Nwaanyị Otu Ụkwụ Ahụ Na-Ebugharịbụ Mmiri Na Lagos Egoola Ụlọelu Ọhụrụ

Jul 22, 2021 - 22:23
 0
Nwaanyị Otu Ụkwụ Ahụ Na-Ebugharịbụ Mmiri Na Lagos Egoola Ụlọelu Ọhụrụ

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ka ọ gachara ọnwa olenaole o nwetechara nkwàdo dị ukwu site n'aka ndị ọrụ obiebere na-amasị, nwata nwaanyị ahụ nwere otu ụkwụ ma bụrụkwa onye na-ebugharịbụ mmiri ọñụñụ na steeti Lagos, bụ Mary Daniel egoola nnukwu ụlọelu gburu ego ruru nde naịra iri na asaa na ụma ise (N17.5m) na steeti Lagos ahụ.

Daniel, bụ nwaafọ steeti Kogi, màlitere wùbé èwùbé ma bụrụkwa onye ọtụtụ mmadụ màlìtèrè ịgbatara ọsọ enyemaka, inye ego na inye nkwàdo dara ụdà oge foto ya gbasàrà n'usoro nzikọrịtaozi ọgbaraọhụrụ, na-egosi ebe o bù ótù ụkwụ ya fọrọ afọ ma jiri mkpọ na-ebugharị ma na-ere mmiri ọñụñụ n'okporoụzọ.

Ka foto ahụ gbasachara, ya bụ nwata nwaanyị nwètèrè ego ruru nde naịra iri abụọ na ise site n'aka ndị ọrụ obiebere na-amasị, ndị ọrụ gọọmenti na ndị ọzọ o metụrụ n'obi inye ya nkwàdo, iji mee ya ka ọ bụrụ onye kwụụrụ onwe ya ma kwụsị ahịa mbugharị ahụ ọ na-ebugharị. Ọ bụzị site na nke ahụ ka Chineke siri wee mee ya bụ nwatanwaanyị ezege, ma kpọpụ ya n'ụzọ ka ọ kwụsịzie ibugharị mmiri.

Ka ọ dị taa, ya bụ nwaagbọghọbịa na-ebugharịbụ mmiri n'Oshodi Lagos egoola ụlọelu na mpaghara Igando Lagos.

Ọ bụghị naanị nke ahụ; ya bụ nwata nwaanyị gbara ahọ iri abụọ na asaa malitèkwàrà ịrụ ụlọ ebe a na-emepụte ụdị mmiri ọñụñụ dị iche iche ugbua, bụkwazị nke ọ ga-arụchapụ n'oge adịghị anya, n'ihi na ọrụ na-achọzị ịkụrụ ọnụ n'ebe ahụ ugbua.

 

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484