Ndị Ekwụlọbịa Arịọ Enyemaka Gọọmenti, Dịka Mbize Ụmụachịana Chighatara Azụ

Oct 16, 2019 - 03:13
Jan 22, 2021 - 07:03
 0
Ndị Ekwụlọbịa Arịọ Enyemaka Gọọmenti, Dịka Mbize Ụmụachịana Chighatara Azụ

Izunna Okafor, Awka, Nigeria

Igbo sị na onye ọ na-eme omume omume na-ebe obube obube, ma sịkwa na ọnụ anaghn edere duu ma ihe ọ na-ata agwụghị.

N'ịgbaso nke a, ndị obodo Ekwulọbịa, dị n'okpuru ọchịchị Agụata na steeti Anambra akpọkuola gọọmenti steeti ahụ, nke Gọvanọ Willie Obianọ nọ n'isi ya ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka na mbize Ụmụachịana, bụ nke chighatakwara azụ wee malitekwa ịkpa ike, tinyere ihe ndị ọzọ na-ebi obodo ahụ aka ọjọọ.

Oku a bụ nke a kpọrọ site n'ọnụ onyeisi ọchịchị òbodo ahụ, bụ Maazị Emeka Madụabụchi n'okwu ọ gwara ndị nta akụkọ n'isi ụlọ ezumeezu 'Ekwulọbịa Peoples Assembly,' bụkwa nke o sitere na ya wee mee ka a mara na ya bụ mbize achụpụla ihe karịrị mmadụ narị abụọ n'ụlọ ha n'oge gara aga.

O kwuru na ihe ahụ gọọmenti rụnyéré ebe ahụ iji kpàá mbize ahụ eze n'oge gara aga emebisiela, nke mezịrị ka ya bụ mbize kawanye njọ ugbua ma bụrụziekwa ọnyà ọnwụ wee nyere ndị obodo ahụ na ndị agbatobi ha, tinyekwuoro na e nwèkwàrà ọtụtụ ebe ndị ọzọ dị iche iche mbize na-akpa ike n'obodo ahụ, dịka mpaghara Ụla and Eziagụlụ.

Ọ kpọpụtasịrị ihe dị iche iche ndị obodo ahụ mègoro n'onwe ha iji gbochie mbize ahụ ịgawanye n'ihu, ma sịkwa na ha edeela akwụkwọ banyere ya bụ mbize, bụ nke a ga-agụpụta n'ụlọ ọgbakọ omebe iwu steeti ahụ, site n'aka onye na-anọchite anya ha n'ebe ahụ, bụ Dọkịta Okey Okoye, ma kpọkuo gọọmenti ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka aka ọkụ aka ọkụ, iji wee gbochie ndị obodo ahụ ịbụ ndị gbara ọsọ n'obodo ha.

N'ihe gbasaara nsogbu ndị ọzọ na-adadìdo obodo ahụ, Maazị Madụabuchi kpọkùkwàrà gọọmenti ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka n'ịrụ okporo ụzọ ahụ gara ụlọ ahụike 'Ekwulobia General Hospital,' bụ nke o kwuru na ọ naghị ekwezị ọgịga ugbua, ọbụnadị dịka ọ rịọrọ Gọvanọ Obianọ ka o mezuo nkwà ahụ o kwèrè ha n'oge gara aga na ọ ga-ebuli ya bụ ụlọ ahụike ọhaneze ka ọ bụrụzie ụlọ ahụike pụrụ iche, bụ 'Specialist Hospital'

O kwuru na ọtụtụ ihe kọrọ ụkọ n'ụlọ ahụike ahụ, nke gụnyere enweghị ebe obibi ndị Dọkịta, ya na enweghị ndị na-ahụ maka anya na eze, ma chetara gọọmenti na o kwèrè nkwà o kwere ime ka ụlọ ahụike ahụ ka ọ nọrọ n'ezi elu, tinyesikwuo ọtụtụ akụrụngwa n'ọrụ, ma mekwa ka ọ bụrụ ụlọ ahụike ga-eso na nke atọ, ma e wezùga nke Awka na nke Ọnịtsha; ma rịọkwazie ka o mezuo nkwa ndị ahụ iji kwalite ya bụ ụlọ ahụike na otu ọrụ si aga na ha.

Ka ọ na-ekele gọọmenti steeti ahụ maka inye ọrụ okporo ụzọ ụlọ ahụike ahụ a kpọ n'ọnụ, ya na ụzọ 'Bishop Court,' Maazị Madụabụchi rịọzịrị ka a malite ọrụ ma rụchapụ ụzọ ndị ahụ, ọbụnadị dịka ọ rịọkwara gọọmenti ka e doziekwa ụzọ Ihuọkpala—Ụmụchi-Agba—Abọgwume, ma rụọkwa nke Abọgwume—Ụmụchiana na nke Agba Eziagụlụ—Ụla Amalụfọr iji belata 'a gbakata a kwụsị' na-adị n'ebe Mgba-Èrègèdè Ekwulọbịa, bụ Ekwulọbịa Roundabouts

N'ịga n'ihu n'ikèlè Gọvanọ Obianọ maka ịkpọlite ụfọdụ ụmụafọ obodo ahụ n'ọkwa ọrụ dị iche iche; Maazị Madụabụchi rịọkwàrà ya doo ka o chèta nwa afọ obodo ahụ oge ọbụla e nwèrè maka Kọmishọna n'ọchịchị ya, n'ihi na ndị obodo ahụ kwèsiri inwe Kọmishọna; ma rịọkwazie ka o tinye ọkụ okporo ụzọ n'ụfọdụ nnukwu okporo ụzọ dịgasị n'obodo ahụ bụ ebe ụzọ adịbèghị. O mekwara ka a mara na ọ dị ntị njọ na o nweghị ebe a na-aga mposi, ihe e ji ekpofù ahịhịa na ihe e ji asọnyụ ọkụ dị n'ahịa Eke Ọhụụ Ekwulọbịa ahụ a rụrụ nso-nso a, nke nwere ọnụ ụlọ ahịa karịrị otu puku na narị asaa; ma kpọkuo ya ka o nyere ha aka rụnyesie ihe ndị ahụ, n'ihi na ndị bi na gburugburu ebe ahụ nọzị n'ajọ ọnọdụ ibute ọrịa na ajọ ọnọdụ ahụ ike, maka ụkọ nke ihe ndị ahụ e ji akwalite ọnọdụ adịmọcha.

Banyere nsogbu ahụ na-adapụta n'obodo ahụ n'etiti eze ọdịnala obodo ahụ, bụ Igwe Emmanuel Onyeneka, na isi ọchịchị obodo ahụ, ya bụ onyeisi obodo rịọrọ Gọvanọ ka o tinye ọnụ n'okwu ahụ, site n'ịgwa ya bụ eze ọdịnala ka ọ gbahapụ iwu obodo ahụ nke ahọ 2010, bụ nke o kwùrù na ya bụ eze ọdịnala jiri aka ya wee megharịa ma fànyè ihe dị iri iteghete na abụọ n'ime ya, iji mee ya ka ọ ga-esi dịrị ya mma.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.