Ndị Enugwu-Ukwu Ejiri Ọñụ Mee Emume Ịgụ Arọ

Jan 19, 2021 - 00:22
Jan 21, 2021 - 18:21
 0
Ndị Enugwu-Ukwu Ejiri Ọñụ Mee Emume Ịgụ Arọ

By Izunna Okafor

O kwòrò ekwò ma hịọ ahịọọ na nsonso a n'obodo Enugwu-Ukwu, dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Njikọka nke steeti Anambra, dịka ndị obodo ahụ merùbèrè Ịgụ Arọ Enugwu-Ukwu, àgbà nke iri isii na atọ ya.

Ya bụ mmemme a nọrọ na ya kpee ekpere pụrụ iche maka ahọ ọhụụ bụ àgbà nke iri nke eze ọdịnala obodo ahụ bụ Igwe Ralph Ekpeh na-emerube n'ime ahọ iri na otu o jiri banye n'ọkwa ọchịchị dịka eze ọdịnala obodo ahụ, ma bụrụkwa nke a nọrọ na ya wee kelee ụfọdụ ụmụafọ obodo ahụ maka ọrụ ọma dị iche iche ha na-arụ n'obodo ahụ, ọkachasị site n'inye ụfọdụ ụmụafọ obodo ahụ ohere agụmakwụkwọ n'efù, inye ha ọgwụgwọ n'efù, nakwa ịkwàdò ha, ọkachasị ndị ntorobịa, n'ụzọ dị iche iche, bụ nke megoro ka ya bụ obodo bụrụ ejiamaatụ.

N'okwu ya dịka ọ na-awa ọjị na mmemme ahụ, Igwe Ekpeh kèlèrè Chineke maka nchekwa na odudu ya n'ime ahọ gara aga ma kpee ka ụbara ngọzị Ya mụkwasị n'isi ụmụ mmadụ n'ime ahọ ọhụụ a.

O mere ka a mara na mmemme ahụ bụ mmemme kachasị emume ọdịnala niile a na-eme n'obodo ahụ, ma kpọọ òkù ezi njikọaka na nkwàdo iji kwàlite ma gosipụta ịma mma nke ọnatarachi na omenala Igbo n'ogoogo mba ụwa.

N'akụkụ nke ya, onyeisioche ọchịchị obodo ahụ, bụ Maazị Bonny Ozo Nkwuaku kọwàrà ya bụ emume dịka otu n'ime emume ọdịnala na-ejikọta ndị obodo Enugwu-Ukwu na Ụmụ Nri, ma kpee ka ọganihu na udo tọrọ àtọ gaa n'ihu ịchị n'obodo ahụ, ọbụladị dịka o kpere ka Chineke gaa n'ihu imejupụta eze ọdịnala obodo ahụ n'amamihe.

A nọrọ na mmemme ahụ wee chibe ụfọdụ ndị dị iche iche echichi ọdịnala, nke gụnyere Maazị Anthony Okoli-Aboh na Bob Ugonabo, bụkwa ndị kelere ya bụ obodo na ndị ndu ya maka echichi ahụ nakwa ịkwàdosi omenala Igbo ike.

Ndị dị iche iche sonyere na mmemme ahụ gụnyèrè aka chịrị steeti Anambra n'oge mbụ, bụ Maazị Peter Obi (nke ọ bụ Maazị Patrick Obi nọchitere anya ya); Bishọọpụ ụka Katọliiki na Dayọsiisi Awka, bụ Bishọọpụ Paulinus Ezeokafor; ndị eze ọdịnala obodo dị iche iche, ndị ọrụ gọọmenti, ndị ndu ụka dị iche iche, ndị ihe gbasaara omenala Igbo na-amasị, nakwa ọtụtụ ndị ọzọ sitere ebe dị iche iche wee bịa.

A nọrọ na ya bụ mmemme wee tie mmọnwụ, gbaa egwu ọdịnala, ma mekwa ihe ngosi dị iche iche mere ka ya bụ mmemme zaa aha a kpọrọ ya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.