Gọọmenti Anambra Ebidola Ịkọchasị Ọwammiri Sụchiri Asụchi n'Awka

Apr 21, 2022 - 13:44
 0
Gọọmenti Anambra Ebidola Ịkọchasị Ọwammiri Sụchiri Asụchi n'Awka

Izunna Okafor dere akụkọ a

N'ịga n'ihu n'ezi ebumnobi ya ikpocha gburugburu Anambra steeti ka ọ chawapụ, ọchịchị steeti Anambra amalitela ịkọchasị ọwammiri dị icheiche sụchisiri asụchi na gburugburu Awka bụ isi obodo steeti ahụ.

Ọ dị ncheta na aka na-achị steeti ahụ, bụ Ọkammụta Chukwuma Soludo nọbụrụ n'ime izuụka olenaole gara aga wee gbapee amụmà mkpocha na nzacha pụrụ iche n'Okpoko dị n'okpuruọchịchị ime obodo Ogbaru, mpaghara Onitsha na gburugburu ya. 

Ya bụ Gọvanọ na osote ya bụ Dọkịta Onyekachi Ibezim nọkwàrà na nsonso a wee malite ịga njem nleta ọrụ na mpaghara ebe ahụ iji mara ka ya bụ ọrụ mkpocha na nzacha si aga, bụkwazị njem ha nọrọ na ya wee gbatịwanyekwuo oge na ebe a ga-eme ya bụ mkpocha na nzacha, iji hụ na e nwere mkpocha na nzacga zuru oke na gburugburu niile nke steeti ahụ.

Ọ bụzị n'ịgbaso nke a ka Awka bụ isi obodo steeti ahụ jizị eketa òkè mkpocha na nzacha nke ya ugbua, dịka ọrụ ịkọchasị ọwammiri malitere n'ozuzuoke na gburugburu isi obodo ahụ ụbọchị Mọnde.

Oge onye ntaakụkọ a gagharịrị ileta ka ya bụ ọrụ si aga ụbọchị Tuzdee, ọ chọpụtara na ọwammiri ahụ dị na mpaghara okporoụzọ Oby Okoli, nke siri mpaghara njikọụzọ ‘Y-Junction’ dị n'Okpuno Awka wee togide pụta na mpaghara njikọụzụ ‘UNIZIK Junction’ bụ nke sụchiri asụchi kemgbe; mana a kọ̀chaala ma mepee ya ugbua n'usoro ọrụ mkpocha na nzacha ahụ na-aga n'ihu.

Ọ chọpụtakwara na a na-egwupụtasị ụdị unyi dịgasị icheiche n'ime ọwàmmiri ahụ, nke gụnyere àkpà atịtị juru na ya, ìtè igwe, ákwà kara nka, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ, nke mezịrị ka ebe ahụ niile na-esi isi.

A hụkwara ka ndị nwere ọdụ ahịa na ndị bi na mpaghara ebe ahụ pụtasịrị kwụrụ, gbanye aka n'ukwu ma na-ele ka ya bụ ọrụ si aga, n'ihi na ụdị ihe dị icheiche a na-egwupụtasị ebe ahụ juru ha anya.

N'okwu ha n'ótù n'ótù oge a gbara ha ajụjụọnụ, ụfọdụ n'ime ndị ahụ nwere ebe obibi na ọdụ ahịa na mpaghara ahụ, bụ Maazị Williams Okeke na Oriakụ Chinyere Onuorah kelere Gọvanọ Soludo na ụlọọrụ na-ahụ maka gburugburu na steeti ahụ maka ime ka ya bụ ọrụ rute ebe ahụ, maka na oteela ha jiri tụba anya mgbataọsọ gọọmenti na mpaghara ahụ, ọkachasị n'ihi mkpamkpa dị icheiche ijummiri na-akpa na mpaghara ahụ, ọkachasị oge ọbụla mmiri zoro.

N'okwu nke ya oge a kpọtụụrụ ya, Kọmishọna na-ahụ maka Gburugburu na steeti ahụ, bụ Injinia Felix Odimegwu kwuru na nke ahụ bụ nke gbasòrò ma dabakwa adaba n'ebumnobi na njikere ọchịchị Gọvanọ Soludo iguzobe ọnọdụ gburugburu bụ ịgbà na steeti ahụ, ya na ime ka steeti ahụ chawapụ ma tọkwa ụtọ obibi.

O chetekwazị̀ị̀rị̀ ndị Anambra na oge udummiri awụchiela, bụ oge ijummiri ji emekarị mkpamkpa dị egwu; ma dụkwazie ha ọdụ ka ha nyere gọọmenti aka n'ọrụ ịkwalite ezi ọnọdụ gburugburu site n'idebe gburugburu ha ọcha na izèrè ịtụnyesi ihe n'ọwammiri, ịrụchi maọbụ ịrụkwàsà ihe n'elu ebe ọwammiri gara, maọbụkwanụ ihe ọbụla bụ imetọ gburugburu n'ụdị n'ụdị ọbụla; maka na nke ahụ ga-abụ ịdọghachi aka elekere azụ n'ezi ọrụ ahụ gọọmenti ji n'aka ugbua.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484