Ihe Mbigbo Mere n'Ụlọ Nkwariakụ Agagbuola Mmadụ Abụọ n'Ogun

May 18, 2021 - 19:54
May 30, 2021 - 18:05
 0
Ihe Mbigbo Mere n'Ụlọ Nkwariakụ Agagbuola Mmadụ Abụọ n'Ogun

Izunna Okafor dere akụkọ a

Oke ihe ọdachi dapụtara ụbọchị Tuzdee, dịka mmadụ abụọ nwụrụ ọnwụ mberede, n'ihi ihe mbigbo bigboro n'otu ụlọ nkwariakụ dị n'Abeokuta, bụ isi obodo steeti Ogun.

Ihe mbigbo ahụ bụ nke mere n'otu nnukwu ụlọ nkwariakụ na-ewu ewu na steeti ahụ a maara dịka 'Conference Hotel', bụkwa ụlọ nkwariakụ nke Gọvanọ chịbụrụ steeti ahụ n'oge mbụ, bụ Maazị Gbenga Daniel.

Dịka ndị ọnọmgbeomere siri kọwaa, mmadụ atọ nwètàkwàrà mmerụahụ ma bụrụkwa ndị nọ n'ụlọọgwụ anara ọgwụgwọ ugbua n'ihi ihe mbigbo ahụ, bụ nke a na-enyo ényò na ọ bụ mbigbo ikuku mmụọ (gas).

N'okwu ya banyere nke ahụ, onyeisi nhazi ụlọ nkwariakụ ahụ, bụ Maazị Tunde Osinubi mèrè ka a mara na ya bụ ihe mbigbo dapụtàrà n'ezie, ma kọwaa na ọ bụ ihe mbigbo sitere n'ikuku mmụọ, n'ihi ìtè silinda adịgboloja e jiri gbanye ikuku mmụọ, bụ nke onye na-arụrụ ha ọrụ n'ọnụụzọ mbata ụlọ nkwariakụ ahụ bùrù wee bịa ọrụ; ma bụrụkwa nke gbawara oge onye ahụ ji ya arụ ọrụ ahụ, bụ ọrụ ịgba ihe ọkụ.

O mere ka a mara na ya bụ ihe mbigbo gbàgburu nwa amadi ahụ ji ikuku mmụọ ahụ arụ ọrụ ozigbo ọ gbawara, gbagbukwa otu onye ọzọ a maghị onye ọ bụ, merụọkwa mmadụ atọ ndị ọzọ nọ nso ebe ahụ ahụ, ma kọwaa nke ahụ dịka óké ihe ọdachi dị mwute.

Dịka ọ na-akasi ndị ezinụlọ ndị ahụ nwụrụ n'ihe ọdachi ahụ obi, Maazị Osinubi kpèkwàzịrị ka mkpụrụobi ndị ahụ nwụrụ anwụ zuo ike na ndokwa, kpee ka ndị ahụ nwetara mmerụahụ gbakere oge adịghị anya.

Ọ kpọkwàzịrị ma dụọ ọhaneze ọdụ ka ha gharazie igo ihe adịgboloja, ọkachasị ihe ndị nwere ike itinye mmadụ n'ụdị ihe izè ndụ dị iche iche, maka na ọ naghị adịkwanụ mma mmadụ ịkpacha anya were  aka ya goro ọnwụ ya maọbụ gote ọnwụ mmadụ ibe ya

Ọ dị ncheta na ụdị ajọ ọdachi a bụ ihe mbigbo ikuku mmụọ dapụtara ugboro abụọ n'ime izuụka gara aga n'Abeokuta ahụ, wee gbagbuo mmadụ anọ ozigbo ozigbo n'otu ntabi anya.

Nke a mezịrị o jiri dị mkpa ka ndị ọrụ gọọmenti ihe gbasaara nke ahụ dị n'aka lebàrá ihe ahụ anya, dịka ụfọdụ ndị bịara n'ebe ahụ ihe mbigbo ahụ mere siri nye gọọmentị ndọmọdụ, maka na ọ naghị adị mma otu osisi ịdụ mmadụ n'anya ugboro abụọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484