Ndị Uweojii Anambra Ejidela Nwokorobịa Kwasoro Ụmụnwoke Iko

Aug 7, 2020 - 20:51
Jan 24, 2021 - 20:51
 0
Ndị Uweojii Anambra Ejidela Nwokorobịa Kwasoro Ụmụnwoke Iko

By Izunna Okafor

N'ihi na a sị na ọ na-abụ chi na-efo, ihe ọjọọ ana-abawanye ụba, ndị uweojii steeti Anambra anwụchiela otu nwata nwoke maka ịkwaso obere ụmụaka nwoke iko n'ike.

Dịka ozi a kụpụrụ site n'aka onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uwe n'ime steeti ahụ, bụ Maazị Haruna Mohammed siri kọwaa, ya bụ nwa amadi, bụ Maazị Obimeze Maduabuchi, bụ onye obodo Nsugbe dị n'okpuru Anambra East, ma biri na mpaghara 'Ejeagwu Estate' dị n'Awka.

Akụkọ kọrọ na ya bụ nwokorobịa gbara ahọ iri abụọ na otu ma bụrụ onye e jidere oge ndị uwe ojii nwetachara ozi banyere etu o siri kwaso ụmụaka ụmụnwoke abụọ gbara ahọ ise na asaa n'otu n'otu iko.

Oge a gbara ya ajụjụ ọnụ, ya bụ nwokorobịa jiri ọnụ ya kweta n'ezie na ya mere ihe ahụ, ma kwaa arịrị na ọ bụ ndị enyi ya dubànyere ya n'ime ihe dị etu ahụ. 

Otu ọ dị, a kpọrọ ụmụaka abụọ ahụ gaa ụlọ ọgwụ ebe a nọrọ wee nyochaa ha ahụ, iji mara ka ọnọdụ ahụ ha siri gbata kwụrụ.

Ka ọ dị taa, onyeisi ndị uweojii na steeti ahụ, bụ CP John Abang enyela ntuziaka ka e nyefèé okwu ahụ n'aka ngalaba 'State Criminal Investigation Department(CID)' iji mee nnyocha miri èmì banyere nke ahụ, ebe a ga-akpụpụkwa nwa amadi ahụ ụlọ ikpe ma e mechaa ya bụ nnyocha, n'ihi ụmụaka abụọ ahụ ọ kpọrikọrọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.