N'Awa, Igwe Ezue Agbaala Ọfala Mbụ Ya

Jan 13, 2022 - 17:09
 0
N'Awa, Igwe Ezue Agbaala Ọfala Mbụ Ya

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọ kpọtụrụ akpọtụ ma zụọ azụọ na nsonso a dịka eze ọdịnala obodo Awa, dị n'okpuruọchịchị ime obodo 'Orumba North' nke steeti Anambra, bụ Igwe Israel Ezue mere mmemme Ịgba Ọfala nke mbụ ya dịka eze ọdịnala obodo ahụ.

Ya bụ oke mmemme wééré ọnọdụ n'obi eze ọdịnala ahụ bụkwa emume Ịgba Ọfala nke mbụ a na-eme n'obodo ahụ kemgbe okike ya, maka na o nwebeghị eze ọdịnala ọbụla gbara ọfala n'obodo ahụ.

Ya bụ nnukwu mmemme ịgba ọfala dọtàkwàrà ọtụtụ ụmụafọ obodo ahụ sitere mpaghara ógbè iri na abụọ mejupụtara obodo ahụ, nà ọtụtụ mmadụ ndị ọzọ siri ebe dị icheiche wee bịa, nke gụnyere ndị ọrụ ụka, ndị eze ọdịnala, ndị ọrụ gọọmenti, ndịisi ụlọọrụ nnọrọonwe dị icheiche, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ; ma bụrụkwa nke a nọrọ na ya wee gosipụta ebube nke omenala obodo ahụ nà ịmamma nke ọnatarachi na omenala ndị Igbo n'uju.

Na mmalite mmemme ahụ, Igwe Ezue na nwunye ya, bụ Oriakụ Ọgọchukwu Ezue (ndị jiri ejiji echichi ha), tinyere ndị ichie, ndị okenye na ntorobịa obodo ahụ jìrì egwu Uvie na ọñụ wee gagharịa gburugburu obodo ahụ, ma na-ekelekwa Chineke maka imezupụtara ha ọchịchọ obi ha n'ebe eze ọdịnala obodo ahụ nọ.

N'okwu ya n'ebe ahụ, Igwe Ezue kèlere Chineke maka amara na ngọzị Ya n'isi ya onwe ya, n'isi ụmụafọ obodo ahụ, na n'isi obodo ahụ, ma kwupụtanwòó nkwenye ya na ọchịchị ya ga-eme ka udo dị n'obodo ahụ ugbua guzosie ike, ma kwàlite ezi mmekọrịta na ịdịnotu, ọbụladị dịka o kelekwàra ụmụafọ obodo ahụ maka ezi ntụkwasịobi ha nwere na ya nà nkwàdo ha na-enye ya.

Ọ dụkwazịrị onye ọbụla ka o tinye aka n'ọrụ ịkwalite udo na ịdịnotu n'obodo ahụ, iji kwàlite ezi mmepe tọrọ n'obodo ahụ, maka na ọ bụ ebe udo dị ka ọganihu na-adị.

Na ntụnye nke ha n'ótù n'ótù, Onowu obodo ahụ, bụ Ọkammụta Obiajulu Obiekezie, na onyeisi ọchịchị obodo ahụ, bụ Dọkịta Raymond Ofor mere ka a mara na ọ bụ udo bụ isi sekpụ ntị n'ọganihu na mmepe obodo ọbụla, ma rịọkwazie ụmụafọ obodo ahụ ka ha nyere eze ọdịnala ahụ aka imezupụta ezi ebumnobi ya n'obodo ahụ, site n'inye ya nkwàdó kwesiri ekwesi na ịza ya mgbe ọbụla ọ kpọrọ ha.

N'okwu nke ha, onyeisioche otu jikọtara ndị eze ọdịnala n'Orumba North' ma bụrụkwa eze ọdịnala obodo Nanka, bụ Igwe Godwin Ezeilo; na otu onye n'ime ndị ichie n'obodo Awa, bụ Chiifu Okwuchukwu Okafor kọwàrà Igwe Ezue dịka nwoke jupụtara n'amamihe, bụkwa nke ọ na-etinye n'ọrụ n'ọchịchị obodo ahụ, ọbụladị dịka ha kpere ka Chineke gaa n'ihu ichekwaba, ịgọzi na inye ya amamihe, iji wee duruo obodo ahụ n'ala e kwere na nkwà.

Mmemme ahụ bụkwa nke e jiri àjà maasị pụrụ iche wee malite, nke Bishọp Peter Okpaleke nke Dayọsis Ekwulọbịa, na Bishọp Jonas-Benson Okoye nke ụka Katọlik na Dayọsis Nnewi nọrọ na ya wee kelee Chineke maka obodo ahụ na eze ọdịnala ya, rịọ ya bụ eze ọdịnala ka ọ gharakwa ịgbakụta ndị ọ na-achị azụ, ma rịọkwazie ọhaneze obodo ahụ ka ha nye ya bụ eze ọdịnala nkwado zuru òkè..

Ndị ọzọ sonyekwara na mmemme ahụ gụnyere osote onye ndu ndị kacha n'ụlọ omeiwu steeti Anambra, bụ Maazị Emeka Aforka; onyeisioche okpuru ọchịchị ime obodo 'Orumba North', bụ Oriakụ Ify Obinabo; onye e ji ọrụ obiebere na inyere ndị mmadụ aka wee mara, bụ Chiifu Chieloka Agbasimelo; tinyere ọtụtụ ndị ọzọ e ji okwu ha agba izu.

A nọkwara na mmemme ahụ wee kpeere Igwe Ezue ekpere pụrụ iche site n'aka Bishọp Paulinus Ezeokafor nke ụka Katọlik na Dayọsis Awka; nọrọkwa na ya bụ mmemme nye ndị ichie obodo ahụ asambodo, chie ụfọdụ ụmụafọ obodo ahụ na ndị sitere ebe dị icheiche echichi ọdịnala; gbaa egwu ọdịnala, mee ihe ngosi ndị ọzọ dị icheiche; ma tụkwara eze ọdịnala ahụ, bụ Igwe Ezue mmamma, site n'aka ọtụtụ mmadụ bịara mmemme ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484