Ndị Nri Ejirila Ọñụ Mee Emume Ọnwa Agwụ Ahọ 2021

Jul 9, 2021 - 18:05
Jul 9, 2021 - 19:04
 0
Ndị Nri Ejirila Ọñụ Mee Emume Ọnwa Agwụ Ahọ 2021

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọ kpọtụrụ akpọtụ ma zụọ azụọ n'obodo Nri dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Anaọcha nke steeti Anambra, dịka ya bụ nnukwu obodo merụbèrè emume Ọnwa Agwụ nke ahọ 2021.

Ya bụ óké mmemme dọtàrà ọtụtụ ndị dị iche iche ihe omenala na-amasị, ndị eze ọdịnala na ndị ọzọ sitere ebe dị iche iche wee bịa isonyere obodo ahụ bụ isi ala Igbo wee mee ya bụ mmemme. Emume Ọnwa Agwụ bụ mmemme dịbara gboo e jiri mara Agụkwu Nri, ma bụrụkwa nke a na-eme n'ahọ ọbụla, n'ọnwa Juunu maọbụ ọnwa Julaị kwà ahọ, dàbere na mgbe ọ dabàrà.

Ọ bụ mgbe a kụnyechara mkpụrụ n'ubi ka a na-eme ya bụ mmemme a na-eji mmanwụ dị iche iche were eme, iji kpee ekpere maka ihe a kọrọ n'ugbo, ka o wee mepụta ihe nke ọma, buchàpụ ma chụtèé ihe ọdachi maọbụ ihe ogbochi ọbụla aka, gọzie obodo ahụ ma nwekwa añụrị.

Kemgbe ọtụtụ ahọ gara aga, ọ bụ ndị Agụkwu Nri na ụlọọrụ na-emepụta mmanya n'ala Nigeria a kprọ 'Nigerian Breweries Plc', bụ ndị na-emepụta mmanya 'Life Beer' na ọtụtụ mmanya ndị ọzọ nà-ejikọ aka ọnụ were eme emume Ọnwa Agwụ, n'ihi ezi mmekọrịta dị n'etiti ha, ọkachasị n'ihe metụtara omenala. A nọkwazịrị na ya bụ mmemme ụbọchị ahụ wee nabata, guzobe ma chie mmanya 'Life Beer' echichi dịka mmanya bụ ọkaibe nà mmanya a na-añụkarị, ọkachasị na steeti Anambra nà ná mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ ala Nigeria, bụzị nke mere e jiri kpọọ ya 'Onyeze' na mmanya 'Ọganihu' na 'Mmanya Ọganiru'.

N'okwu ya na mmemme ahụ oge ọ na-echi ya bụ mmanya 'Life' echichi site n'ịganyè ya ákà na ikpubè ya okpu mmeemmee, onye bụ onyeisioche otu jikọtara ndị eze ọdịnala n'okpuru ọchịchị Anaọcha ma bụrụkwa eze ọdịnala obodo Neni, bụ Igwe Igwe Onwuamaeze Ezeani kọwara Ọnwa Agwụ dịka emume dịbara gboo na omenala magburu onwe ya. 

O kọwakwara mmanya 'Life Beer' dịka ọkachamma maka Ndị Igbo, ma kọwaa ndị na-emepute ya dịka ndị ghọtara nke ekwe na-akụ nà mkpà ọdị ịkwalite omenala, ọbụladị dịka ọ dụrụ ha ọdụ ka ha jisie ike n'ọrụ ma gharakwa ịdà mbà n'ezi ọrụ ha ịkwàdo omenala, ya na n'ezi ọrụ mmepe ndị ọzọ dị iche iche ụlọọrụ ahụ na-arụ n'obodo dị iche iche ha nọ a maara dịka 'Coperate Social Responsibility' (CSR).

Na ntụnye nke ya, onyeisi ọchịchị obodo 'Nri Progress Union', Maazị Kelvin Obiegbunam kèlèrè ụlọọrụ ahụ na-emepụta mmanya 'Life' maka ịhọrọ Nri dịka obodo ebe a ga-anọ wee mee ya bụ mmemme iguzobe na ichi mmanya ahụ echichi dịka ọkaibe.

O kwezịrị nkwà na ha na obodo ahụ na ụmụafọ ya ga-aga n'ihu ijikọ aka ọnụ, gwakwa ha na ọbịbịa ha bịara ebe ahụ agaghị abụ n'efu.

Na ntụnye nke ha n'otu n'otu, onyeisi nlekọta ụlọọrụ 'Nigerian Breweries Plc' na mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ ala Nigeria, bụ Austin Aka, na onye na-ahụ maka ihe metụtara ụlọọrụ ahụ nà njikọ aka ha na ọhaneze, bụ 'Corporate Affairs Manager', Joy Egolum mere ka a mara na ebumnobi o jiri bụrụ n'obodo Nri ka a nọrọ wee mee mmemme iguzobe na ichi mmanya ahụ echichi bụ maka na ọ bụ obodo ahụ bụ isi ala Igbo. Ọ kọwazịrị na ịnọ n'obodo ahụ wee mee ya bụ mmemme ga-eme ka Ndị Igbo niile mara na 'Life' bụ ézè mmanya bià (beer) niile, ọbụladị dịka o kèlèrè Ndị Nri na ndị Igbo maka ịnabata ha na isonye na mmemme ahụ.

Ụfọdụ ndị ọzọ sonyere na mmemme ahụ gụnyèrè onyeisi ụlọ mgbasaozi 'Anambra Broadcasting Service' bụ Dọkịta Uche Nworah; onye ji ọkwa 'Portfolio Manager' n'ụlọọrụ 'Mainstream Lager' bụ Maazị Kehinde Kadiri; onye ji ọkwa 'Senior Brand Manager Life Beer', bụ Oriakụ Aishat Anaekwe, onye ji ọkwa 'Brand  Manager' ụlọọrụ ahụ na mpaghara ahụ, bụ Chidi Egwu, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ selitere isi na ngalaba dị iche iche, ma n'obodo ahụ ma na mpụga ya.

E wezuga emume iguzobe na ichi mmanya 'Life' ahụ echichi kpọnkwem dịka ọkaibe site n'ikpunyè ya okpu mmeemmee na ịgbànyè ya ákà n'olu a nọkwara na mmemme ahụ rie ma ñụọ, tie mmọnwụ, gbaa egwu ọdịnala ma mekwa ọtụtụ ihe ngosi ndị ọzọ dị iche iche, nke mezịrị ka ya bụ mmemme zaa aha a kpọrọ ya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484