Ndị Uweojii Anwụchiela Onye Ohi ATM Na-Egwù Ojoro na Delta

Nov 13, 2021 - 22:23
 0
Ndị Uweojii Anwụchiela Onye Ohi ATM Na-Egwù Ojoro na Delta


Izunna Okafor dere akụkọ a


Aka ndị uweojii na steeti Delta akpàrala otu nwoke gbara ajị n'izu ohi, bụ Maazị Ojo Amos maka izugasị ndị mmadụ ohi ATM n'obodo Ozoro, dị n'okpuruọchịchị ime obodo 'Isoko North' nke steeti ahụ.
 
Onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti ahụ, bụ DSP Bright Edafe bụ ya kwupụtara nke a n'ozi ọ kụpụụrụ ndị nta akụkọ ụbọchị Tuzdee, bụkwa nke o sikwara na ya wee mee ka a mara na nwoke ahụ gbàrà ahọ iri atọ na asatọ, bụrụ onye obodo Agbara-Otor dị n'okpuruọchịchị 'Ugheli North', ma bụrụkwa onye a mà àmá n'ịpụnàrà ndị mmadụ ATM ha.

Ọ kọwara na e jidere nwoke ahụ n'ebe a na-eme POS dị n'akụkụ otu ụlọakụ dị n'Ozoro site n'aka ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ime obodo Olotu), oge e nwetara ozi na ọ nọ ebe ahụ, n'ihi na o teela ndị ọrụ nchekwa jiri chọgharịba ya n'ihi akụkọ dị icheiche a kọgoro n'isi ya, nà mkpamkpa dị icheiche o megoro ụmụmmadụ n'ebe dị icheiche.

Edafe kwuru na ihe dị icheiche e nwetere n'aka nwoke ahụ gụnyere ATM ruru iri atọ na atọ (33) n'ọnụọgụgụ na ego ruru puku naịra iri ise (N50,000).
 
Oge a gbara ya ajụjụọnụ, nwoke ahụ jìkwara ọnụ ya wee kwuo na o zutere otu n'ime ATM ahụ n'aka otu nwoke, bụ Maazị Rufai Abdulahi n'otu ụlọakụ dị na Kwale ma larie ozigbo. Ọ sịkwazị na o mèchààrà si na ATM ahụ wèré ego ruru narị puku naịra abụọ na iri ise site n'akara ụlọakụ nwoke ahụ.

O kwukwara na ọ na-akwụchakaị n'akụkụ ebe ATM dị wee na-édè onye ọ ga-ezu ohi, ọkachasị onye o lechaara anya ọ dị ya ka a ga-asị na ọ gụghị akwụkwọ, ndị agadi, ụmụaka, maọbụ na onye ọbụla ọ hụrụ na ọ ga-eyinwu egwu. Ma mgbe ọ hụrụ onye dị etu ahụ, ọ ga-agakwu ya, mee ka a ga-asị na ọ bụ onye na-arụ n'ụlọakụ ahụ ma chọkwa inyere onye ahụ aka, ma sikwa n'ụzọ dị etu ahụ gbanwèé ATM onye ahụ ma were ya larie.

O kwuru na ọ na-enyòkwa anya nke ọma oge onye ahụ na-etinye akàrà ATM ya, ma buru ya n'isi ozigbo, ka ọ ga-abụ o mechaa gbanwèé ATM ahụ, o were ya gaa POS  maọbụ ATM ma wèkọchaa ego niile onye ahụ nwere na ya. O kwukwazịrị na o meela ihe ahụ ruo ihe karịrị ahọ anọ gara aga.

N'okwu ya banyere nke ahụ, onyeisi ndị uweojii na steeti Delta, bụ CP Ari Muhammed Ali gwar ọhaneze  ka ha na-ehi asaa n'anya ma na-akpachàpụ anya oge niile ha na-aga na ATM maọbụ POS, marakwa ụdị ndị ha na-akpọku ka ha nyere ha aka oge ọbụla ha nwere ihe mgbagwòjuanaya na ATM maọbụ POS, n'ihi na ndị mekaniiki ekweghịzị sị mara ndị bụ ndị ara na ndị isi dị mma.

O kwukwazịrị na a ka na-eme nnyocha banyere ya bụ nwoke na arụrụala ya, nke, mgbe e mechara ya, a kpụpụ ya ụlọikpe, ma jiri usoro iwu wee lee ya ọrụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484