Ịzọ Igwe: Ndị Amanuke Akpọkuola Gọọmenti Ka Ọ Gbatara Ha Ọsọ Enyemaka

Jul 18, 2021 - 22:12
 0
Ịzọ Igwe: Ndị Amanuke Akpọkuola Gọọmenti Ka Ọ Gbatara Ha Ọsọ Enyemaka

Izunna Okafor dere akụkọ a

Igbo sị na ọ naghị adị mma okenye ịnọ n'ụlọ ewu amụọ n'ọgbụ.

N'ihi nke ahụ, ndị obodo Amanuke dị n'okpuru ọchịchị 'Awka North' akpọkuola ma rịọ gọọmenti steeti Anambra ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka n'ihi nsogbu ịzọ igwe na-achọ ịdapụta n'obodo ahụ.

Ndị okenye na ndị e ji okwu ha agba izù n'obodo Amanuke a maara dịka "Oke-Ọkpa Irunese” bụ ha kpọrọ oku mgbataọsọ a na nnukwu ọgbakọ ha nwere na nsonso a ma bụrụkwa nke ha nọ na ya wee kpọọ òkù ka e nwee udo, ọbụladị dịka ha kpọkuru ụmụnne abụọ ahụ na-enwe nsogbu ahụ ka ha gbasoo udo.

N'okwu ya n'ebe ahụ n'aha ndị òtù ahụ, onye kacha bụrụ okenye n'obodo ahụ, bụ Mokwugwo Ughanwa gbarụrụ ihu banyere ogoogo okwu ahụ rugoro na ya ugbua, nke na o ruola ụlọikpe, n'ebughị ụzọ ruo n'aka ndị na-ahụ maka ihe gbasaara omenala n'obodo ahụ ka ha buru ụzọ tinye ya ọnụ maọbụ mee nnyocha kwesiri ekwesi banyere ya. 

Dịka ọ na-eme ka a mara na okwu ahụ ekwewsighị iru ụlọikpe maọbụ gbasàá ruo ogoogo ahụ ọ nọ na ya ugbua, ọ kọwara na oche eze obodo ahụ ekwesighị ịbụ ihe a ga-eji na-egwu okwe ndọrọndọrọ ọchịchị, ọbụladị dịka o mere ka a mara na ọ bụ otu nwoke ji ego na-esuwanye nsogbu na ọgbaaghara ahụ ma na-eme ka ọ na-akawanye njọ.

Na ntụnye nke ya, otu onye ọzọ selitere isi n'obodo ahụ, bụ Emezie Nwokoye kwàrà arịrị na ya bụ nsogbu na-akawanye njọ kwa ụbọchị, ma kwuo na ọ bụrụ na e gbubìghì ya bụ agwọ ọdụ ugbua, ị mara na o nwere ike itokwu ogologo ma tagbuo mmadụ n'ọdịnihu, n'ihi na ya bụ nsogbu nwere ike ịkpụtọ aha obodo ahụ maọbụ wèta mbibi n'ụzọ dị iche iche. 

Dịka ọ na-adụ ndị so akwanye ọkụ na nsogbu ahụ ọdụ ka ha sepụ mma n'akịdị ma gbasoo udo na ụzọ iwu kwàdòrò, ọ rịọzịrị enyemaka na mgbataọsọ gọọmenti iji gbochie ya bụ nsogbu ịbà n'ihe ọzọ ka njọ.

N'okwu nke ya n'aha ụmụnwaanyị, Oriakụ Gladys Enemuo na Oriakụ Charity Anaedozie kpọkuru mmadụ abụọ na-enwe nsogbu ahụ ka ha wèlata okwu ahụ ụlọ ma nọrọ n'ụlọ kpezie esemokwu ha. Ha kwuru na ọ gbara ha ngharị etu onye esoghị wee mee nhọpụta maka ịzọ igwe ga-esi si n'ụzọ mkpụkè wee na-agwọgharị ihe niile ma na-agbanwèzị ebumnobi ndị mmadụ; ọbụladị dịka ha kpọkuru na-azọ ọkwa ahụ ka ha kpezie ma kwụsị ime ka okwu ahụ gaa n'ihu.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484