Ndị Anambra Bi Na Lagos Emeela Ubọchị Anambra Nke Ahọ 2019

Nov 27, 2019 - 23:02
Jan 24, 2021 - 04:27
 0
Ndị Anambra Bi Na Lagos Emeela Ubọchị Anambra Nke Ahọ 2019

Izunna Okafor, Awka

Ọ kpọtụrụ akpọtụ ma zụọ azụọ na Lagos na nso-nso a dịka ụmụafọ steeti Anambra bi n'ebe ahụ merùbèrè ụbọchị Anambra nke ahọ 2019. Oke mmemme ahụ bụ nke a chịkọbara site n'aka òtù ahụ jikọtara ndị Anambra na ya bụ steeti, bụ ndị a maara dịka "Anambra State Development Union" dọtara ọtụtụ ndị Anambra, ma bụrụkwa nke a nọrọ na ya wee gbapee atụmatụ ịchụ nta ego ruru otu ijeri naịra maka iguzòbe ogige ọmụmụ ọrụ aka na steeti Anambra, nke a kpọrọ "Anambra State Industrial Skill Village."

Ya bụ mmemme wèèrè ọnọdụ n'ama egwuregwu ala anyị dị na Surulere, Lagos ma bụrụ nke isi okwu ya pụtàrà "Ọrụ Aka Na Nkwalite Ụlọ Mmepụta Ngwọ Ahịa na Gburugburu Azụmahịa Na-Agbanwe Agbanwè" ma a tụgharịa ya.

N'ozi mmalite ya, onyeisi oche mmemme ahụ, bụ Maazị Ben Ndị Obi kọwapụtara mkpà ọ dị na Ndị Igbo jikọtara onwe ha maka ọganihu tọrọ àtọ, ọ kachasị n'ụwa a na-eme ntụgharị.
Ka ọ na-echètara ndị bịara ya bụ mmemme na ọ na-abụkwanụ akụ ruo ụlọ, a mara onye kpara ya; Maazị Obi kpọkuzịrị ụmụafọ Anambra na ndị Igbo n'izugbe ka ha na-ewelaru akụ ha ụlọ ma na-ewunyekwa ihe mwunye na steeti ha.

Na mbụ n'ozi nnọọ ya, onye ndu òtù ahụ, bụ Maazị Vincent Osakwe kwuru na mmemme ahụ hibèrè isi n'ịkwàlite omenala Igbo na ọdịmma Anambra, ma rịọkwazie ndị nne na nna bịara ya bụ mmemme ka ha gbasiekwa mbọ ike n'ịkụziri ụmụ ha asụsụ na omenala Igbo, iji hụ na nke ahụ anwụghị maọbụ fuo, dịka e buru n'amụma.

A nọrọ na ya bụ mmemme wee tie mmanwụ, gbaa egwu ọdịnala ma mekwa ọtụtụ ihe ngosi dị iche iche e jiri mara ndị Igbo.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.