Ndị Otu 'Rotary Club' Enyena Ụlọ Ọba Akwụkwọ Anambra Onyinye Akwụkwọ Ọgụgụ

Sep 11, 2017 - 09:30
Jan 23, 2021 - 22:46
 0
Ndị Otu 'Rotary Club' Enyena Ụlọ Ọba Akwụkwọ Anambra Onyinye Akwụkwọ Ọgụgụ

Izunna Okafor, Awka, Nigeria

Otu a kpọrọ "Rotary Club International", mpaghara nke 9142, nọrọ n'ụbọchị Tọọzdee wee bute ma nye ụlọ ọba akwụkwọ steeti Anambra onyinye akwụkwọ ọgụgụ dị iche iche. Nke ahụ bụ nnọọ otu n'ime mbọ ha na-agba  iji wee kwalite omenala ịgụ akwụkwọ nyegara ezi ụmụafọ ala anyị.

Otu a kpọrọ "Rotary Club International", mpaghara nke 9142, nọrọ n'ụbọchị Tọọzdee wee bute ma nye ụlọ ọba akwụkwọ steeti Anambra onyinye akwụkwọ ọgụgụ dị iche iche. Nke ahụ bụ nnọọ otu n'ime mbọ ha na-agba  iji wee kwalite omenala ịgụ akwụkwọ nyegara ezi ụmụafọ ala anyị.

Ka ọ na-ekwu okwu na ya bụ mmemme inyefe akwụkwọ ndị ahụ n'aka ụlọ ọba akwụkwọ ahụ, bụ nke a maara dịka "Prof. Kenneth Dike Central E-Library" n'Awka; n'aha onye isi mpaghara 9142 ahụ, bụ Dọkịnta Emma Udeh-Akpeh, osote ya bụ Ọkammụta Michael Okikpo kwuputara na atụmatụ ahụ so n'ụtụ nke ya bụ otu na-atụnye n'ịkwalite ezi ọnọdụ mmụta na agụm akwụkwọ n'ogogo dị iche iche n'ala Naịjiria.

Maazị Udeh-Akpeh kwuputanworo ịgbasi mbọ ike nke otu ahụ n'inyere ndị ụwa na-atụ n'ọnụ aka, ma sịkwa na ha ga na-aga n'ihu n'ịrụ ya bụ ọrụ obi ebere.

Ụfọdụ ndị selitere isi n'otu ahụ, nke gụnyere Maazị Amobi Adịrịka na Uche Akpakama kọwara otu 'Rotary Club' dịka otu na-adịghị achọ uru ego, ma kpọpụtagasịkwa ọtụtụ ihe dị iche ya bụ otu megoro nakwa ụfọdụ atụmatụ ndị ọzọ ha ji n'aka.

N'okwu nke ya, onye isi otu jikọtara ụlọ ọba ego dị iche iche n'ala Naịjirịa, ngalaba nke Anambra, bụ Dọkịnta Uju Nwaforizu toro ndị otu a n'ihi ezi nzọpụ ụkwụ ahụ  n'ikpochalata amaghị akwụkwọ ma kwalitekwa ezi ọnọdụ agụm akwụkwọ n'ala anyị, ma kpọkuzie ndị nne na nna ka ha nye aka jalie ụmụ ha iji wee kete oke na ya bụ uru amamihe site n'ịga n'ụlọ ọba akwụkwọ ahụ na ụlọ akwụkwọ ndị ọzọ dị iche iche agụ akwụkwọ na mgbe na mgbe.

N'ozi ekele ya, onye nọgodi  dịka onye isi ụlọ ọba akwụkwọ ahụ, bụ Nwaada Nkechi Udenze kwupuuru ma tokwa ndị otu ahụ banyere ezi atụmatụ ahụ, ma rịọkwazie ndị nne na nna ka ha nye aka n'ịkwalite ọnọdụ mmụta n'ebe ụmụ ha nọ n'ihi na ọ dịrịghị naanị ndị nkụzi, kama, ọ bụ ọrụ dịịrị mmadụ niile.

Ihe pụtakarịchara ihe na mmemme ahụ bụ inyefegasị akwụkwọ ọgụgụ ahụ n'aka ndị isi ụlọ ọba akwụkwọ ahụ bụ "Kenneth Central E-Library" site n'aka ndị otu ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.