Ihe Mberede Okporo Ụzọ Emerụọla Otu Onye Ahụ n'Azụ Ụlọọrụ National Light

Sep 2, 2020 - 21:04
Jan 28, 2021 - 21:05
 0
Ihe Mberede Okporo Ụzọ Emerụọla Otu Onye Ahụ n'Azụ Ụlọọrụ National Light

Izunna Okafor

Otu onye nwetara nnukwu ihe mmerụahụ na nsonso a, dịka ihe mberede okporo ụzọ dapụtara n'ótù okporo ụzọ a maara dịka 'Meloch Road' dị n'azụ ụlọọrụ 'Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC)' dị n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra.

Ya bụ ihe mberede bụ nke dapụtara n'etiti ụgbọala Innoson Sport Utility Vehicle (nwere ákàrà AGU-01RH) na Keke enweghị, ma bụrụkwa nke metụtara ụmụnwoke abụọ, bụ ndị nya ụgbọala ahụ Keke ahụ n'otu n'otu.

N'okwu ọ gwara Ka Ọ Dị Taa banyere nke ahụ, onye nya ụgbọala ahụ, bụ Maazị Ebuka Umeononamkpume mere ka a mara na ọ bụ onye nya Keke ahụ mere ihe mberede ahụ jiri dapụta, n'ihi na ya onwe ya na-agbadatara onwe ya, onye Keke ahụ wee jiri azụ si n'ụzọ ọzọ dị n'akụkụ ebe ahụ mapụta n'ike, ha abụọ wee kwòkọọ mpì ka ebule.

N'okwu nke ya, onye nya Keke ahụ, bụ Maazị Bashiru Usman kwuru na ọ bụ onye ọkwọụgbọala ahụ kpatara ya bụ ihe mberede, n'ihi na ọ na-agba oke ọsọ, nke na o nweghịzị ike ijide ya n'ike, o wee jiri ọsọ ahụ bịa suo ya ebe o si n'ụzọ ọzọ na-apụtara onwe ya.

Ọ kọwara na ọ bụ ihu ka o ji apụta  (na ọ bụghị azụ ka o ji, dịka onye ọkwọụgbọala ahụ siri kwuo); ma kwuo na ya bụ nwoke nọ n'oke ọsọ, nke na o nweghị ike ịhụ ya (bụ onye Keke) n'oge, wee ruo mgbe o rutere ya nso, wee suo Keke ya gwogwoo.

Ọ bụ ezie na o nweghị onye nwụrụ n'ihe mberede okporo ụzọ ahụ, ụgbọala ahụ na Keke ahụ tigwosiri etigwosi, ebe onye ahụ na-anya Keke nwetakwara nnukwu ihe mmerụahụ n'akụkụ ahụ ya dị iche iche ụbọchị ahụ.

Ụfọdụ ndị ezigbo mmadụ gbatara ọsọ enyemaka n'ebe ahụ ihe ahụ nọrọ wee mee ụbọchị ahụ soro wee nye aka ịhụ na e nweghị ọnọdụ agbakata akwụrụ na mpaghara ebe ahụ ya bụ ihe mberede okporo ụzọ dapụtara.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.