Mmadụ 17 Anwụọla n'Ọnịtsha, Dịka Ídè Mmiri Buuru Ụgbọala Bu Ndị Njem

Apr 13, 2021 - 17:35
 0
Mmadụ 17 Anwụọla n'Ọnịtsha, Dịka Ídè Mmiri Buuru Ụgbọala Bu Ndị Njem

Izunna Okafor dere akụkọ a

Opekatampe, mmadụ iri na asaa zutèrè ọnwụ mberede ha na nsonso a, dịka ajọ ihe mberede okporoụzọ dapụtara n'Ọnịtsha, na steeti Anambra.

Ihe mberede okporoụzọ ahụ bụ nke dapụtara oge nnukwu mmiri ozuzo zòrò n'Ọnịtsha, nke mezịrị ka ídè mmiri jupụta n'okporoụzọ nà ebe niile, wee búchárá otu nnukwu ụgbọala Họma Bọọsụ bu ndị njem agara onwe ya, ga sụnye ya isi n'otu nnukwu olulu ọwà mmiri dị n'akụkụ okporoụzọ ahụ, bụ okporoụzọ awara—awara ahụ siri Ọnịtsha gaa Enugu.

Ndị ọnọmgbeomere kọwàra na ụgbọala ahụ ná-ebu mmadụ iri na asatọ bù ndị njem were eme njem ụbọchị ahụ, tupu mmiri wee buchara ya, sụnye ya isi n'ọwà mmiri.

Kaosiladị, n'ime mmadụ iri na astaọ (18) nọ n'ụgbọala ahụ oge ahụ, mmadụ iri na asaa (17) n'ime ha (mà onye na-anyà ụgbọala ahụ) nwụrụ anwụ, n'ihi na mmiri gbàgbùrù ha n'ime ọwa mmiri ahụ ozigbo. Ọ bụ naanị otu nwaanyị bu akwụkwọnsọ ya n'aka bụ onye pụtara n'ime mmadụ iri na asatọ ahụ. E burukwara ya ozigbo gaa ụlọọgwụ Toronto dị n'Ọnịtsha ahụ, maka inye ya ọgwụgwọ.

N'okwu ya oge ọ gara n'ebe ahụ, onye na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo Ọgbaru n'ụlọ imeiwu steeti Anambra, bụ Maazị Noble Igwe kọwara ihe mberede okporoụzọ ahụ dịka nnukwu ihe ọdachi na-agba anyammiri, ma kpee ka Chineke nabàta mkpụrụobi ndị ahụ nwụrụ anwụ, ma kasikwa ezinụlọ ha obi.

N'okwu nke ya, onyeisi ụlọọgwụ Toronto, bụ Dọkịta Emeka Eze katọrọ ụdị ajọ ọdachi ahụ, ụa nye ndị na-anyà ụgbọala ndụmọdụ ka ha na-akpachàpụ anya n'etu ha si anyà ụgbọala n'oge udummiri a, ọkachisị n'ebe ha amachaghị àlà nke ọma, iji zèére ihe ọdachi dị etu ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484