Ijummiri Emeela Mkpamkpa na Germany

Jul 21, 2021 - 22:17
 0
Ijummiri Emeela Mkpamkpa na Germany

Izunna Okafor dere akụkọ a

Opekatampe, mmadụ ruru otu narị na iri isii anwụọla, ebe ndị mmadụ ndị ọzọ karịrị otu puku n'ọnụọgụgụ ka na-efùkwa èfù, ka mmiri dị oke egwu zòchàrà na nsonso a na mba Germany.

Ya bụ nnukwu mmiri zoro ka e kwuru na o jiri óké ìfùfè wee bịa ma gbákwá óké ijummiri na idèmmiri, bụkwazị nke tokpòrò ma buchara ọtụtụ ụgbọala na-agara onwe ha n'okporoụzọ, ya na ndị mmadụ nọgasị n'ime ha, wee sụnyesie ụfọdụ n'ime ha isi n'ụmị, burukwa ụfọdụ ga tụnye n'ebe ndị ọzọ dị iche iche.
 
Akụkọ kọkwara na ya bụ óké mmiri òzuzo na ifufè ya kwatusikwara ma bibisiekwa ọtụtụ ụlọ ndị mmadụ na mpaghara ebe dị iche iche, ọkachasị na mpaghara 'Schuld' na ná mpaghara steeti 'North Rhine-Westphalia'.

Ụfọdụ n'ime ndị ahụ nwụrụ ka e kwuru na ha gụnyèrè mmadụ atọ ndị ọrụ nsọnyụọkụ nà ụfọdụ ndị ọzọ ndị gara inye aka zọpụta ụfọdụ ndị mmadụ ajọ ọdachi ahụ dabidoro na mpaghara 'Altena' na mpaghara Werdohl-Elverlingsen; ha wee zute ọnwụ ike ha ebe ha na-azọ ndị ọzọ ndụ.

Akụkọ kọkwara na mmadụ ruru iri ise n'ọnụọgụgụ bụkwa ndị elu ụlọ ha dakwasịrị ma titọba ha n'ala na 'Koblenz' dị na mpaghara ọdịda anyanwụ mba ahụ. Ọ bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'ebe ahụ, bụ Maazị Ulrich Sopart mere ka a mara nke a.

Ndị uweojii mekwazịrị ka a mara na ọtụtụ ndị mmadụ ka na-efu efu ugbua, n'ihi na ijummiri wabàtàrà n'ime ụlọ ha, wee bukọrọ ha, nke na o nweghịzịkwa onye hụrụ ha anya ọzọ wee ruo taa.

Ha bụ ndị uweojii mekwazịrị ka a mara na a ka na-eme nnyocha banyere ya bụ mmiri, ihe so ya, nà mkpamkpa niile ahụ ọ kpara, iji nyere ọchịchị obodo ahụ aka ịma ihe ọzọ a ga-eme banyere ya bụ ọnọdụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484