Ihe Mberede Okporo Ụzọ Egbuola Otu Onye n'Agụlụ, Merụọ Ọtụtụ Ahụ

Aug 7, 2020 - 20:41
Jan 24, 2021 - 20:42
 0
Ihe Mberede Okporo Ụzọ Egbuola Otu Onye n'Agụlụ, Merụọ Ọtụtụ Ahụ

By Izunna Okafor

Ọ bụ nnọọ ajọ ihe ọdachi na ihe ịkwa arịrị, dịka ihe mberede dị oke egwu dapụtara n'okporo ụzọ dị n'akụkụ ụlọ nkwari akụ 'Golden Tulip Hotels' dị n'Agụlụ, ma taa isi otu onye, merụọkwa ndị ọzọ ahụ.

Maazị Paschal Anigbo, bụ onye na-ahụ maka mmekọrịta oheneze na ụlọọrụ 'Federal Road Safety Corps (FRSC)' na steeti Anambra bụ ya mèrè ka ụwa mara nke a site n'ozi ọ kụpụrụ na nsonso a bànyere ya.

O mere ka a mara na ihe mberede ahụ mere oge ụgbọala abụọ —'Toyota Highlander' (nwere akara FGG33KJ) na ụgbọala 'Hijet Daihatsu Pickup' (enweghị akara) kwokọrọ isi ọnụ wee kpọrikọọ onwe ha. Ọ kọwakwara na ọ bụ mkpokọta mmadụ ise (bụcha ụmụnwoke) nọ n'ime ụgbọala abụọ ahụ eme njem oge ahụ, ya bụ ohe mberede dapụtara.

Dịka o siri kwuo, ihe kpatara ihe mberede ahụ bụ mmadụ isi n'akụkụ ụzọ nke ya bàá n'akụkụ ọzọ; bụzị nke wetara ọnwụ otu onye n'ime ndị nọ n'ime ụgbọala ahụ, ma merụọ ndị ọzọ ahụ n'ụzọ dị iche iche.


Ndị ọrụ FRSC sitere ngalaba Nanka gazịkwara n'ebe ahụ oge ha nwetara ozi banyere ya bụ ihe, wee buru ndị ahụ ozigbo gaa n'ụlọ ọgwụ 'St. Joseph Hospital' dị n'Adazi Nnukwu maka ileru ha anya na ilekọta ha.

N'okwu ya banyere nke ahụ, onyeisi ụlọọrụ FRSC na steeti ahụ, bụ Maazị Andrew Kumapayi dọrọ ndị na-anya ụgbọala aka na ntị nke ukwu megide ịgba oke ọsọ, isi n'otu akụkụ ụzọ banye n'akụkụ ụzọ nke ọzọ n'usoro ezighị ezi, ya na ịnyà ụgbọala n'ụdị ọbụla adabaghị adaba, n'ihi na ọ bụ ihe dị etu ahụ na-eweta ihe mberede okporo ụzọ na ihe mmerụ ahụ maọbụ ọnwụ mberede na-esi na ya apụta.

O kpekwazịrị ka ndị nwetara mmerụahụ n'ihe mberede okporo ụzọ ahụ gbakere mgwamgwa, ma kasikwa ezinụlọ nwa amadi ahụ nwụrụ anwụ obi, kpee ka Chineke nabata ma nye mkpụrụ obi ya ezumike udo.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.