Korona: Ndị Anambra Bi Michigan, U.S.A. Ebunyela Gọọmenti Akụrụngwa Nchekwa Ahụike

Sep 24, 2020 - 21:50
Jan 24, 2021 - 21:51
 0
Korona: Ndị Anambra Bi Michigan, U.S.A. Ebunyela Gọọmenti Akụrụngwa Nchekwa Ahụike

Si n'aka Izunna Okafor

Òtù jikọtara ụmụafọ steeti Anambra bi na mpaghara Michigan nke mbà U.S.A ebunyela gọọmenti steeti Anambra akụrụngwa nchekwa ahụike nà ngwaọrụ dị iche iche dịka nkwàdo na enyemaka nke ha n'agha ahụ a na-ebu megide ọrịa nje korona n'ime steeti ahụ.

Akụrụngwa ha butere gụnyèrè ihe ndị ọrụ ahụike ji eyichi ahụ ma ha nọrọ n'ihu ọrụ , ma bụrụkwa nke a ga-ekesàra ụlọ ahụike dị iche iche dịgasị na steeti ahụ, ebe a na-elekọta ndị nwere ọrịa korona.

N'okwu ya n'obi gọọmenti dị n'Awka, bụ ebe a nọrọ wee nyefèé ihe ahụ n'aka gọọmenti, onyeisi ndị òtù ahụ, bụ Maazị Martin Egenti, nke ọ bụ onyeisi ụlọọrụ 'Anambra State Investment and Protection Agency (ANSIPPA)', bụ Dọkịta Ifediora Amobi nọchiri anya ya, kèlèrè ọchịchị steeti ahụ maka etu o si ebusò ọrịa korona agha n'ime steeti ahụ, ma na-agbasikwa mbọ ike imemìlà ya bụ ajọ ọrịa.

Ọ kọwara na akụrụngwa ahụ ha butèrè bụ iji tụnye ụtụ nke ha n'ịchụ ọrịa ahụ ọsọ, ma kwezie nkwà na òtù ahụ ga-aga n'ihu ịdị na-enye gọọmenti nkwàdo na mgbe na mgbe.

N'okwu ya oge ọ na-anabata akụrụngwa ahụ n'aha gọọmenti, odeakwụkwọ ọkpụtọrọkpụ na steeti ahụ, bụ Ọkammụta Solo Chukwulobelu kèlèrè ndị òtù ahụ n'ụzọ pụrụ ichè maka ezi onyinye ahụ na nkwàdo ahụ, ma jirikwa ohere ahụ kelee òtù, ụlọọrụ na ndị ọzọ dị iche iche tụnyegoro ụtụ ma nyekwa gọọmenti steeti ahụ nkwàdo n'ụzọ dị iche iche kemgbe ya na ọrịa ahụ jiri lụba. 

Ọ kpọkuzịrị ndị ọzọ bụ ndị aka ji akụ, nakwa ụmụafọ Anambra bi na mba ofesi dị iche iche ka ha ñomie ezi akparamagwa ahụ.

Ọkammụta Chukwulobelu jikwara òhèrè ahụ katọọ ma gbarụọ ihu banyere etu ụfọdụ ụlọụka na ndị ụka dị iche iche iche na steeti ahụ si enupuzị isi nyegara ntụziaka ahụ gọọmenti nyere dịka ụzọ isi gbanahị ibute maọbụ ikesà ọrịa korona. Ọ kpọkuzịrị ndị ndu òtù ụka dị iche iche na steeti ahụ ma dọọ ha aka na ntị bànyere nnupuisi ahụ, ọbụladị dịka ọ dụrụ ha ọdụ ka ha kpachapụ anya ịhụ na ndị òtù ha na-agbasò ma na-erube isi nye ntuziaka ahụ n'ozuzu oke, ọkachasị dịka o siri metụta ikpuchi imi na ọnụ ha nke ọma, nà ịkwọ aka ha.

Otu onye n'ime ndị soro wee nabata akụrụngwa ahụ ụbọchị ahụ, ma bụrkwa Kọmishọna na-ahụ maka ahụike na steeti ahụ, bụ Dọkịta Vincent Okpala kọwara onyinye ahụ dịka nke magburu onwe ya, kelee ndị òtù ahụ, ma mekwa ka a mara na ya bụ akụrụngwa ga-enye aka n'ụzọ pụrụ iche n'ichekwaba ndị ọrụ ahụike steeti ahụ, ọkachasị oge ha na-elekọta ndị nwere ọrịa korona.

Dịka ọ na-eme ka a mara na ọrịa korona ka na-agakwa n'ihu na-agbasa, o nyekwazịrị onye ọbụla ndụmọdụ ka ọ na-erube isi nye ntụziaka ahụ e nyere banyare ya bụ ọrịa n'ebe ọbụla ọ nọ na n'ihe ọbụla ọ na-eme.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.