Ndị Uweojii Anambra Ejidela Ndị Otu Nzuzo Ebe Ha Na-Anabata Ndị Ọhụrụ

Apr 18, 2021 - 22:10
 0
Ndị Uweojii Anambra Ejidela Ndị Otu Nzuzo Ebe Ha Na-Anabata Ndị Ọhụrụ

Izunna Okafor


Ndị uweojii steeti Anambra anwụchikọọla ndị otu nzuzo na ndị omekoome n'ebe nzuzo ha, dịka ha na-anabata ndị ọhụrụ n'otu nzuzo ha.

Ndị ahụ e jidere dị mmadụ isii n'ọnụọgụgụ, ma bụrụkwa ndị a nwụchikọrọ n'elekere iri na abụọ nke ụbọchị Wenezdee, n'Amikwo Awka, dị n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Awka South' nke steeti ahụ, ma bụrụkwa ndị a na-enyo ènyò na ha bụcha ndị otu nzuzo na ndị omekoome.

Onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti Anambra, bụ DSP Ikenga Toochukwu bụ ya mèrè ka ụwa mara nke a site n'ozi ọ kụpụụrụ ndị ntakụkọ na steeti ahụ, bụkwa nke o sitere na ya wee kpọpụta aha mmadụ isii ahụ dịka Maazị Ejinaka Chukwujekwu (gbara ahọ iri na asaa), Maazị Emeka Nwanna (gbara ahọ iri na asatọ), Maazị Micheal Ozuah (gbara ahọ iri abụọ), Maazị Chukwuma Obu (gbara ahọ iri abụọ na abụọ), Maazị Onyemaechi Chijoke (gbara ahọ iri abụọ na ise), na Maazị Ifeanyi Ebeze (gbara ahọ iri abụọ na ise).

Ọ gara n'ihu kwuo na ha nwètara nsụnsụ egbe abụọ na mgbọ egbe asatọ n'aka ndị ahụ, ma gbakwa akaebe na ndị ahụ ejirila ọnụ ha wee sàá asịsà, kwuo na ha bụ ndị òtù nzuzo 'Black Axe'.

Dịka o siri kọwaa, nnyocha e mere na-egosi na ọ bụ ndị òtù ahụ nọrọ n'ụtụtụ ụbọchị Mọnde wee gbaa égbè dị egwu, nke ha sitere na ya wee gbagbuo otu nwaokorobịa na mpaghara Ukwuọjị, dị n'ụzọ ahịa Eke Awka, ma jirikwa mmà gburikọọ isi ya, ọbara wee jupụta ebe niile.

DSP Toochukwu mekwazịrị ka a mara na a ka na-eme nnyocha banyere ndị ahụ na ihe ndị ọzọ ha mere, nke, mgbe e mechaara ya, a kpụpụ ha ụlọikpe, wee kpee ha ikpe ma kwụọ ha ụgwọ dịka ọrụ ha siri dị.

N'okwu ya banyere nke ahụ, onyeisi ndị uweojii na steeti Anambra, bụ CP Monday Bala Kuryas, fsi, kèlèrè Ndị Anambra maka nkwàdo na ozi ha na-enye ndị ọrụ nchekwa, nke na-eme ka ọrụ ha na-aga nke ọma na steeti ahụ. 

Dịka ọ na-adụ ndị omekoome ọdụ ka ha chegharịa, pụọ n'otu nzuzo, sepu aka n'arụrụala maọbụ kwakọrọ ngwongwo ha pụọ na steeti ahụ, CP Kuryas kpọkwazịrị òkù ka e nwee ezi njikọaka n'etiti ndị ọnụ na-eru n'okwu, ọhaneze na ndị ọrụ nchekwa, iji wee memilaa ndị omekoome, belata ajọ ọnọdụ nchekwa, ma kwàlitekwa ezi ọnọdụ nchekwa bụ ịgbà na steeti ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484