Ndị Enugwu-Ukwu Emeela Emume Ịgụ Arọ

Jan 14, 2022 - 21:57
 0
Ndị Enugwu-Ukwu Emeela Emume Ịgụ Arọ

Izunna Okafor dere akụkọ a


Ọ bụnnọọ emume 'ụwa bịa kirie' dịka ndị obodo Enugwu-Ukwu dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Njikọka nke steeti Anambra nọrọ na nsonso a wee merùbé otu n'ime nnukwu emume pụrụ iche e jiri mara obodo ahụ, bụ emume Ịgụ Arọ.

Ya bụ emume Ịgụ Arọ bụ àgbà nke iri isii na anọ ya (64th) a na-eme n'obodo ahụ kemgbe e jiri malite ya, ma bụrụkwa àgbà nke iri na otu (eleventh) nke eze ọdịnala obodo ahụ ugbua, bụ Igwe Ralph Ekpeh megoro kemgbe o jiri banye n'ọkwa ọchịchị dịka eze ọdịnala obodo ahụ

Ya bụ nnukwu emume omenahọ wèèrè ọnọdụ n'Obu-Ụmụnri, ma bụrụkwa nke dọtara imirikiti ndị mmadụ sitere mpaghara ebe dị icheiche wee bịa, iji were anya ha gbara ekeresimesi. 
  
A nọrọ na mmemme ahụ wee gosipụta ịmamma nke ọnatarachi na omenala Igbo, ma nọrọkwa na ya bụ mmemme chie ụfọdụ ụmụafọ obodo ahụ echichi ọdịnala, nke  gụnyere onye nnọchianya ala Nigeria na mba Burundi, bụ Maazị Elijah Onyeagba, nakwà ọtụtụ ndị ọzọ, iji kelee ma gbàá ha ume maka ntụnye dị icheiche ha na-atụnye n'ịkwàlìtè mmepe obodo na ime ka aha obodo ahụ chawapụta.

N'okwu ya oge ọ na-awa ọjị na mmemme ahụ, eze ọdịnala Enugwu-Ukwu, bụ Igwe Ralph Ekpeh kọwàrà na emume Ịgụ Arọ bụ otu n'ime ụzọ obodo ahụ si enye Chineke ekele maka ahọ gwụrụ agwụ, kpeere Ya maka ahọ ọhụrụ na ahọ kacha mma n'ọdịnihu, gosipụtárá ụwa omenala obodo ahụ, ma nyekwa nkwanyeugwu nyegara ndị dị icheiche tụnyegoro ụtụ pụrụ iche n'ịkwàlite mmepe obodo ahụ. 

Ọ sịkwa na ha na-anọ na mmemme ahụ na-ekele Chineke maka ngọzị ya n'isi ụmụafọ Enugwu-Ukwu, ma na-arịọkwa ezi ihe n'isi obodo ahụ.

N'okwu ha gwara ndị nta akụkọ na mmemme ahụ, onye na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo Njikọka nke mbụ n'ụlọ omeiwu steeti Anambra, bụ Maazị Timothy Ifedioramma; na onyeisi ọchịchị obodo ahụ, bụ Maazị Bonny Ozonkwuaku kwupụtara mkpà ọ dị ka ndị Igbo na-egosipụta njirimara ha ma kwụdosie ike n'omenala ha dịka Ndị Igbo, jirikwa ha na-eme ngala, n'ihi na ọ bụ njirimara onye na-akọwa ebe onye si.

N'aka nke ya, otu onye n'ime ndị e chiri echichi ọdịnala ụbọchị ahụ ma bụrụkwa onyeisi ụlọọrụ Lynden Farms nàkwà onyeisi ụlọọrụ -P Infrastructure, bụ Dọkịta Clem Nwogbo, onye e chibere echichi ụbọchị ahụ dịka ‘Akudo Enugwu-Ukwu na Ụmụnri’ gosipụtàrà obiañụrị ya maka nke ahụ, kwupụta ịhụnanya na ezi mmasị o nwere n'ihe gbasaara omenala Igbo, ma kelekwazie ndị Enugwu-Ukwu maka ịhụta ya dịka onye kwesiri ekwesi inye nkwanyeugwu ahụ pụrụ iche. 

Dịka ọ na-akọwa echichi ọdịnala ahụ e nyere ya dịka nnukwu ihe agbamume, o kwupụtazịkwara mkpebi ya ịga n'ihu na-arụ ezi ọrụ ma na-emekwa ihe dị icheiche ga na-akwàlite mmepe obodo na ọdịmma ụmụ mmadụ, dịka o si eme na mbụ.

Ọtụtụ ndị ọzọ sonyere na mmemme ahụ gụnyere onyeisioche otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'All Progressives Grand Alliance, APGA', bụ Ọzọmkpụ Victor Oye; onye nọchitebụrụ anya ọgbọ nta nkwàdo Anambra Etiti n'ụlọ omeiwu Sinet, bụ Chiifu Victor Umeh; onye na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo Idemili North na South n'ụlọ nnọchianya etiti, bụ Maazị Obinna Chidoka; Kọmishọna na-ahụ maka ewumewu ụlọ na steeti Anambra, bụ Maazị Michael Okonkwo; onyeisi ụlọọrụ 'Anambra Broadcasting Service, ABS', Dọkịta Uche Nworah; nnukwu onye ndụmọdụ pụrụ iche nye Gọvanọ Obiano n'ihe gbasaara nchekwa, bụ 'Retired Air Vice Marshall Ben Chiobi', tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484