Iri Ji Ọhụụ Enugwu-Ukwu Ahọ 2017

Sep 11, 2017 - 09:17
Jan 23, 2021 - 22:52
 0
Iri Ji Ọhụụ Enugwu-Ukwu Ahọ 2017

Izunna Okafor, Awka, Nigeria

Obodo jupụtara nnọọ gbịm n'ọnụ dịka a nọrọ n'izu ụka gara aga wee mee mmemme iri ji ọhụụ nke obodo Enugwu-Ukwu, dị n'okpuru ọchịchị Njikọka na steeti Anambra. Ya bụ mmemme omenahọ bụ nnọọ oge iji kele Chukwu Okike maka ọrụ ọma ya dị iche iche na ya bụ obodo, ọ kachasị otu o siri debe ha ndụ ogologo oge ahọ ọrụ niile wee rukwaa n'oge owuwe ihe ubi, nke gosiri nnọọ na onye rụọ n'anwụ o  rie na ndò.

Obodo jupụtara nnọọ gbịm n'ọnụ dịka a nọrọ n'izu ụka gara aga wee mee mmemme iri ji ọhụụ nke obodo Enugwu-Ukwu, dị n'okpuru ọchịchị Njikọka na steeti Anambra. Ya bụ mmemme omenahọ bụ nnọọ oge iji kele Chukwu Okike maka ọrụ ọma ya dị iche iche na ya bụ obodo, ọ kachasị otu o siri debe ha ndụ ogologo oge ahọ ọrụ niile wee rukwaa n'oge owuwe ihe ubi, nke gosiri nnọọ na onye rụọ n'anwụ o  rie na ndò.

Ka ọ na-ekwu okwu na a ya bụ mmemme, eze ọdịnala Enugwu-Ukwu bụ Igwe Maazị Ralph Ekpeh kelere ndị niile siri n'ebe dị iche iche wee bịa ya bụ mmemme maka na ọ bụ mmadụ ka e ji aka; ma sịkwazie na o nwere nnọọ ezi olile anya na owuwe ihe ubi nke ahọ na-abịa abịa ga-aka nke ahọ a.

Ọ sị na ya bụ irii ji ọhụụ ọha obodo riri ga-emezị ka  ndi echichi dị iche iche n'obodo ahụ malitezie iri ji ọhụụ, n'ihi na dịka ọ dị n'ọtụtụ obodo dị iche n'ala Igbo gbaa gburu gburu, iri ji ọhụụ n'obodo bụ ahụghị ebuli ma sị elina dike ma sorokwa n'ihe mbụ na mbụ a ga-emerịrị tupuu onye echichi ọbụla amalite isi ma ọ bụ iri ji ọhụụ n'ụlọ be ya.

Ndị obodo ahụ anọrọnarii n'ọnwa Julaị gara aga wee mee otu n'ime mmemme pụrụ iche e jiri mara ha, bụ "Ịkpọ Ji", nke bụ omenala ha ga-emechaa tupuu a malite ire ji n'ahịa obodo ahụ bụ Nkwọ Enugwu-Ukwu, ma bụrụkwa nke dọtara ọtụtụ ụmụafọ obodo ahụ sitere n'ebe dị iche iche n'ala Naịjiria nakwa mba ofesi.

Igwe Ralp kpekwazịrị ekpere maka udo na ọganihu nke obodo ahụ, steeti Anambta  nakwa ala Naịjiria n'izugbe.

Ọtụtụ ndị ukwu ndị ọzọ bịara mmemme ahụ gụnyere onye na-nọchite anya ọgbọ nta nkwado Anọcha, Dunukọfịa na Njikọka n'ụlọ ọgbakọ nnọchi anya etiti, bụ Dọkịnta Dozie Nwankwọ, onye isi na ọga kpata kpata nke ụlọ mgbasa ozi 'Anambra Broadcasting Service', Awka, bụ Nze Uche Nwọrah, onye isi otu pati APGA n'oge mbụ ma bụrụkwa onye isi otu ịchụ nta nkwado maka ịhọpụtagharị Gọvanọ Willie Obianọ nke ugboro abụọ, bụ Maazị Victor Umeh, na ọtụtụ ndị ọzọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.