FRSC Anambra Emerùbela Ụbọchị Nchekwa Okporoụzọ Na Mba Ụwa

May 18, 2021 - 18:46
May 30, 2021 - 17:41
 0
FRSC Anambra Emerùbela Ụbọchị Nchekwa Okporoụzọ Na Mba Ụwa

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka njem awele okporoụzọ, FRSC, ngalaba steeti Anambra, arịọla njikọaka ụmụafọ steeti ahụ, ndị e ji okwu ha agba ìzù, na ndị òtù dị iche iche, iji kwàlite arụmọrụ ha, njem awele na nchekwa okporoụzọ na steeti ahụ.

Onyeisi ọhụrụ nke ụlọọrụ FRSC na steeti Anambra, bụ CC Adeoye Irelewuyi kpọrọ òkù a na mmemme imerùbè izuụka nchekwa okporoụzọ na mba ụwa, nke ahọ 2021, bụ nke e merùbèrè emume mgbape ya n'isi ụlọọrụ ahụ dị n'Awka, bụ isi ụlọọrụ steeti ahụ.

Dịka o siri kọwaa oge ọ na-agbape mmemme ahụ, CC Irelewuyi mèrè ka a mara na mmemme ahụ bụ mmemme pụrụ iche e wepụtara iji kwàlitekwuo ọrụ maka inwe njem awele okporoụzọ, ibelata ihe mberede okporoụzọ, na ịhụ na e nwere ezi nchekwa okporoụzọ, ma kọwakwa na a na-eme ya bụ mmemme otu izuụka, ma bụrụkwa nke ha ga-anọ na ya wee megasịa ihe dị iche iche, dịka inye nkụzi, ime mgbasaozi banyere njem awele okporoụzọ, ime mkpọtụrụ, ikpe ekpere pụrụ iche, tinyere ihe ndị ọzọ ga-enye aka ịkwàlite nchekwa okporoụzọ nà ezi njikọaka ụlọọrụ ahụ na ọhaneze.

Dịka ọ na-ekwupụtanwò ezi njikere ụlọọrụ ya ịhụ na e nwere ezi nchekwa okporoụzọ na steeti Anambra, ya bụ onyeisi ụlọọrụ ahụ gara n'ihu mee ka a mara na isiokwu mmemme ahụ nke ahọ a bụ "Street for Life", (nke pụtara "Okporoụzọ maka Ndụ" ma a tụgharịa ya n'asụsụ Igbo); ọbụladị dịka o nyere ndị na-anyà ụgbọala ndụmọdụ ka ha kwụsị ịgba oke ọsọ ma na-agbaso usoro kilomita iri atọ maka otu awà (30k/hr), n'ihi na oke ịgba ọsọ so n'ihe kacha eweta ihe mberede okporoụzọ na steeti ahụ.

N'okwu nke ya n'ebe ahụ, Kọmishọna na-ahụ maka njem okporoụzọ na steeti ahụ, bụ Maazị Afam Mbanefo kèlèrè ụlọọrụ FRSC Anambra maka ezi ọrụ ha na mbọ dị iche iche ha na-agba iji belata ihe mberede okporoụzọ na steteti ahụ, ma kpọkuo ha ka ha jisie ike n'ọrụ; ọbụladị dịka ọ dụkwara ụlọọrụ ahụ ọdụ ka ha welitekwuo aka n'inye ọhaneze nkuzi na ịgbasara ha ozi banyere ịkwalite njem awele na iwu na-achị okporoụzọ. 

O kwuru na nke ahụ so n'otu ụzọ ga-aka wee nye aka ime ka ọhaneze mara ihe dị iche iche ha kwesiri ịma banyere iwu na-achị okporoụzọ na ihe a na-atụ anya n'aka ha ime maọbụ izere oge ọbụla ha nọ n'okporoụzọ, iji gbanahị, belata, maọbụ gbòchie ihe mberede okporoụzọ na ajọ ọdachi ndị ọzọ na-adapụta n'okporoụzọ.

Kọmishọna Mbanefo, onye kwupụtasịrị ụfọdụ ihe ụlọọrụ ya mepụtàgoro, tìnyèkwàzịrị olu nke ya wee kpọkuo ndị na-anya ụgbọala ka ha zèéré ịgba óké ọsọ ma na-agba kilomita iri atọ maka otu awà, n'ihi na ịgba oke ọsọ bụ ihe kacha eweta ihe mberede okporoụzọ.

Ọ dụkwara ha ọdụ ka ha na-eleru ụgbọala ha anya nke ọma oge niile tupu ha etinye ya n'okporoụzọ; ma dọkwazie ha aka na ntị megide ibu óké ibu, nke bụkwa otu ụzọ n'ime ihe ndị kacha eweta ihe mbere okporoụzọ.

Mmemme ahụ dọtàkwara ndị ọrụ gọọmentị, ndị ọrụ FRSC, na ụfọdụ ndị ọzọ dị iche iche e ji okwu ha agba izu na steeti ahụ, ọkachasị n'ihe metụtara njem okporoụzọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484