets/img/reactions/dislike.png)
![love](https://igboradio.com/assets/img/reactions/love.png)
![funny](https://igboradio.com/assets/img/reactions/funny.png)
![angry](https://igboradio.com/assets/img/reactions/angry.png)
![sad](https://igboradio.com/assets/img/reactions/sad.png)
![wow](https://igboradio.com/assets/img/reactions/wow.png)