Ndị Uweojii Anwụchiela Mmadụ Abụọ Siri Ibadan Gaa Ohi n'Ogun

Jul 26, 2021 - 21:48
Jul 26, 2021 - 21:55
 0
Ndị Uweojii Anwụchiela Mmadụ Abụọ Siri Ibadan Gaa Ohi n'Ogun

Izunna Okafor dere akụkọ a


Ndị uweojii steeti Ogun anwụchiela mmadụ abụọ a na-enyo ènyò na ha bụ ndị ojiegbe na ndị ohi na-eyi obodo egwù n'ụdị dị iche iche.

Ndị ohi ahụ bụ ndị a nwụchikọrọ oge ha gara izu ohi n'ogige 'OPIC Estate' dị n'Agbara, n'okpuru ọchịchị ime obodo Ado-Odo/Ota nke steeti ahụ. 

N'okwu ya oge ọ na-eme ka ndị nta akụkọ mara nke a, onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti ahụ, bụ Maazị Abimbola Oyeyemi kpọpụtasịrị aha ndị ahụ dịka Maazị Olanrewaju Sikiru (gbara ahọ iri abụọ na asatọ) na Maazị Olayemi Obisesan (gbara ahọ iri abụọ na ise).

Ọ kọwara na a nwụchiri ndị ahụ oge onyeisi ndị uweojii na mpaghara isi ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Agbara, bụ SP Saleh Dahiru nwètèchàrà òkù ekwentị mberede mgbe o jiri ọkara gata elekere mbụ nke ime abalị, bụ òkù e sitere na ya wee gwa ya na ndị ohi ji égbè wakpòrò ma na-ezukwa ohi n'ogigè 'OPIC Estate, Agbara' ma na-eyikwazị ndị bi na mpaghara ahụ égwù.

O kwuru na nke ahụ mezịrị ka ndị uweojii ahụ hazie onwe ha ozigbo ma gbara gaba ebe ahụ ya bụ ihe na-eme.

Ọ gara n'ihu kọwaa na ngwangwa ndị ohi ahụ hụrụ ndị uweojii ahụ, na ha kwụghepuru égbè ozigbo, gbaba ha; ha bụ ndị uweojii wee kwụdosie ike ma buso ha agha dị égwù.

O mekwàzịrị ka a mara na oge ha kwàchàrà mgbọ ahụ, na ha jidere mmadụ abụọ n'ime ndị ohi ahụ na ndụ, bụ ndị bukọsị ụdị àpà mgbọ dị iche iche n'ahụ, ebe ụfọdụ ndị ọzọ bukwàzịrị àpà mgbọ nke ha wee rie mbọmbọ ọsọ.

Oge a na-agba ha ajụjụọnụ, ndị ohi ahụ kwùrù na ọ bụ na Lalupon dị na mpaghara Ibadan nke steeti Oyo ka ha siri wee bịa ọrụ ohi n'ebe ahụ, bụ ebe ndị òtù ha nọkwà gidigbam wee na-eche ha maka ya bụ ọrụ a kàrá àkà.

Ihe dị iche iche e nwetesiri n'aka ndị ohi ahụ gụnyèrè nsụsụ egbe abụọ nwere ọnụ abụọ, mgbọ egbe dị iri na abụọ, okpokoro mgbọ egbe abụọ a gbagoro agba, ígwè kọmputa laptọọpụ abụọ, ekwentị ruru iri na asatọ n'ọnụọgụgụ, ego dị puku naịra iri na anọ na naịra iri, na otu ọgbatumtum Bajaj nwere akara DGB 411 VY.

N'okwu ya banyere nke ahụ, onyeisi ndị uweojii na steeti ahụ, bụ Maazị Edward Ajogun kèlèrè ndị ọrụ ya maka ezi ọrụ ha na nkwụdosike ha, ma nye ntụziaka ka a chọọ ma nwụchikọọ ndị ohi ndị nke ahụ gbara ọsọ; ọbụladị dịka o nyegasịkwara ụlọọgwụ ntụziaka ka ha nye ha mkpesa banyere onye ọbụla nwere ihe dịka àpà mgbọ e butere n'ụlọọgwụ ha maka inye ya ọgwụgwụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484