Onyeisi Ndị Uweojii Ọhụrụ Awụchaala Na Mpaghara Zone 13

Jun 3, 2021 - 20:27
 0
Onyeisi Ndị Uweojii Ọhụrụ Awụchaala Na Mpaghara Zone 13

Izunna Okafor dere akụkọ a

Onyeisi ndị uweojii ọhụrụ nọrọ na nsonso a wee wụchaa na mpaghara isi ụlọọrụ uweojii 'Zone 13' dị n'Ukpo, na steeti Anambra, maka iwèghara ọrụ nhàzi mpaghara ahụ.

Onyeisi uweojii ahụ, bụ AIG Garba Mukaddas, bụ onye bịara ka ọ gachara mkpụrụ ọnwa olenaole isi ụlọọrụ uweojii ahụ nọrọ n'enweghị onyeisi nọ n'ebe ahụ kpọmkwem elekọta ya.

Ngwangwa ọ wụchàrà na steeti ahụ, ya bụ onyeisi uweojii gara kpọtụrụ aka na-achị Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ na be ya dị n'Agụleri, n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Anambra East', bụ ebe ha abụọ nọrọ wee kọwaa ma mara onwe ha nke ọma.

Nzukọ nkọwaonwe ahụ bụkwà nke ha nọrọ na ya wee wee mkparịtaụka banyere ọnọdụ nchekwa steeti ahụ, nà mpaghara 'Zone 13' niile n'ozuzuoke, ma tụọ árò banyere etu ha a ga-esi wee kwalitekwuo ezi nchekwa n'ebe ahụ.

N'okwu ya n'ebe ahụ, AIG Mukaddas kèlèrè aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ maka ezigbo nnabàta o nyere ya, ma kwe nkwà na ọ ga-eji ahụmahụ na ọgụgụisi ya wee rụọ ọrụ ya nke ọma iji chụọ mpụ na arụrụala ọsọ ụkwụ eru ala na steeti ahụ na mpaghara ahụ.

O kwekwara nkwà na a ga-enwe ezi njikọaka n'etiti ụlọọrụ ya, gọọmentị na ọhaneze, iji wee nweta ezi mpụtara bụ ịgbà, maka na ọ na-abụ a nyụkọọ mamịrị ọnụ, ọ gbọọ ụfụfụ. 

N'okwu nke ya, Gọvanọ Willie Obianọ nyere nkọwa banyere etu ọnọdụ nchekwa siri gbata kwụrụ na steeti ahụ, ma kọwaa ụfọdụ ihe dị iche iche ọchịchị ya megoro na ezi mbọ ọ gbagoro iji kwàlite nchekwa zuru òkè na steeti ahụ kemgbe o siri bata n'ọkwa ọchịchị. 

O kwezịrị nkwà na a ga-enwe ezi njikọaka na mmekọrịta n'etiti gọọmentị ya na AIG Mukaddas na ụlọọrụ ya, dịka ya na ụlọọrụ nchekwa na ndịisi ọrụ nchekwa dị iche iche na steeti ahụ si enwe ya kemgbe ọ batara n'ọkwa ọchịchị, ọbụla dịka o kwere nkwà ịga n'ihu n'inye ndị Anambra ezi nchekwa bụ ọkachamma.

Gọvanọ Obianọ nọkwazịrị n'ebe ahụ wee nye onyeisi ndị uweojii ahụ onyinye omarịcha ụgbọala ọhụrụ, iji kwàlite arụmọrụ ya nà mgbagharị ya.

AIG Mukaddas gụrụ akwụkwọ na mahadum Usman DanFodio dị na Sokoto, ma bụrụ onye rụgoro ọrụ n'ọtụtụ steeti dị iche iche na mpaghara ala Nigeria dịka onye uweojii, wee ruzie ugbua ọ bịara Anambra iwèghàrà ọnọdụ dịka onyeisi mpaghara 'Zone 13'. Ọ bụkwa onye nwetagoro mmụta na ọzụzụ dị iche iche n'ala Nigeria na na mba ofèsi.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484