Agba Nke Abụọ Nke 'Anambra Youth Connect ' Abịala na Njedobe n'Awka

Aug 12, 2021 - 22:43
 0
Agba Nke Abụọ Nke 'Anambra Youth Connect ' Abịala na Njedobe n'Awka

.

Izunna Okafor dere akụkọ a

.

Àgbà nke abụọ ma bụrụkwa àgbà nke ahọ 2021 nke ihe mmemme 'Anambra Youth Connect' abịala na njedobe n'Awka bụ isi obodo Anambra.

Mmemme omenahọ ahụ wééré ọnọdụ n'isi ụlọọrụ na-ahụ maka ndị ntorobịa na steeti ahụ bụ nke dọtara ọtụtụ ndị ndu na ndị nnọchianya òtù ndị ntorobịa dị iche iche na steeti ahụ, ma bụrụkwa otu n'ime mmemme e ji emerùbe mmemme ụbọchị ndị ntorobịa na mba ụwa a maara dịka 'International Youth Day' kwà ahọ ọbụla.

N'ozi nnọọ ya na mmemme ahụ, Kọmishọna na-ahụ maka ndị ntorobịa na steeti ahụ, bụ Ọkammụta Theresa Obiekezie kọwara na ọ bụ ụlọọrụ ya tụpụtara ihe mmemme ahụ n'ahọ gara aga, ma bụrụkwa nke e wepụtara iji kpọkọlọta ndị ndu òtù ndị ntorobịa dị iche iche, ka ha wee tụkọọ arò ọnụ ma tụgharịa uche n'ihe dị iche iche metụtara ha na òtù ha dị iche iche.

O kwuru na mmemme ahụ na-enyekwa ndị ntorobịa ahụ ohere iji tụọ arò banyere etu a ga-esi wee gbòó nsogbu dị iche iche metụtara òtù ha, ma nyekwa ha ohere inweta nkụzi na ọzụzụ kwesiri ekwesi ga-enyere ha aka idu na ịchịkwa ndị òtù ha nke ọma, tinyere ọtụtụ uru ndị ọzọ dị iche iche mmemme ahụ na-ewètara ndị ntorobịa.

Dịka ọ na-ekele ndị ntorobịa maka isonyesi ike na mmemme ahụ nke ahọ a, Ọkammụta Obiekezie chetààrà ha na Gọvanọ Willie Obiano bụ onye hụrụ ndị ntorobịa n'anya nke ukwuu, ma bụrụkwa onye na-akwàdokarị ma na-etinyesikwa ndị ntorobịa n'ihe a na-eme, màlite kemgbe ọ batara n'ọkwa ọchịchị wee ruo taa. O kelekwara Gọvanọ Obianọ maka nkwàdo ọ na-enye ụlọọrụ ahụ na ndị ntorobịa steeti ahụ, ma jirikwazie ohere ahụ kpọkuo ndị ntorobịa Anambra ka ha bịa sonye na mmemme imerubè ụbọchị ndị ntorobịa na mba ụwa nke ahọ 2021 a ga-emerùbe na steeti ahụ, bụ nke ga-ewere ọnọdụ n'abalị iri abụọ na abụọ nke ọnwa Ọgọstụ a n'ògìgè 'Hollywood Event Centre' dị n'Awka

N'okwu nke ya oge ọ na-akọwpụtasị ụfọdụ ahụmahụ o nwèrè mgbè ọ ịọ n'ọkwa dịka onyeisi òtù ndị ntorobịa na steeti ahụ n'oge mbụ, nnukwu onye enyemaka pụrụ iche nye Gọvanọ Obianọ n'ihe gbasaara ọrụ pụrụ iche, bụ Maazị Nwabufor Nwankwo dụrụ ndị ntorobịa ahụ ọdụ ka ha gba mbọ nweta akwụkwọ ikike e ji atụ akwụkwọ, ma gwakwa ha ka ha buru ụzọ bụrụ ndị na-arụ ezigbo a hụrụ anya na mpaghara ime obodo ha na n'òtù ha dị iche iche tupu ha amakpuo n'igwù okwe ndọrọndọrọ ọchịchị, maka na a na-esi n'ụlọ mara mma wee pụba ezi.

Na ntụnye nke ya, onyeisioche òtù 'National Youths Council of Nigeria' na steeti Anambra, bụ Maazị Samuel Egwuatu dụrụ ndị ntorobịa ahụ ọdụ ka ha tinye uche ha n'ihe ziri ezi ma gharakwa ikwe ka ndị na-egwu okwe ndọrọndọrọ ọchịchị jiri ha kwara ngwaọrụ ọjọọ, ọkachasị n'oge ndọrọndọrọ ọchịchị à a nọ na ya ugbua.

Na ntụnye nke ya, osote onye ji ọkwa '1st National Vice President, ASATU Youths' ma bụrụ Gọvanọ ndị ntorobịa ASATU na mpaghara ọgbọntankwàdo 'Anambra South', bụ Maazị Nkwadochukwuka Onwughalu tòrò ezi mmekọrịta dị n'etiti Kọmishọna Obiekezie na ndị ntorobịa steeti ahụ, ma kpọkuo òtù ndị ntorobịa dị iche iche dịgasị na steeti ahụ ka ha jikọta onwe ha, nwee ótù olu ma jirikwa ótù olu wee na-ekwu okwu oge niile, iji wee na-enweta ihe ha chọrọ n'aka gọọmenti.

Na mbụ n'okwu nke ya, nnukwu onye enyemaka pụrụ iche nye Gọvanọ Obianọ n'ihe gbasaara nkewapụta akụnụba nke ihe e ji aka eme (SSA, Creative Economy), bụ Maazị Marcel Manafa kpọkùrù ndị ntorobịa ahụ ka ha na-enye ọchịchị Gọvanọ Obianọ nkwàdo kwesiri ekwesi, ma chetekwara ha na Obianọ nwere mmasị pụrụ iche n'ihe gbasaara ndị ntorobịa, bụkwa nke o gosipụtagoro n'ọtụtụ ụzọ dị iche iche, ọkachasị site n'ọtụtụ ọmarịcha atụmatụ dị iche iche ọ na-ewepụta maka ọdịmma ndị ntorobịa steeti ahụ kemgbe ọ batara n'ọkwa ọchịchị.

N'okwu mmechi ya, odeakwụkwọ ọkpụtọrọkpụ ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka ndị ntorobịa na steeti ahụ, bụ Oriakụ Louisa Ezeanya gwara ndị ntorobịa ahụ ka ha buru ozi ahụ na ihe niile ha mụtàrà ebe ahụ wee lakwuru ndị òtù ha ma kụziere ha ihe dị iche iche ha mụtara n'ebe ahụ, ọbụladị dịka ọ rịọrọ ha ka ha na-agbaso udo nà usoro mkparịtaụka oge niile, na-akpachàpụ anya nke ọma, gharakwa ịdị na-achọ nsogbu maọbụ na-eme tigbuo zọgbuo oge niile, ma zèéré ịbụ ndị na-ebute nsogbu na ọgbaaghara n'obodo, ọkachasị n'oge ndọrọndọrọ ọchịchị a, maọbụ n'ihe gbasaara Maazị Nnamdị Kanụ na òtù IPOB.

A nọkwazịrị na mmemme ahụ wee nye Kọmishọna Obiekezie onyinye nkwanyeùgwù site n'aka ngalaba ndị ntorobịa nke òtù ahụ jikọtara ndị ọrụ ugbo na steeti ahụ, nke ọ bụ onyeisi ha, bụ Maazị Chisom Onugha nyefèrè ya n'aha ndị òtù ahụ, maka nkwàdo dị iche iche o nyere ha n'oge ịkọ ọrụ ugbo nke ahọ a.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484