Ndị Anambra Bi n'Enugu Ekwena Nkwa Ịkwado Obiano Nke Ugboro Abụọ

Ndị Anambra Bi n'Enugu Ekwena Nkwa Ịkwado Obiano Nke Ugboro Abụọ

Izunna Okafor, Awka, Nigeria

Otu jikọtara ndị Anambra bi na steeti Enugu ekwunwona nkwado ha nye ọchịchị gọvanọ Willie Obianọ maka ịchị nke ugboro abụọ. Ndị otu a kwuputara nke a mgbeṅosote aka na-achị steetiṅAnambra bụ Dọkịnta Nkem Okeke nabatara ndị isi otu ahụ a maara dịka 'Anambra State Peoples' Assembly' (ASPA), ngalaba nke Enugu, n'aha Gọvanọ Obianọ.

Otu jikọtara ndị Anambra bi na steeti Enugu ekwunwona nkwado ha nye ọchịchị gọvanọ Willie Obianọ maka ịchị nke ugboro abụọ.

Ndị otu a kwuputara nke a mgbeṅosote aka na-achị steetiṅAnambra bụ Dọkịnta Nkem Okeke nabatara ndị isi otu ahụ a maara dịka 'Anambra State Peoples' Assembly' (ASPA), ngalaba nke Enugu, n'aha Gọvanọ Obianọ.

Ka ọ na-anabata ndị ahụ  n'obi gọọmenti dị n'Awka, Dọkịnta Okeke kwuru hoohaa na iwepụta gọvanọ site na mpaghara na mpaghara na steeti ahụ so n'otuṅụzọ e si akwalite ezi ọchịchị na udo tọrọ atọ.