N'Anambra, Kọmishọna Azọpụtala Mmadụ Abụọ Nwere Nsogbu Ụbụrụ

Jun 4, 2020 - 00:52
Jan 22, 2021 - 20:24
 0
N'Anambra, Kọmishọna Azọpụtala Mmadụ Abụọ Nwere Nsogbu Ụbụrụ

Izunna Okafor, Awka

Ndị Igbo sị na omere onye o ribidoro na-emere chi kere ya. Ka ọ dị taa, Kọmishọna steeti Anambra na-ahụ maka ihe metụtara ụmụaka na ndị nne bụ Oriakụ Ndidi Mezue azọpụtala mmadụ abụọ nwere nsogbu ụbụrụ na mpaghara ebe dị iche iche n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ.

Mmadụ abụọ a bụ ndị e jidere oge Kọmishọna ahụ na ndị òtù ọrụ ya na-agagharị n'ụfọdụ ebe dị iche iche na steeti ahụ na-achọ ndị nwere nsogbu ụbụrụ na-adị akwụgharị n'okporo ụzọ dị iche iche. Nke ahụ bụ n'ịgbaso ntụziaka Gọvanọ Willie Obianọ nyere ka a chọgharịa, jide ma buru ndị ndị niile nwere nsogbu ụbụrụ gaa n'ebe a ga-enye ha ọgwụgwọ.

Otu ọ dị, a hụrụ ma jide otu onye n'ime mmadụ abụọ ahụ n'okporo ụzọ 'Club Road' dị n'Awka (bụ nke a mabụ dịka 'Abakaliki Street); ma jide onye nke ọzọ n'Aroma dịkwa n'Awka.

E burukwazịrị ha gaa ebe a na-enye ndị nwere nsogbu ụbụrụ ọgwụgwọ na Nteje, dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Oyi, bụ ebe a ga-anọ lekọta ha anya ma nyekwa ha ọgwụgwọ tupu e jikọọ ha ndị ezinụlọ ha ọzọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.