Oriakụ Obianọ Ekesàárála Mmadụ 142 Ihe Nkwàdo n'Awka

Mar 14, 2022 - 22:13
 0
Oriakụ Obianọ Ekesàárála Mmadụ 142 Ihe Nkwàdo n'Awka

Izunna Okafor dere akụkọ a

.

Nwunye aka na-achị steeti Anambra, bụ Oriakụ Ebelechukwu Obiano nọrọ na nsonso a wee kesàárá mmadụ ruru iri atọ na anọ n'ọnụọgụgụ (bụ ndị mụrụ ọrụaka dị icheiche) ihe nkwàdo ma nyekwa ha ego iji bido ihe ha mụrụ.

Oriakụ Obianọ nọkwàra n'otu ụbọchị ahụ wee bunye mmadụ asatọ ndị ọzọ ihe nkwàdo, ego mmachiakpa, akpa osikapa, igbe noduul, na àkpà akwa, bụ ndị ara n'oge mbụ ma bụrụkwa ndị gwọtagoro ara ha n'ebe ha nọ anara ọgwụgwọ n'ogige ebe ahụ a na-elekọta ndị ara dị na Nteje, n'okpuruọchịchị ime obodo Oyi.

Ịkesà ihe nkwàdo ahụ bụ otu ụzọ ya bụ nwunye Gọvanọ siri merùbe mmemme ụbọchị ụmụnwaanyị na mba ụwa nke ahọ a bụ 2022, ma bụrụkwa nke weere ọnọdụ n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ. Ihe dị icheiche o kesààrà ndị ahụ mụrụ ọrụaka gụnyèrè ihe e ji akwa akwa, akụrụngwa e ji akwọ ihe, tinyere ụfọdụ ihe ndị ọzọ, dịka ọrụaka ha mụrụ siri dị, ya na ego o nyere ha iji malite ọrụ ha. 

N'okwu ya oge o enyechara ndị ahụ ihe onyinye ahụ, Oriakụ Obianọ kwupụtara afọojuju o nwere na ndị ahụ a gwọgoro ara ha, bụ ndị sitere mpaghara steeti dị icheiche n'ala Nigeria, ènwerela onwe ha kpamkpam ma dịkwa mma nke ọma ịlaghàchi obodo ha dị icheiche.

Ọ dụkwazịrị ha ọdụ ka ha jiri ego na ihe ndị ahụ o bunyesiri ha wee màlite ndụ ọhụrụ ma bàárá onwe ha uru; ọbụladị dịka ọ dụkwara ndị ọrụaka ahụ e bunyesiri akụrụngwa ọdụ ka ha gharakwa ire ihe ahụ, kama ka ha jiri ya bido ọrụ ahụ ha mụrụ, ka ha wee bụrụ ndị kwụụrụ onwe ha.

Banyere mmemme ụbọchị ụmụnwaanyị na mba ụwa, Oriakụ Obianọ kọwara na ụbọchị ahụ na-echetara gọọmenti etiti na steeti dị icheiche mkpa ọ dị ịkwalite na ibinye aka n'amụma iwu na-akwalite ikike dịịrị ụmụnwaanyị

Dịka ọ na-eme ka a mara na ọchịchị di ya bụ Gọvanọ Willie Obianọ nyere ọtụtụ ụmụnwaanyị ohere ọrụ na gọọmenti ya, ọ kpọrọ oku ka e nwee ezi nnọchianya nà mbawanye nke ọnụọgụgụ ụmụnwaanyị n'ọkwa dị elu, ọkachasị n'ọkwa na ọrụ gọọmenti na otu ndọrọndọrọ ọchịchị. Ọ kpọkwazịrị oku ka a kwụsị imegide maọbụ ịkpachapụ ụmụnnwaanyị n'akụkụ.

Na ntụnye nke ya, Kọmishọna na-ahụ maka ọdịmma na ihe metụtara ụmụnwaanyị na ụmụaka na steeti Anambra, bụ Oriakụ Ndidi Mezue nyèrè nkọwa banyere mpụtara ụbọchị ụmụnwaanyị na mba ụwa, kọwaa mkpa ọ dị ịkwalite ọnụọgụgụ nke ohere a na-enye ụmụnwaanyị n'ihe metụtara okwe ndọrọndọrọ ọchịchị. O kelekwazịrị Oriakụ Obianọ maka nkwàdo ahụ o nyere ndị ahụ ụbọchị ahụ, ya na ọmarịcha ọrụ obiebere ndị ọzọ ọ rụgoro, ọkachasị ndị ọ rụgoro site n'okpuru òtù ọrụ obiebere ya bụ ‘Caring Family Enhancement Initiative (CAFE), ọbụladị dịka ọ gwara ya ka o jide ka o ji.

Ụfọdụ ndị ọzọ kwuru okwu na mmemme ahụ gụnyere onye na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo ‘Nnewi North’ n'ụlọ omeiwu steeti Anambra, bụ Maazị Nonso Okafor; onyeisi nhazi atụmatụ ‘Rule of Law and Anti-corruption (RoLAC) na steeti Anambra’, bụ Oriakụ Josephine Onah, tinyere ụfọdụ ndị ọzọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484