Ọba Akwụkwọ Anambra Emerùbela Ụbọchị Mgbochi Ịkwụ Ụdọ Na Mba Ụwa

Sep 24, 2020 - 21:26
Jan 24, 2021 - 21:27
 0
Ọba Akwụkwọ Anambra Emerùbela Ụbọchị Mgbochi Ịkwụ Ụdọ Na Mba Ụwa

Si n'aka Izunna Okafor

A kọwaala ịkwụ ụdọ maọbụ mmadụ igbu onwe ya dịka ihe mmadụ kpachapụrụ anya mee, nakwa ihe arụ jọgburu onwe ya, ma n'anya mmadụ ma n'anya Chineke.

Nke a bụ nke e kwupụtara site n'ọnụ Ụkọchukwu (Mọnsaịnọ) Jerome Madueke, nke Ụka Katọliiki na Dayọsiisi Ekwulọbịa, n'okwu ya na mmemme ụbọchị mgbochi ịkwụ ụdọ na mba ụwa, nke ahọ 2020, bụ nke a chịkọbàrà site n'aka ọba akwụkwọ steeti Anambra.

N'okwu ya na mmemme ahụ, wééré ọnọdụ n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra, Ụkọchukwu Madueke mere ka  a mara na dịka mpụtàrà e wepụtàrà site n'aka ụlọọrụ mba bụ 'World Health Organisation' siri kọwaa, mmadụ karịrị narị puku atọ na-akwụ ụdọ/na-egbu onwe ha kwà ahọ ọbụla na mba ụwa, ebe ọnụọgụgụ ndị na-anwà igbu onwe ha gafere ndè iri abụọ kwà ahọ ọbụla.

O kwuru na okpukperechi nà ndị ndu ụkà okpukperechi dị iche iche nwere nnukwu ọrụ dịịrị ha n'igbòchi ịkwụ ụdọ, ma nyezie onye ọbụla ndụmọdụ ka ọ gharadị ịnwa ànwà chèé echiche ịkwụ ụdọ maọbụ igbu onwe ya, ma ya fọdụzie ime ya eme, n'agbanyeghị etu ọnọdụ siri dịrị onye ahụ, n'ihi na o nweghị ihe ọbụla karịrị ndụ mmadụ.

N'akụkụ nke ya, onyeisi isinglaba ọmụmụ ihe 'Social Sciences' na mahadum Nnamdị Azikiwe dị n'Awka, bụ Ọkammụta Ugokwe Josephine Rita mèrè ka a mara na ọtụtụ ndị mmadụ kwụrụ ụdọ abụghị maka na ndụ ha kpọdoro isi n'ala maọbụ maka na ụbụrụ ha ezùchaghị òkè, n'ihi na e nwere ọtụtụ mmadụ nọkwa n'ụdị ọnọdụ ahụ, mana ha akwụbeghị ụdọ maọbụ gbuo onwe ha. Ọ sị na ọtụtụ mmadụ kwụrụ ụdọ maka na ha nwèrè echichè na mkpali ịkwụ ụdọ, ma hụta ịkwụ ụdọ dịka usoro kacha mma isi gbòó nsogbu nke ụwa.

Na mbụ n'okwu mmalite ya, onyeisi ọba akwụkwọ steeti Anambra, bụ Dọkịta Nkechi Udeze mèrè ka a mara na ụbọchị ahụ bụ ụbọchị òtù mba ụwa 'United Nations' wepụtàrà maka igbòchi ịkwụ ụdọ, ma kwuo na ọba akwụkwọ ahụ kpebírì isonyè na mmemme ahụ nke ahọ a, ma tinyekwazie ya na n'otu n'ime mmemme dị iche iche ha ga na-emerúbe kwà ahọ ọbụla, iji si ebe ahụ tụnye ụtụ nke ha n'igbòchi ịkwụ ụdọ.

Ọ kọwara isiokwu mmemme ahụ nke ahọ a — 'Ịrụkọ Ọrụ Ọnụ Iji Gbochie Ịkwụ Ụdọ' (nke pụtara 'Working Together to Prevent Suicide' n'asụsụ bekee) dịka isiokwu a kpachapụrụ anya wee họpụta, n'ihi na site na mmadụ inyerịtara ibè ya aka, mmadụ ịgbà ibe ya ume, na onye ọbụla ijikọ aka n'ọrụ mee ihe kwesiri ya, ịkwụ ụdọ ga-akwụsị maọbụkwa ọnụọgụgụ ya adatuo kpamkpam na mba ụwa.

Na ntụnye nke ya, onyeisi ụlọọrụ 'Digital Entrepreneurship Office' bụ Maazị Ifeanyị Aniagoh mèrè ka a mara na ya anaghị emetere onye kwụrụ ụdọ ebere. 

Ọ sị na ihe mere akụkọ ịkwụ ụdọ jizị abawanye ụba n'ụwa ugbua bụ maka na e nweela mgbanwè n'etu ndị mmadụ si ahụta ihe, nakwa ihe ndị mmadụ na-etinyekarịzị uchu na ya ugbua, ma kwuo na ịlaghachi azụ n'ezigbo ihe ahụ ndị mmadụ gbakụtazịrị azụ ugbua (nke gụnyere ezi akparamagwa, inwe afọ ojuju na ịkwụba aka ọtụ) bụ ótù ụzọ kacha dị mfe a pụrụ isi gbochie ịkwụ ụdọ, bụ nke na-arịzị ibè ya elu na mba ụwa taa.

N'okwu ya na mmemme ahụ, nnukwu onye enyemaka pụrụ ichè nye Gọvanọ Willie Obiano n'ihe gbasaara agụmakwụkwọ sekọndịrị, bụ Dọkịta Paul Ifeanyị kpọpụtasịrị ụfọdụ ihe ndị ọzọ dị iche iche mere ndị mmadụ ji akwụ ụdọ, ma kpọkuzie onye ọbụla ka o nwee afọ ojuju n'ihe o nwere, tụkwàsị obi na olileanya ha na Chineke, ma gbasie mbọ ike, karịa iji onye ọzọ na-atụnyere onwe ya maọbụ ịtụkwasị obi n'ihe nke ụwa, n'ihi na nke ahụ edubànyela ọtụtụ mmadụ n'igbu onwe ha.

A nọrọ na memme ahụ mee mkparịtaụka, gụọ abụ (bụ 'poems') ma mekwa ihe ngosi ejìjè (banyere ịkwụ ụdọ) site n'aka  ótù jikọtara ndị ntorobịa na-ede akwụkwọ, bụ 'Society of Young Nigerians Writers' (ngalaba nke steeti Anambra).

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.