Obianọ Akwanyerela Ndị Ọrụ Agha Lara Mmụọ Ùgwù n'Awka

Jan 18, 2022 - 21:37
 0
Obianọ Akwanyerela Ndị Ọrụ Agha Lara Mmụọ Ùgwù n'Awka


Izunna Okafor dere akụkọ a


Ọchịchị steeti Anambra nọrọ na nsonso a wee chịkọta mmemme na ihe omume dị icheiche e jiri merùbe emume ncheta ụbọchị ndị ọrụ agha ala Nigeria, a kpọrọ ‘Armed Forces Remembrance Day’ nke ahọ 2022.

Mmemme ahụ wééré ọnọdụ n'ama egwuregwu Alex Ekwueme dị n'Awka bụ isi obodo Anambra bụkwà nkè aka na-achị steeti ahụ, bụ Gọvanọ Willie Obianọ nọrọ na ya wee kwanyere ha bụ ndị ọrụ agha, ọkachasị ndị nke nwụrụ n'ihu ọrụ ùgwù maka mbọ ha dị icheiche, nà iji ndụ ha chụọ àjà maka nchekwa ala Nigeria na ụmụafọ ya.

Ya bụ óké mmemmr omenahọ dọtàrà ọtụtụ ndịisi ọrụ nchekwa na ndị e ji okwu ha agba ìzù na ngalaba dị icheiche, nke gụnyere Ọkaokwu ụlọ omeiwu steeti Anambra, bụ Maazị Uchenna Okafor; Odeakwụkwọ izugbe gọọmenti steeti ahụ, bụ Ọkammụta Solo Chukwulobelu; onyeisi ọrụ oyibo steeti ahụ, bụ Ọkaiwu Theodora Igwegbe; ndị otu jikọtara nwunye ndị uweojii, bụ ‘Police Wives Association’ (POWA), tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.

Gọvanọ Obianọ nọrọ na mmemme ahụ wee nara mgbuchapụ site n'aka ndị ọrụ agha ala Nigeria, kpagharịa n'etiti ha oge ha kwụ n'ahịrị, ịma ka ha siri nọrọ; ma mekwa emume idebe òkóòkó a kpara akpa (wreath) n'elu ihe e jiri mere ílì ụfọdụ ndị agha ala Nigeria lagoro mmụọ.

N'okwu ya n'ebe ahụ, kọwara mmemme ahụ dịka nke dị oke mkpa, ma mekwa ka a mara na otu n'ime isi sekpụ ntị e ji achịkọba mmemme ahụ bụ iji chèta ma kwanyere ndị ọrụ agha ala Nigeria ùgwù, gbàkwa ha ume.

Ọ gbara akaebe banyere ezi ọrụ dị icheiche ndị ọrụ agha ala Nigeria na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ na-arụ n'iwètà udo na ezi ọnọdụ nchekwa tọrọ àtọ n'ala Nigeria kemgbe ọtụtụ ahọ gara aga; ma mekwa ka a mara na ọtụtụ n'ime ha anwụọla n'ihu ọrụ ahụ, mana ya bụ nsogbu ka na agawanyekwa n'ihu ruo taa.

Ọ katọkwàrà etu ọtụtụ ndị mmadụ si awakpò ma na-egbu ndị ọrụ nchekwa enweghị ihe ọjọọ ha mere, n'ihi nsogbu dị icheiche na-adapụtasị n'ebe dị icheiche n'ala Nigeria; ọbụladị dịka o kpere ka mkpụrụobi ha zuo ike na ndokwa.

N'okwu nke ya oge ndị nta akụkọ na-agba ya ajụjụọnụ, Ọkaokwu ụlọ omeiwu steeti Anambra, bụ Maazị Uchenna Okafor tòrò Gọvanọ Obianọ maka ezi mmasị dị icheiche o nwere n'ihe gbasaara ọdịmma na ezi ọnọdụ obibindụ ndị ọrụ agha ala Nigeria, ma ndị nke ka nọ n'ọrụ ugbua ma ndị nke lagoro ezumike nke, nàkwà ndị ezinụlọ ha.

Ya bụ mmemme dọtarakwara onyeisi òtù jikọtara ndị ọrụ agha ala Nigeria lagoro ezumike nka, ngalaba steeti Anambra, bụ 'Major Ben Agbogu; onyeisi ụlọọrụ ‘Awka Capita Territory Development Authority (ACTDA)’, bụ Maazị Amechi Okwuosa, na ọtụtụ ndị ọzọ.

A nọkwara na mmemme ahụ wee gbalie ọnụegbe olenaole elu, ma hapụkwa ụfọdụ ndùrù ka ha felie elu, dịka ihe ngosi udo.

Nchèta ụbọchị ndị agha bụ nke a na-emebụ n'ụbọchị iri na otu nke ọnwa Nọvemba n'oge mbụ iji chèta mbọ pụtara ihe ndị ọrụ agha gbàrà iji wèta ọgụ mba ụwa nke mbụ na nke abụọ n'isi njedobe; ma e mechaa gbanwèé ya ka ọ bụrụzie nke a ga na-eme n'ụbọchị iri na ise nke ọnwa Jenụwarị ahọ ọbụla iji merùbe ncheta mbọ ndị ọrụ agha ala anyị gbàrà na mbọ dị icheiche ga ka na-agba iji kwàlite ezi ọnọdụ nchekwa na ịdịnotu ala Nigeria.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484