Mmadụ Abụọ Anwụọla n'Ihe Mberede Okporoụzọ n'Anambra

Feb 27, 2022 - 18:14
 0
Mmadụ Abụọ Anwụọla n'Ihe Mberede Okporoụzọ n'Anambra

Izunna Okafor dere akụkọ a

Mmadụ abụọ anwụọla, ebe ụfọdụ ndị ọzọ nwètèkwàrà ihe mmerụahụ n'ogoogo dị icheiche, na nnukwu ihe mberede okporoụzọ dapụtàrà na steeti Anambra.

Dịka ozi a kụpụrụ site n'aka onye na-ahụ maka mmgbasaozi na ịkụziri ọhaneze ihe ha kwesiri ịma n'ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka ije awele n'okporoụzọ n'ala Nigeria, bụ ụlọọrụ ‘Federal Raad Safety Corps (FRSC)’, ngalaba steeti Anambra, bụ DRC Magaret B. Onabe siri kọwaa, ihe mberede okporoụzọ ahụ bụ nke dapụtara ụbọchị Mọnde.

Ọ kọwara na ihe mberede ahụ dapụtàrà na mpaghara Nawfia nke okporoụzọ awara-awara ahụ siri Enugu gaa Onitsha, ma bụrụkwa nke metụtara ụgbọala abụọ, nke gụnyere otu nnukwu ụgbọala gwongworo 911 e ji ebu ibu (nwere ákàrà AH367UWN), nà ụgbọala Toyota Highlander (nwere ákàrà ACA688PX).

Ọ gara n'ihu kọwaa na ihe mberede okporoụzọ ahụ mètụtàrà mmadụ anọ, ndị bụcha ụmụnwoke; mekwa ka a mara na mmadụ abụọ n'ime ha nwụrụ, ebe mmadụ abụọ ndị ọzọ nwetèkwàrà mmerụahụ n'ogoogo dị icheiche.

O mere ka a mara na ndị ọnọmgbeomere kọwàrà na ọ bụ ịgba oke ọsọ na ịgbafè n'ihu ụgbọala n'usoro na oge ekwesighị ekwesi kpàtàrà ihe mberede okporoụzọ ahụ.

Ọ kọwara na onye nke na-anyà ụgbọala Highlander ahụ chọrọ iji ọsọ gbafèé ụgbọala ọzọ nọ n'ihu ya, o wee danyeziere ụgbọala ọzọ, bụ ụgbọala gwongworo si n'akụkụ aka ekpe abịa abịa; ma mgbe onye na-anyà ụgbọala gwongworo ahụ na-achọzị ka o zèéré ya, o wee pụnahị ya n'aka, ma jiri akụkụ dàá, wee dagide mmadụ abụọ nọ n'ime ya oge ahụ, ha wee nwụọ ma tọkwa n'okpuru ya.

Ozu ndị ahụ tọkwàzịrị n'okpuru ụgbọala ahụ, wee ruo oge ndị ọrụ FRSC wụchàrà n'ebe ahụ wee nyekwazie aka n'ịchọ ka a ga-esi bupùte ozu ha, ya na ibupùsì ụgbọala ahụ n'ụzọ, iji gbochie inwe agbakata akwụrụ n'ebe ahụ.

Ojoko na ihe ndị ọzọ dịgasị n'ime ụgbọala ahụ wụfùsìkwàrà n'ala, ebe ụgbọala ahụ n'onwe ya tikwàrà gwòògwòò n'okporoụzọ ahụ ma mebisie.

N'okwu ya banyere ajọ ọdachi ahụ, onyeisi ụlọọrụ FRSC na steeti Anambra, bụ Maazị Adeoye Irelewuyi kasìri ezinụlọ ndị nke ha nwụrụ obi ma kpee ka Chineke nabata mkpụrụobi ha na ndokwa ma nyekwa ha ezumike udo.

Dịka ọ na-adụ ndị na-anya ihe ọnyịnya ka ha na-ebelata ịgba oke ọsọ, ọ kpọkukwàrà ha na-akpachapụ anya nke ọma, ma na-akpachàpụkwa anya oge ọbụla ha chọrọ ịgbafè ụgbọala ọzọ, iji hụ ohere dị n'okporoụzọ tupu ha agbafèé, iji gbanahị ụdị ihe ọdachi dị etu ahụ ọzọ n'ọdịnihu.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484