Ihe Mberede Okporo Ụzọ Egbuola Otu Onye n'Anambra, Merụọ Ọtụtụ Ahụ

Sep 24, 2020 - 21:48
Jan 24, 2021 - 21:48
 0
Ihe Mberede Okporo Ụzọ Egbuola Otu Onye n'Anambra, Merụọ Ọtụtụ Ahụ

Si n'aka Izunna Okafor

Otu onye nọrọ na nsonso a wee zùte ọnwụ mberede ya n'Anambra, ebe mmadụ anọ ndị ọzọ nwètàkwàrà ihe mmerụahụ n'ụdị dị iche iche, dịka ihe mberede okporo ụzọ dapụtara na ncherịta ihu 'Jodon Shopping Mall' dị na Nkpor na mpaghara okporo ụzọ ahụ siri Ọnịtsha gaa Enugu.

Onye jigodi ọkwa dịka onye na-ahụ maka mmekọrịta oheneze na ụlọọrụ 'Federal Road Safety Corps (FRSC)' n'ime steeti Anambra, bụ Maazị Kamal Musa mèrè ka ụwa mara nke a site n'ozi ọ kụpụụrụ ndị nta akụkọ na nsonso a bànyere ihe mberede ahụ.

O mere ka a mara na ihe mberede okporo ụzọ ahụ metụtara mmadụ ise (ụmụnwoke anọ na otu nwaanyị) ma bụrụkwa nke dapụtara n'etiti nnukwu ụgbọala 911 M/Benz e ji ebu mmiri (bụ nke nwere akàrà XB 698 GDD) na Keke enweghị akàrà. Ọ sịkwa na ihe kpatara ihe mberede ahụ bụ ịgba oke ọsọ, na ụgbọala ịgbafè ibè ya site n'usoro ezighị ezi.

Maazị Kamal gakwara n'ihu kwuo na ụmụnwoke atọ na otu nwaanyị ahụ nwètàrà mmerụahụ n'ihe mberede ahụ, ebe otu nwoke nwụrụ. Ndị ọrụ FRSC bùùrù mmadụ anọ ahụ nwetara mmerụahụ ozigbo wee gaa ụlọọgwụ Boromi dị n'Ọnịtsha, ebe e burukwara ozu onye ahụ nwụrụ anwụ wee ga dọnye n'ụlọ nchekwa ozu, oge dọkịta lèchààrà ya ahụ wee gbaa akaebe na ọ nwụọla n'eziokwu.

Onyeisi ụlọọrụ FRSC na steeti Anambra, bụ CC Andrew A. Kumapayi dọrọ ndị na-anyà ụgbọala aka na ntị banyere ịgba oke ọsọ, n'ihi ihe ọjọọ dị iche iche nke ahụ na-ewèta. Ọ kasìri ndị be onye ahụ nwụrụ anwụ obi, kpee ka mkpụrụ obi ya zuo ike na ndokwa, ọbụnadị dịka ka Chineke nye ndị ndị ahụ nwetara mmerụahụ mgbakere n'oge adịghị anya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.