NDLEA Anwụchiela Ọtụtụ Mmadụ Maka Ọgwụike

Feb 7, 2022 - 22:21
 0
NDLEA Anwụchiela Ọtụtụ Mmadụ Maka Ọgwụike

Izunna Okafor dere akụkọ a

Onye a gwara agwa, ma ọ nụghị anụ, o mee emee, ọ hụ ahụ.

Ka ọ dị taa, ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka ibu agha megide ịñụ, ịkpọ, ire maọbụ ịtụ mgbere ọgwụike n'ala Nigeria, bụ ụlọọrụ ‘National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA)’ ejidela mmadụ atọ a na-enyo ènyó na ha bụ ndị jiri ịtụ mgbere ọgwụike mere aka ọrụ ma bụrụkwa ndị na-ebu ọgwụike si otu mbà gaa mba ọzọ.

Dịka ozi a kụpụrụ na nsonso a site n'aka isi ụlọọrụ ahụ siri kọwaa, mmadụ atọ ahụ, bụ Maazị Mohammed Hussaini (gbara ahọ iri atọ na abụọ), Maazị Adamu Bella (gbara ahọ iri na asatọ), na Maazị Mohammed Umar (gbakwara ahọ iri na asatọ), bụ ndị e jidere na mpaghara isi njikọụzọ Tsamiya dị n'okporoụzọ Madanya dị na Mubi, n'okpuruọchịchị ime obodo 'Mubi North' nke steeti Adamawa, ma bụrụkwa ndị e nwetesiri ọgwụike dị iche n'aka ha, bụkwa nke ha chọrọ ibu si Adamawa gaa Cameroon.

Ọgwụike ahụ e nwetere n'aka ha gụnyere mkpụrụ ọgwụ 'Tramadol' ruru puku iri anọ na asatọ (48,000) n'ọnụọgụgụ, ma bụrụkwa nke ike arọ ya dị 225mg.

Oge a gbara ha ajụjụọnụ, ha kwuru na ha bu ọgwụike ahụ aga na Bagira, bụ obodo dị n'akụkụ ebe ala Nigeria na mba Cameroon gbàrà agbataobi, ka e wee sizie ebe ahụ bupu ya gaa Maroa dị na Cameroon; o wee bụrụ eti ahụ ka ọrụ siri kụọ ụbọchị ahụ.

N'akụkọ ọzọ dịkwa ka ibè ya, ndị ọrụ NDLEA, ngalaba steeti Lagos, nọkwàrà na nsonso a wee gbachìbìdo ma jide ndị bu ọgwụike Loud na ụdị ọgwụike ndị ọzọ dị icheiche ike arọ ya ruru kilogram otu puku na narị ise, n'ime steeti Lagos n'Edo.

Nke ahụ bụkwa nke mere ka ọ gachaara abalị olenaole ha jiri nwụchikọọ ndị mgbere ọgwụike ọzọ bu ngwùgwù ọgwụike Cannabis Sativa ruru otu puku na narị abụọ (1200) n'ọnụọgụgụ, bụkwa nke ike arọ ya ruru kilogram otu puku na narị abụọ na iri abụọ na abụọ (1222kg) na mpaghara Alaba Rago dịkwa na steeti Lagos, ma bụrụkwa nke a na-enyo ènyò na ndị ahụ sìrì mba ofesi wee bubàta.

N'ọrụ ọzọ ha bàgidèrè, ha jidekwara otu nwoke bụ Ibrahim Musa (gbara ahọ iri abụọ na ise) na mpaghara Suru Alaba, dị n'okpuruọchịchị ime obodo Ajeromi-Ifelodun nke steeti Lagos, ma nwetekwa ụdị ọgwụike dị icheiche n'aka ya, nke gụnyere mkpụrụọgwụ 'Tramadol' ruru puku iri na asatọ na narị ise na iri atọ (18,530) n'ọnụọgụgụ, ọgwụike Rohynol, Diazepam, na Exol-5, tinyere karama ọgwụike 'Codeine' ruru otu narị na iri atọ na asatọ (138) n'ọnụọgụgụ.

N'ọdụ ụgbọelu ‘Murtala Mohammed International Airport (MMIA)' dị  n'Ikeja bụ isi obodo steeti Lagos; ndị ọrụ NDLEA jidekwàrà mkpọkọta akwụkwọ ikike e ji eme njem ịga mba ofesi, nke ruru iri abụọ na abụọ n'ọnụọgụgụ, ma bụrụkwa nke e zoro n'ime akpa garrị, ebe e tinyesikwara ihe ndị ọzọ dị icheiche e ji esi nri. 

Ha nọkwàrà n'ọdụ ụgbọelu ahụ nwete ngwùgwù ọgwụike 'Cannabis' dị iri na abụọ (12) n'ọnụọgụgụ ma bụrụkwa nke ike arọ ya dị kilogram anọ na ụma iri iteghete na ise (4.95kg), bụ nke onye nwe ya tinyesiri n'ime igbe erimeri 'Golden Morn' ma na-achọkwazị ibu ya aga mba ofesi tupu e wee jide ya. Ọ bụ oge ndị ọrụ NDLEA na-eme nnyòcha ahụ ha na-emekarị n'ọdụ tupu ụgbọelu efelie njem ka ha nwetesiri ihe ndị ahụ.

Ha bụ ndị ọrụ NDLEA nwụchikọkwàzịrị ọtụtụ ndị ọzọ na-atụ mgbere ọgwụike n'ime ụfọdụ steeti ndị ọzọ dị icheiche n'ala Nigeria, nke gụnyere steeti Plateau, ebe ha nwụchikọrọ Maazị Emeka Ezenwa (gbara ahọ iri atọ na asaa) na Maazị Julius Akingbe (gbara ahọ iri anọ na ise) maka izo ọgwụike mkpụrụmmiri n'ime ihe e ji akpọ egwu, bụ DVD, ma buru ya si Lagos na-ala, tupu e wee nwụchie ha.

Ebe ndị ọzọ dị icheiche e jidekwara ndị mmadụ maka ọgwụike gụ̀nyèrè: steeti Plateau, ebe e jidèrè Fatima Sadiq (gbara ahọ iri abụọ) maka ọgwụike Cannabis; steeti Jigawa, ebe e jidere ọgwụike Cannabis, Diazepam, Exol-5 na ụdị ọgwụike ndị ọzọ ma nwetekwa mmà, okpìrì, ébè (catapult), ọgwụ a gwọrọ agwụ, na ụfọdụ ihe ndị ọzọ; steeti Edo, ebe e nwetere nnukwu àkpà ruru iri abụọ na asaa (27) n'ọnụọgụgụ ọgwụike Cannabis juru na ya
 
N'okwu ya banyere nke ahụ, onyeisi ụlọọrụ NDLEA n'ala Nigeria, bụ Maazị Mohammed Buba Marwa kwupụtara obiụtọ ya banyere ezi ọrụ ahụ ndị ọrụ ya rụrụ site n'ịnwụchikọ ndị ahụ, kelee ha, ma gbàkwazie ha ume ka ha jisie ike n'ọrụ. Okwezịrị nkwa na a ga-akpụpụ ndị ahụ ụlọikpe, ebe a ga-eji usoro iwu wee gwọọ ha ji mmanụ, dịka ihe ha metara siri dị. 

Dịka ọ na-ekwe nkwà na a ga-akpụpụ ndị ahụ ụlọikpe ma kpee ha ikpe banyere ihe ha mere, ọ dụkwara ndị na-etinye aka n'ọgwụike ka ha sepu aka na nke ahụ, n'ihi na ụlọọrụ ahụ na ndị ọrụ ya agaghị ada mbà n'ibu agha megide ihe ọbụla bụ ọgwụike n'ala Nigeria.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484