IPOB Abụghị Otu Iyi Egwu -- Ọhaneze Ndị Igbo

Sep 22, 2017 - 19:35
Jan 23, 2021 - 17:29
 0
IPOB Abụghị Otu Iyi Egwu -- Ọhaneze Ndị Igbo

Izunna Okafor, Awka

Otu Ọhaneze Ndị Igbo n'ala anyị akatọọna nkwuwa ahụ ndị ọrụ agha ala anyị kwuwara bụ nke sị na otu 'Indigenous People of Biafra' (IPOB) bụ otu iyi egwu, ma sị na nke ahụ adabaghị adaba chaa chaa. Ha jụrụ ya jụwapụ ya isi ma kwuo hoohaa na otu IPOB abụghị otu iyi egwu chaacha, ọkachasị dịka iwu siri kọwaa ihe bụ otu iyi egwu.

Otu Ọhaneze Ndị Igbo n'ala anyị akatọọna nkwuwa ahụ ndị ọrụ agha ala anyị kwuwara bụ nke sị na otu 'Indigenous People of Biafra' (IPOB) bụ otu iyi egwu, ma sị na nke ahụ adabaghị adaba chaa chaa. Ha jụrụ ya jụwapụ ya isi ma kwuo hoohaa na otu IPOB abụghị otu iyi egwu chaacha, ọkachasị dịka iwu siri kọwaa ihe bụ otu iyi egwu.

Otu ọ dị, ndị otu a kelere ndị gọvanọ ndịda-ọwụwa anyanwụ na mbọ ha dị iche iche iji welata ịkpọ ganị ganị na ihe egwu ndị ọzọ na mpaghara ahụ, ọkachasị mwakpo ahụ ndị ọrụ agha ala anyị wakporo ndị mpaghara ahụ. Ka ha nwechara nzukọ imeobi ha n'Enugu n'abalị gara aga, ndị otu a kwuru na ha kwụdooro ala Naịjiria ịdị n'otu, naanị ma e nwee nhazigharị ghe anya oghe, bụ nke ga-eweta ikpe nkwụmọtọ, nhatanha na ihe ziri ezi, maka na o doro ewu na ọkụkọ anya na ihe amaghị kwụrụ ugbu a.

N'ozi ọ gụpụtara, onyeisi izugbe nke otu ọhaneze ndị Igbo n'ụwa gbaa gburugburu bụ maazị Nnịa Nwodo katọrọ kpam kpam, akparamagwa na akụmakụ ndị ọrụ agha ala anyị na mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ ahụ, ma kpọkuo ha ka ha kwụsị nke ahụ ngwa ngwa ma kwakọrọ ngwo ngwo ha pụọ na mpaghara ahụ. Ndị otu ahụ kwuru na mgbe adịghị anya, na ha ga-enwe nzukọ pụrụ iche iji kwado ebumnobi nke nhazigharị ahụ a na-akpọ oku ya n'ala Naịjiria, ma sịkwa na ha na-akwado mkpebi niile nke otu jikọtara ndị ndu na mpaghara ọwụwa anyanwụ mere.

Ha kwuputanworo ọtụtụ mmegbu na mkpagbu dị iche iche a na-akpagbu ndị sitere mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ ala anyị ma sị na nke ahụ bụ nnọọ isi sekpụ ntị n'ịkpọ ganị ganị dị iche iche nke ndị otu na-akwado Biafra na-akpọ. Nke a bụ n'ihi na e mee nwata ka e mere ibe ya, obi adị ya mma. A sịkwa na nwata zọba oke ya, a sị na ọ gbara ajọ.

Ọtụtụ ndị ukwu ndị ukwu na ndị e ji okwu ha aga izu sonyere na mmemme gụnyere: onyeisi izugbe nke otu Ọhaneze ndị Igbo n'ala anyị bụ maazị Nnia Nwodo, osote onyeisi ụlọ ọgbakọ omebe iwu sineeti nke ala anyị bụ maazị Ike Ekweremadu, aka na-achị steeti Abịa bụ gọvanọ Okezie Ikpeazu, osote gọvanọ steeti Imo bụ maazị Eze Madumere, ogbo ya nke steeti Ebonyi bụ maazị kelechi Igwe, onyeisi izugbe nke Ọhaneze ndị Igbo n'ala anyị n'oge gara aga bụ maazị Joe Irukwu, ode akwụkwọ izugbe nkeṅotu ahụ n'oge mbụ, bụ maazị Joe Nworgu, onye jibụ ọkwa minista na-ahụ maka mgbasa ozi n'ala anyị, bụ maazị Walter Ọfọnagọrọ, aka chịbụrụ steeti Anambra n'oge gara aga, bụ maazị Chukwuemeka Ezeife, tinyete ọtụtụ ndị ọzọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.