Dike Àláá Mmụọ

Jan 22, 2020 - 20:38
Jan 24, 2021 - 02:18
 0
Dike Àláá Mmụọ

Izunna Okafor, Awka

Gém gém gém gém!
Dùm dùm dùm dùm
Tìkó tìkó tìkó tìkó
Gbám gbám dùm dùm.

Ùgbòrò abụọ ka òkù na-akpọ dike
Ọ kpọọ ya na ndụ, ọ kpọọ ya n'ọnwụ
Ihe emeghị n'ízù, o mee n'ọnwa
Maka na isi gbàá ahọ, chaa áwọ,
Nwa onye ụwa ga-azarịrị chi ya òkù.

Ụzụ tụọ n'ili dike
Ọha mmụọ na ọha mmadụ anụ ísì ozu ya
Maka na ọ na-abụ ekwe kụọ
Àmà agbaa.

Ọ bụ gịnị na-afịọ?
Oke mmiri àtáálá n'udummiri
Ihe mèrè na Ndịkeliọnwụ
Oke mmadụ ebuláálá akwụkwọ

Gìdì gìdì gìdì
Kotìko dùm dùm dùm
Chaị! íbo èzéé n'obí ézè
Ebubedike alaa mmụọ

Gịnị ka a na-ekwubèdị ihe a?
Chukwuemeka Ike àpàchiela anya
Eze Ndikeliọnwụ ejebego obodo afụdobe
Izùtè ndị mbụ na ndị ègèdè n'ọhà mmụọ.

Ihe emee n'obi eze
Ọ na-abụ ézè azụ kakpụọ mma
Ọ si oke òsìmìrì lọta
Onye ije alakwúrúlá chi ya.

Chukwuemeka bụ dike ụbụrụ nkọ
Ọkaibe n'ọhịa edemede
Ọkammụta nwere ùgwù
Chaị! eze obi umeala alakpuo ụra.

Ihe ala rìrì àkárịá
Ma ya dịba, maka na ụwa a bụ ahịa
Onye zụcha nke ya, ọ labá
Chukwuemeka Ike ladị mma.

Kókó kókó tìkó tìkó
Dùm dùm kótì
Eze, ka mkpụrụ obi gị zùrú ike udo
Ụbọchị nkwọ, ka anyị zụkọọ ọzọ n'ọhà mmụọ
Onye ijè ladị mma.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.