Ọba Akwụkwọ Anambra Na Momodu Achịkọbarala Ụmụakwụkwọ Asọmpi Sụpèéré M

Dec 18, 2019 - 23:04
Jan 24, 2021 - 03:16
 0
Ọba Akwụkwọ Anambra Na Momodu Achịkọbarala Ụmụakwụkwọ Asọmpi Sụpèéré M

Izunna Okafor, Awka

Àgbà nke ikpeazụ nke asọmpi Sụpèéré M (Bụ Spelling Bee Competition) nke ahọ 2019 a chịkọbààrà ụmụakwụkwọ steeti Anambra na ndị na-agụ akwụkwọ n'ọba akwụkwọ steeti ahụ abịala n'isi njedobe n'Awka, ebe ndị tuuru ugo bùrù ọtụtụ ihe nrita dị iche iche wee laa.

Ya bụ asọmpi bụ nke a chịkọbara site n'aka ọba akwụkwọ steeti ahụ a mààrà dịka ọba akwụkwọ Ọkammụta Kenneth Dike dị n'Awka, site na njikọ aka Maazị Sule Momodu, bụ nwa amadi ahụ jibụrụ ọkwa na steeti ahụ dịka onyeisi ụlọ ọrụ ahụ na-ebu agha megide ịkpọ na ịtụ mgbere ọgwụ ike n'ala anyị, bụ ụlọ ọrụ National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA).

N'okwu ya na mmemme ahụ, onyeisi ọba akwụkwọ steeti Anambra, bụ Dọkịta Nkechi Udeze kwùrù na ebumnobi mmemme ahụ bụ iji tute mmụọ ịgụ akwụkwọ na mmụọ ịgba mbọ n'etiti ụmụ na-eto eto, ya na ime ka ndị ntorobịa guzosie, wepu uche n'ihe iche aka mgba ọbụla ha na-agabìga, bụ nke pụrụ ime ka ọtụtụ n'ime ha malite itinye aka n'ịkwụ ụdọ, ịkpọ maọbụ ịtụ mgbere ọgwụ ike, na ọtụtụ ihe ọjọọ ndị ọzọ dị iche iche, dịka ọ dị na mpaghara ebe dị iche iche n'ụwa taa.

Banyere ótú ụmụakwụkwọ ahụ siri medobe n'asọmpi nke ahọ a, Dọkịta Udeze kwuru hoohaa na ha gbalịrị, ma sịkwazie na o nwèrè olileanya na ha ga-emewanye nke ọma karịa n'ahọ na-abịa abịa; ọbụnadị dịka o kelekwàzịrị Maazị Momodu, bụ onye o mere ka a mara na ọ bụ ya zụtàrà igwe lapụtọọpụ na ụfọdụ ihe nrita ndị ọzọ e bùnyèrè ndị nwetara nturu ùgò n'asọmpi ahụ, ma kpekwazie ka Chineke gaa n'ihu ịgọzi ya mmaji kwuru mmaji.

N'ajụjụ ọnụ Ka Ọ Dị Taa gbàrà ya, Maazị Sule Momodu kwùrù na ihe kpaliri mmụọ ya ịkwàdò asọmpi ahụ bụ iji mee ka ndị ntorobịa malite itinye oge na echiche ha n'ihe bara uru, karịa ịnọ nkịtị, n'ihi na, dịka o siri kwuo, obi onye na-anọ nkịtị bụ ụlọ ọrụ ekwensu.

Dịka ọ na-atụrụ ndị nwetara mmeri mmamma, ma na-akpọkùkwa ndị enwetaghị mmeri ka ha kwado onwe ha nke ọma maka ahọ na-abịa abịa; Maazị Momodu kpọkùkwazịrị Ndị Anambra na ụlọ ọrụ ndị ọzọ dị iche iche ka ha ñòmie ụdịrị ezi ihe ahụ, n'ihi ọtụtụ ihe ọma dị iche iche nke ahụ ga-eweta, ọ kachasị n'ịgbanwè echiche ndị ntorobịa ka ha màlite ịtụnye ụtụ nke ha na mmepe obodo, karịa itinye aka n'ọgwụ ike maọbụ ajọ ihe ndị ọzọ dị iche iche.

Na ntụnye nke ha n'otu n'otu, ụfọdụ ndị sonyere na mmemme ahụ, nke gụnyere Oriakụ Nneka Okoye, Oriakụ Chinyere Mụọto nke ụlọ ọrụ 'Post Primary School Service Commission' (PPSSC) na steeti ahụ, tinyere Oriakụ Ify Ọgakwu, na Oriakụ Nwabụeze sitere ụlọ ọrụ Anambra State Universal Basic Education Board (ASUBEB) tòrò ndị chịkọbàrà asọmpi ahụ, ma kpọkùokwa ndị nne na nna ka ha na-agbà ụmụaka ha ume ịgụ o pekata mepe, otu akwụkwọ n'ụbọchị.

Malite n'onye nke mbụ wee ruo n'onye nke atọ n'otu n'otu, ndị dị iche iche nwetara mmeri n'asọmpi ahụ gụnyèrè: Godwin Divine, Chinemerem Udigwe, na Promise Okoro (maka ogoogo sekọndịrị dị elu); Victory Dom-Okeke, Influence Ụkaegbu, na Chiamaka Ọkparachukwu (maka ogoogo sekọndịrị dị àlà); tinyere Chinwụba Emmanuela, Precious Akinlawal, na Hassan Ahmed (maka ogoogo praịma).

Ihe dị iche iche e nyèrè ndị ahụ tutere ùgò gụnyèrè igwe akụrụngwa lapụtọọpụ na tabụleetị, akpa akwụkwọ, akwụkwọ nkọwa okwu, akwụkwọ ọgụgụ dị iche iche, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ.

Asọmpi sụpeere m nke ahọ 2019 malitere n'ọnwa Máàchị, wee dịgide ruo abalị iri na anọ nke ọnwa Ekeresimeesi, bụ ụbọchị a chịkọbàra agba nke egbe buru ọ laa.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.