Inyere Ndị Mmadụ Aka Na-Atọ M Ụtọ —Oriakụ Obianọ

Oct 20, 2021 - 21:18
 0
Inyere Ndị Mmadụ Aka Na-Atọ M Ụtọ —Oriakụ Obianọ

Izunna Okafor dere akụkọ a


Oriakụ Ebelechukwu Obianọ, bụ nwunye aka na-achị steeti Anambra akọwaala inyere ndị ogbenye na ndị ọzọ ụwa na-atụ n'ọnụ aka dịka otu n'ime ụzọ o si agbasa oziọma ma na-etutekwa olileanya dara mbà.

Oriakụ Obianọ kwupụtara nke a oge ọ gara njem n'okpuruọchịchị ime obodo 'Nnewi South', Oyi na Dunukọfịa, bụ njem ọ na-abagide n'okpuruọchịchị ime obodo niile dị na steeti ahụ kwà ahọ ọbụla; ma bụrụkwa nke ọ na-anọ na ya wee na-enyere ndị ụwa na-atụ n'ọnụ aka, na-ekesara ha ihe oriri na ihe enyemaka ndị ọzọ dị icheiche.

Dịka o siri kọwaa n'ebe ahụ, ọ na-atọ ya obi ụtọ oge ọbụla o nyeere ndị mmadụ aka, maka na ọ na-enwe afọojuju na o meela ka ihu ọchị waa ndị ahụ, tute olileanya, maọbụ zọpụtakwa ndụ.

O kwuru na obi na-atọkwa ya ụtọ oge ọbụla o chetere ndị ụwa na-atụ n'ọnụ na etu ya na ha si anọkọrị kemgbe ọtụtụ ahọ gara aga, ma kwuo na anya ha ga-eme ya ma ọ bụrụ na oge ọchịchị di ya bịa na njedobe n'ime ọnwa olenaole na-abịa abịa. O kwere ha nkwà na ọ ga-aga n'ihu inye ha nkwàdo site n'okpuru atụmatụ ọrụ obiebere ya ahụ a maara dịka 'Caring Family Enhancement Initiative (CAFE)' ma ọ bụrụgodi na ọchịchị di ya bịa na njedobe.

Ka ọ na-ekwupụta olileanya o nwere na nwunye gọvanọ ọzọ ga-achị steeti ahụ ma di ya rịtuo n'ọkwa ga-ebidokwa ebe ya onwe ya kwụsịrị; Oriakụ Obianọ kpọkuzịkwara ndị Anambra ka ha kwàdo ma tụnyere otu ndọrọndọrọ  'All Progressive Grand Alliance (APGA)' na onye ahọ ji aha otu ndọrọndọrọ ahụ were azọ ọkwa gọvanọ steeti ahụ na nhọpụta ahụ a ga-eme n'abalị isii nke ọnwa Nọvemba ahọ a, n'ihi na nwa amadi ahụ bụ Ọkammụta Chukwuma Soludo tozuru oke ma nwekwa ihe a chọrọ iji kwàlitekwuo ọnọdụ mmepe steeti ahụ malite n'ebe Gọvanọ Obianọ ga-akwụsị.

N'okwu ha n'otu n'otu, Kọmishọna na-ahụ maka ọdịmma na ihe metụtara ụmụaka na ụmụnwaanyị, bụ Ndidi Mezue; Kọmishọna na-ahụ maka ahịa na azụmahịa, bụ Maazị Uchenna Okafor; onye na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo 'Nnewi South' nke mbụ n'ụlọ omeiwu steeti ahụ, bụ Maazị Sunny Ozobịalu kelere Oriakụ Obianọ maka ọmarịcha ọrụ ọ na-arụ na etu o siri kwee ka Chineke jiri ya na-akwara ngwaọrụ ma na-etinye ọchị n'ihu ụmụ mmadụ. Ha gbakwara akaebe na Oriakụ Obianọ emepụtela ọtụtụ ezi ihe site n'okpuru atụmatụ ọrụ obiebere ya ahụ, ma gbàá ya ume ka o jide ka o ji.

Na ntụnye nke ha n'otu n'otu, ndịisi oche nchere oge n'okpuruọchịchị ime obodo atọ ahụ, bụ Injinia Chieloka Okoye nke okpuruọchịchị 'Nnewi South'; Injinia Nnamdi Nwadiogbu nke okpuruọchịchị Oyi; na Maazị Emeka Chinweze nke okpuruọchịchị Dunukọfịa kọwara na ọrụ obiebere ahụ Oriakụ Obianọ na-arụ aghọọla nnukwu atụmatụ ma bụrụkwazie nke o si na ya achụ ụbịam ọsọ ụkwụ eru ala na ndụ ụmụ mmadụ.

Ha kpekwazịrị ka Chineke gaa n'ihu ịgba ya ume na ịkwụghachi ya mmaji kwuru mmaji.

A nọrọ na mmemme ahụ wee kesàá ihe oriri, ihe nkwàdo na ihe enyemaka dị icheiche nyegara ọtụtụ ndị ụwa na-atụ n'ọnụ, ndị ogbenye, ndị ọlụsị na ndị ọzọ ọnọdụ dịịrị añaa.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484