N'Ogun, E Jidela Nwaanyị Dunyere Ndị Mmadụ Ka Ha Tọrọ Di Ya, Maka Na Ọ Bụ Erieri

Nov 8, 2021 - 22:55
 0
N'Ogun, E Jidela Nwaanyị Dunyere Ndị Mmadụ Ka Ha Tọrọ Di Ya, Maka Na Ọ Bụ Erieri

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ndị uweojii n'ime steeti Ogun anwụchiela otu nwaanyị, bụ Memunat Salaudeen maka ịkwụ ndị mmadụ ụgwọ ka ha gaa tọrọ di ya, ka e wee napụta ha ego.

Nwaanyị ahụ bụ onye a nwụchikọrọ ụbọchị Mọnde, ya na ụmụnwoke atọ ahụ ọ kwụrụ ụgwọ ka ha tọrọ di ya, nke gụnyere Maazị Olayinka Lawal, Asungba Nura and Usman Oluwatoyin.

N'okwu ya banyere nke ahụ, onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii n'ime steeti ahụ, bụ Abimbola Oyeyemi kọwara na ọ bụ oge o jiri ọkara gata elekere isii nke uhuruchi ụbọchị Mọnde ka e jidere ndị ahụ na mpaghara okporouzụ Papa gaa Itori; ma kọwaa na ndị ọrụ uweojii ahụ nwụchiri ndị ahụ oge ha bu ọgbaatumtum, n'ihi na ha dị ka ndị a na-enyo ènyò.

O kwuru na ndị uweojii ahụ jidekwara ha, kpọsàá ha, ma gbaa ha ajụjụọnụ n'otu n'otu banyere ihe ha na-eme na mpaghara ahụ, ya na ihe mere ha jiri jide mmà na eiri.

Ọ bụzị oge a na-agba ha ajụjụọnụ ka ha nọrọ wee sàá asịsà na nwaanyị ahụ kwụrụ ha naanị puku naịra asatọ (N8000) ka ha wee gote mma na eriri siri ike iji wee kedo mmadụ. 

Ha kwukwara na nwaanyị ahụ gwara ha gaa chere ya n'otu ebe, na ọ ga-akpọ di ya bịa n'ebe ahụ, ka ha wee tọrọ ya ma napụtakwa ya ego tupu tọhapụ ya. Ha sị na nwaanyị ahụ gwara ha na di ya bụ erieri, tinyekwuoro na ọ bụ naanị ụzọ dị etu ahụ ka a pụrụ isi napụta ya ego, maka na ọ bụ aka chịchịchị.

N'okwu nke ya oge a nwụchikọrọ ma gbaa ya ajụjụọnụ, nwaayị ahụ, onye sịkwa na ọ bụ onye ọrụ nọọsụ, kwetere n'ezie na ọ bụ ya kpara nkàtà niile ahụ, ma kwuo na o mere ihe ahụ iji napụta ya ego 

Ka ọ dị ugbua, onyeisi ndị uweojii na steeti Ogun, bụ CP Lanre Bankole enyela ntụziaka ka e nyefèé  okwu ahụ n'aka ngalaba na-ahụ maka ịtọrọ mmadụ, ka e wee mee nnyocha miri èmi banyere ya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484