Isuọfịa Echiela Soludo Dikeudo Isuọfịa

Aug 19, 2021 - 23:33
 0
Isuọfịa Echiela Soludo Dikeudo Isuọfịa

Izunna Okafor dere akụkọ a

Igbo sị na echichi na-ekwesi ekwesi, ma sịkwa na ọ na-abụ oke mmadụ nwee echichi, ọha mmụọ na ọha mmadụ amara aha echichi ya.

Obodo juru kpụmkpụm n'ọnụ na nsonso a n'Isuọfịa dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Agụata nke steeti Anambra, dịka eze, ndị ndu na ọhaneze obodo ahụ gbàkọrọ aka wee chie Ọkammụta Chukwuma Charles Soludo echichi ọdịnala dịka 'Dikeudo Isuọfịa'.

Ọkammụta Chukwuma Soludo, onye bụ nwaafọ obodo Isuofia, bụ onye jiri ọkwa dịka Gọvanọ ọba ego izugbe ala Nigeria, bụ 'Central Bank of Nigeria (CBN)' n'oge mbụ, ma bụrụkwa onye ji aha otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'All Progressive Grand Alliance (APGA) apụta maka ịzọ ọkwa gọvanọ steeti Anambra na nhọpụta ahụ a ga-eme n'abalị isii nke ọnwa Nọvemba ahọ a.

N'okwu ya na mmemme ahụ, aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ kọwara Ọkammụta Soludo dịka nwoke nwere ezi ọgụgụisi, onye ma nke ekwe na-akụ nà onye nwere ihe a chọrọ ma tozukwa òkè ịnọchi ya dịka Gọvanọ steeti ahụ ma ọ chịchaa rịtuo n'ọkwa n'ahọ na-abịa abịa.

Ọ kọwara echichi ahụ e chiri nwa amadi ahụ dịka nke kwesiri ekwesi, kpọpụtasịa ihe dị iche iche o megoro, ma oge o ji ọkwa dịka onyeisi ọba ego CBN, ọbụladị dịka ọ kpọkuru ya ka o jisie ike n'ezi ọrụ ya. Ọ kpọkukwàzịrị ọhaneze ka ha nye APGA nkwàdo dị ukwuu ná nhọpụta ọchịchị ahụ a ga-eme, maka na ọchịchị APGA dị Anambra ahụ mma.

Na mbụ n'okwu ya oge ọ na-echi Ọkammụta Soludo echichi ahụ, eze ọdịnala obodo Isuofia, bụ Igwe Christopher Moghalu mere ka a mara na ya bụ nwa amadi emeela ihe dike dara ụda n'ala Nigeria na na mba ụwa, ma tubekwa obodo ahụ ùgò n'ọtụtụ ụzọ dị iche iche, bụkwazị nke mere ha jiri hụta ya dịka ihe kwesiri ekwesi ichibe ya ọmarịcha echichi ahụ.

O kelekwara Gọvanọ Obianọ maka nnukwu ihe dị iche iche o megoro n'obodo ahụ, ya na nkwàdo ahụ ọ na-enye nwa ha nwoke bụ Soludo dịka onye ga-anọchi ya; ọbụladị dịka o kwuru hoohaa na Isuọfịa niile kwụ ya n'azụ. O kpekwazịịrị Ọkammụta Soludo ekpere, kwe ya nkwà nkwàdo, ma kwupụtakwa olileanya o nwere na ọ ga-enwete mmeri na njem ahụ ọ na-abagide, kpekwa ka Chineke nọnyere ya.

Na nzaghachi oge ọ natachara nkwanyeugwu ahụ, Ọkammụta Soludo kelere ndị obodo ahụ, Gọvanọ Obianọ na onye ọbụla sonyere maọbụ nye aka n'otu ụzọ maọbụ nke ọzọ iji hụ na mmemme ahụ gara nke ọma.

Ka ọ na-ekele ndị obodo ya maka ịhụta ya dịka onye tozuru òkè maka nnukwu nkwanyeùgwù ahụ, ọ kọwakwazịrị echichi ọdịnala ahụ dịka nnukwu ihe ịgbà ume nyegara ya, ma kwe nkwa na ọ gaghị agharịpụ Ndị Anambra, kpọkwazie òkù ka onye ọbụla kwàdo ya na njem ahụ.

Nwunye Gọvanọ Obianọ bụ Oriakụ Ebelechukwu Obianọ, ndịisi ọchịchị gọọmenti steeti Anambra, na ọtụtụ ndị ọzọ selitere isi na ngalaba dị iche iche sonyekwara na mmemme ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484